Ihe na-atụ ndị Gọvanọ ụjọ ikwupụta ego ole na-abata n’akpa steeti – Okonjo Iweala

Okonjo-Iweala, onyeisi WTO

Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala

Onyeisi otu azụmaahịa mbaụwa (World Trade Organisation) bụ Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola ihe mere ndị gọvanọ Naịjirịa anaghị ekwe ekwupụta ego na-abata n’akpa steeti.

Okonjo-Iweala kwuru nke a n’ihi onyonyo ịntanetị n’emume mkpuhe kọmitii Alex Otti họpụtara maka idu ya n’iyi ọrụ dịka Gọvanọ Abia, bụ nke e mere n’ụbọchị Fraịde 14 Eprel 2023 n’Aba.

Ọ sị na ihe mere ndị Gọvanọ ji ekpuchi ego na-abata n’akpa steeti ha kwa ọnwa bụ ka ndị ha na-achị ghara ịjụ ha ajụjụ etu ha si emefu ego steeti.

Kọmitii ga-edu ya n'iyi ọrụ

Ebe foto si, Alex Otti

Ngozi kwuru n’ihi nke a na mgbe ọ bụ minista akụnaụba n’ọchịchị Onyeisiala Olusegun Obasanjo, na ha kpebiri ịna-ewepụta ego ole steeti ọbụla na-enwete kwa ọnwa n’akwụkwọ mgbasaozi.

Ọ gara n’ihu dụọ Alex Otti ndụmọdụ ka o mee ka ọchịchị ya doo ewu na ọkụkọ anya ka ndị mmadụ nwee ike nwee ntụkwasịobi n’ebe ọchịchị ya nọ.

Ọ gwara Otti ka o leba anya n’ihe banyere ọkụ latrik ọkachasị n’Aba iji nyere ndị ọrụ aka, nke ọzọ bụ ka o mee ka ndị azụmaahịa na ndi achụntaego si mba ofesi bịa mepee ụlọọrụ ha n’Abia.

'Ego Gọomentị Abia ji ruru N190bn'

Onye a họpụtara dịka gọvanọ Abia Steeti

Ebe foto si, Alex Otii

Alex Otti mgbe ọ na-anabata ndị a kwuru na ọ maara ihe ndị cheere ya aka mgba n’ọchịchị Abia nke gụnyere ụgwọ e ji ndị ọrụ, ụgwọ e ji ndị lara ezumike nka, nakwa ego mbite gọọmentị Abia ji nke ruru ijeri otu narị naịra na iri itoolu (N190bn).

Otti kwere nkwa na ọ ga-eme ka ọchịchị ya doo ndị Abia anya tinyere na ndị kọmitii a ga-enye tọọrọ ya ezi ntọala bụ ebe ọ ga-agbakwasị ụkwụ rụọ ọrụ ya.

Onyeisioche kọmitii a bụ Victor Onyenkpa n’aha mmadụ niile so ha kelere Otti maka inye ha ohere ọrụ ma kwee nkwa na ha agaghị emechu ya na ndị Abia ihu.

Ndị ọzọ so na kọmitii a gụnyere; Ifueko Okauru, Arunma Oteh, Ndubuisi Ekekwe, Uche Orji, Victor Okoronkwo, Frank Nneji na Ide John Udeagbala dgz.

Ụfọdụ n'ime ndị kọmitii ahụ

Ebe foto si, Alex Otti

Ikpeazu ehiwela kọmitii ga-enyefe Otti ọchịchị

N’otu aka ahụ Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazu ahọpụtala kọmitii ga-ahụ na o nyefere Alex Otti ọchịchị n’aka n’ụbọchị 29 Mee, 2023.

N’ozi odeakwụkwọ gọomentị bụ Chris Ezem wepụtara, a ga-edu ndị a n’iyi ọrụ n’ụbọchị Wenezde 19 Eprelụ, 2023.

ụfọdị ndị a gụnyere odeakwụkwọ gọọmentị steeti, ọtụtụ ndị kọmishọna, onyeisi ndị ọrụ bekee nakwa ndị ọzọ.

Cheta na Alex Otti nke Labour Party (LP) meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere n’ụbọchị 18 Maachị, 2023 iji nọchie anya Ikpeazụ nke Peoples Democratic Party (PDP) bụ onye chịrịla afọ asatọ.