Paul Onwuanibe: Ọ bụ eziokwu na Gọọmentị Legọs ga-akụpkpọ Landmark Beach Resort?

Ebe foto si, Landmark Africa
Dịka kepukepu na-efegharị na gọọmenti Legọs Steeti chọrọ ikutu ụlọọrụ ogige ezumike 'Landmark Beach Resort, Oniru, nchọpụta BBC Igbo mere na-egosi na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.
Paul Onwuanibe, onye nwe ụlọọrụ 'Landmark Group', bụ ndị nwe 'Landmark Beach Resort' gwara BBC n'ekwentị n'akụkọ ahụ bụ eziokwu.
O kwuru na o nweghi ihe ya na gọọmentị kpara tupu e wetara ya akwụkwọ na a ga- akụtu ụlọọrụ ahụ.
Ọ gara n'ihu boo ebubo na ebe ụlọọrụ ya dị adịghịbu n'akwụkwọ atụmatụ ọrụ "Calabar Coastal Highway Project' mbụ.
Akwụkwọ ozi nke e chere si n'aka Gọọmentị Legọs steeti e zigaara ụlọọrụ 'Landmark Beach Resort' n'abalị 18 nke ọnwa Maachị nke fegharịrị na soshal midia kwuru na mwepụ Landmark bụ 'iji nye ohere maka atụmatụ ịrụ okporoụzọ 'Lagos-Calabar Coastal Higway'" .

Ebe foto si, Paul Onwuanibe/X
Ọ bụrụ na Gọọmentị gaa n'ihu kụkpọọ ụlọọrụ ahụ, ọ ga-emetụta ihe karịrị ụlọọrụ 80 nwere ọdọ ha n'ụlọọrụ 'Landmark Africa' bụ ndị e jiri ewumewu ụlọ maara.
A na-eche na ọnụahịa ụlọ 'Landmark dị na-agbata nde dọla 200 maọbụ 250, na-agụnyeghị, ọnụahịa ụlọọrụ ndị dịcha n'okpuru ya nke ndị ọzọ nwe.

Ebe foto si, Lagos State Government
Mbọ BBC gbara ịnụta olu Gọọmentị Legọs amịtaghị mkpụrụ rue oge anyị wepụtara akụkọ a.
Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọrọ Kọmishona Mgbasaozi steeti ahụ bụ Gbenga Omotosho n'ekwentị, ọ zaghị ekwentị ya.
Ọsịsa o nyere ozi e zigara ya n'ekwenti(sms) dịka ọ zaghị ekwentị ya bụ: " Ewela iwe, anọghị m ebe m ga-asali gị okwu ugbua."











