"Etu ịwa ahụ ka m tokwuo ogologo si butere m nnukwu nsogbu agaghị ije"

Ebe foto si, Elaine Foo/Supplied
- Onye dere ya, Tom Brada
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7
Warning: Akụkọ nwere nkọwa ahụike nwereike ịwụ ndị na-agụ ya akpata oyi n'ahụ
Elaine Foo nwechara ọtụtụ apa dị n'ụkwụ ya- nke otu n'ime ha na-echetere ya etu ahụ ọ wara ka ọ gbatịa ụkwụ ya si bụrụ nsogbu nye ya.
Kamgbe 2016, nwada a dị afọ 49 awaala ụkwụ ya ugboro ise ebe a gbakwụnyere ọkpụkụ n'ụkwụ ugboro atọ - nke furula ya ọtụtu ego na okwu n'ụlọikpe megide dọkịta na-awa ahụ bụ nke e meziri n'ọnwa Julaị na-enweghi onye ikpe maara.
E nwere mgbe e ji mbọ igwe tinye n'ọkpụkpụ ụkwụ ya, nke ọzọ o kwuru na ọ dịka "e si na-ahụ ime ụkwụ ya n'ọkụ"
"Njem m dịka nke onye a na-ahụ n'ọkụ - mana a gbakere m," ka o kwuru.
Dọkịta ya gọrọ na ihe ndị a esighi ya n'aka kama na ọ bụ nsogbu ndị si n'ọnọdụ nke a dọrọ ya aka na ntị banyere ha, ebe ndị ọzọ sitere n'akparamagwa ya.

Ebe foto si, Elaine Foo/Supplied
Elaine kpọrọ etu ọ ha n'ogogolo asị
"Mgbe m adị afọ 12, etukarịrị m ọtụtụ ụmụaka ụmụnwaanyị n'ogologo", ka o kwuru. "N'afọ 14, abịaziri m dị mkpụ mkpụ karịa ndị ọzo n'otu ntabi anya. Dịka oge na-aga ọ bịara bụrụzie ihe mmasị. Ịka n'ogologo ka mma. Ịka n'ogologo bụ ịka maa mma. Ọdị m ka ndị ka ogologo kachasị nwee ohere."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mgbe o toro, nke a bịara bụrụzie ihe oke ọchịchị.
Elaine kwenyere na o nwere ọnọdụ a kpọro 'body dysmorphia', - ọnọdụ mmadụ na-ahụta na e nwere ihe na-adịghị mma n'ụdịdị ya na-agbanyeghi etu ndị ọzọ si ahụta ya. Ọnọdụ a na-ebute nnukwu ihe mgbawa obi.
N'afọ 25, Elaine hụrụ otu akwụkwọ mgbasaozi banyere otu ụlọahụike nke China bụ ebe ndị mmadụ na-awa ahụ ha iji gbatịkwuo ụkwụ na ọkpụkpụ ha. Akwụkwọ ahụ kọwara na usoro e ji awa ụkwụ siri ike ma nwee nje ndị na-eso na ya. Ọ dịka nrọ ọjọọ mana ọ tụrụ Elaine n'anya.
"Ama m na ndị mmadụ ga-ajụ uru ọ baara mana dịka ị na-agabiga ọnọdụ 'body dysmorphia', e nweghi nkọwa nwereike igosi ihe mere iji achụsi ihe ahụ ike."
Dịka afọ isii gachara, Elaine chọpụtara otu ụlọọgwụ na-awa ụkwụ na Lọndọn. Onye na-awa ụkwụ ahụ bụ dọkịta Jean-Marc Guichet, bụ ọkamara n'ịgbatịkwu ụkwụ - onye rụpụtara igwe e ji agbatị ụkwụ a kpọrọ 'Guichet Nai'.
“Nke ahụ bụ oge iti hallelujah, maka na m nweike imenwu ya na Lọndọn ma gbakee ọfụma n'ụlọ," kao kwuru.
“Dkt. Guichet gwara m ụfọdụ nsogbu ndị nwereike ịdapụta n'ịwa ụkwụ a. Mmerụ ahụ akwara, mkpụkọta ọbara, nsogbu ọkpụkpụ anyakọtaghị ọnụ ọzọ.
“Mana emere m nyocha, ọ bụ n'aka dọkịta na-ana oke ọnụahịa ka m na-aga, atụrụ m anya na m ga-enwete ezi nlekọta ahụike. Ebumnobi m bụ ka m si n'ogologo dị 5ft 2in (1.57m) ruo 5ft 5in (1.65m).”
N'ụbọchị 25 Julaị, n'ọnụ ego dị £50,000, ọ banyere n'usoro ịwa ụkwụ bụ nke ga-agbanwe ndụ ya.
Usoro mgbatị ụkwụ bụ nke a na-amachaghị anya ọfụma ya mana ụfọdụ ụlọọgwụ mmadụ nwee na-eme ya. Ọ na-efu ego dịka £15,000 ruo £150,000 site n'ebe ị chọrọ ime ya.

Ebe foto si, Elaine Foo/Supplied
“Obi dị m ụtọ iteta n'ụra, maka na ọ dị ka onweghi ihe ọbụla mere. Ọ fụghị ụfụ. Mana dịka nkeji 90 gachara, ọ malitere. Ọdị m ka e nwere onye na-esi ụkwụ m n'ọkụ. Ka e si n'ime na-ahụ ụkwụ m ọkụ. N'abalị mbụ ahụ, etigidere m mkpu ruo elekere isii nke ụtụtụ, ruo mgbe m hiri ụra.”
Enwere ụfọdụ ihe ụfụ na-eso usoro a. N'oge ịwa ụkwụ ahụ, a na-agbaji ọkpụkpụ ụkwụ ugboro abụọ ma tinye igwe n'ime ya.
A na-eji nwaayọọ gbatịa ogologo igwe ahụ iji kewaa ọkpụkpụ ụkwụ ahụ ụzọ abụọ. Usoro a kwesịrị ịgbatịkwu ogologo onye ahụ. Ọkpụkpụ ndị ahụ a gbajiri ga-eji nwaayọọ tochie ma nyakọta ọnụ iji mechie ohere dị n'etiti ha.
Ịwa ahụ a siri ike, ma bụrụ mmalite usoro tere anya.
“Usoro mgbatị ụkwụ ahụ na-ewe ogere ruru ọnwa abụọ maọbụ atọ ma tinyere ụzọ abụọ oge ahụ iji gbakee ọfụma ma malite ịga ije," Ọkammụta Hamish Simpson bụbu onye otu 'British Orthopaedic Association' kwuru. “Ọ na-ewe oge ruru otu afọ na ndụ ọtụtụ ndị mmadụ.”
Ngwa ngwa a wachara ahụ, usoro mgbatị ụkwụ Elaine malitere. Ọtụtụ oge n'ụbọchị o mere ihe ndị na-enye nsogbu n'ahụ, ịrọgharị ụkwụ ya iji kwalite igwe dị n'ụkwụ ya ka ọ rụọ ọrụ. Nke a bụ ihe na-eme ka mpọ ahụ na-eto nke ga-eme ka ụkwụ ya gbatịa n'ogologo. Mana ka izuụka abụọ gachara, o kwuru na njinji jiri.
"Amalitere m na-ahụta oke ihe ụfụ n'ụkwụ m. E ruru otu abalị dịka m na-emegharị ụkwụ n'elu akwa, anụrụ m ihe dara ka ọ na-apịaji apịaji, nke malitere ịfụ m ụfụ nke ukwuu."

Ebe foto si, Elaine Foo/Supplied
Elaine gara nyocha bụt nke gosiri na ihe ọ na-atụ egwu emeela. Igwe dị n'ụkwụ ekpe ya agbajiela banye n'ọkpụkpụ ukwu ya (femur) - bụ ọkpụkpụ kachasị sie ike n'ahụ mmadụ. Nke a gbawara ya obi mana o kwuru na Dkt. Guichet mere ka obi sie ya ike.
“Ọ gwara m na ihe m ga-eme ugbua bụ ka m ghara ichekasị onwe m. Chere ka ọ laa, ngwa ngwa ọ lara anyị ga-amalite usoro ahụ ọzọ."
Ha ga-aga n'ihu ịgbatị ụkwụ nri Elaine, dịka a na-akwado ịwa ụkwụ ya ụkwụ ekpe ya bụ nke a ga-aga agbatị ka ya na nke nri hata n'ogologo.
Elaine sị na a gwara ya na usoro ịwa ahụ nke ọzọ ga-efu ya ọtụtụ puku paụnd, mana obi dị ya mma ịkwụ ya ma ọ bụru na ọ ga-eme ka usoro ịwa ụkwụ ahụ ruo na njedebe.
N'ọnwa Sepụtemba, ụkwụ nri kwesịrị iru ogogo 7cm a chọro. Mana ihe adịchaghị mma. Ndịiche dị n'ogologo ụkwụ nri na nke ekpe ya nọ na-ebutere ya nnukwu nsogbu, na-eme ka ọkpụkpụ azụ ya na-arọji ma na-afụ ya nnukwu ụfụ.

Ebe foto si, Elaine Foo/Supplied
Ka izuụka isii gachara, nyocha ụkwụ nri ya gosiri na ọkpụkpụ ya anaghị eto ọfụma. 'Femur' ya dịzi ka ibere ọkpụkpụ abụọ igwe jikọrọ ọnụ.
Elaine kpokuuru Dkt. Guichet maka enyemaka, o hiwere ụbọchị ọzọ maka ịwagharị ụkwụ ya n'otu ụlọọgwụ ọ na-arụ ọrụ dị na Milan. N'ọnwa Eprelụ afọ 2017, ha malitere usoro ịgbatị ụkwụ ahụ ọzọ dịka a na-agbanye ụmị ọkpụkpụ (bone marrow) n'ime ụkwụ nri ya - iji kwalite otuto ọkpụkpụ ya. Ka e mechara ya, Elaine tetara n'ime akụkọ ọjọọ ọzọ.
“Dkt. Guichet gwara na igwe ahụ gbajiri dịka ọ na-ewepụta ya," ka o kwuru. "O weere igwe si n'ụkwụ onye ọzọ bụ nke o tinyere." Ọ gbakwụnyere na nke a ga-efu ego ọzọ.
Ka ụbọchị atọ gachara, Elaine anaghị aga ije ọfụma mana ọ chọro ịlọghachị n'ụlọ, ọ lọghachịrị na Lọndọn. O kwuru mmekọrịta ya na Dkt. Guichet adịla njọ ma sị na mmekọrịta dọkịta na onye ọ na-agwọ ga-akawanye njọ.

Ebe foto si, Elaine Foo/Supplied
Ọ maghị ebe ọzọ ọ ga-aga, n'ọnwa Julaị 2017 o jisiri ike hụụ onye ọkachamara n'ọkpụkpụ n'ụlọọgwụ NHS.
O kwuru na ọkachamara ahụ gwara ya na "njem a agaghị adị mfe."
"Akwadoro m onwe m maka ọgwụgwọ ga-ewe ihe ruru afọ ise tupu m mgbakee ọfụma," ka o kwuru.
Ka afọ asatọ ọ wara ahụ nke mbụ gachara, Elaine kwuru na ọ ka na-agbake site n'apa mmerụ ahụ uche nakwa anụahụ ya. Ọ na-enwe ụfọdụ nsogbu ịga ije ma kwuo na ọ na-enwe nsogbu metụtara echiche a kpọrọ 'PTSD'.
“Site na 2017 ruo 2020 ezopụrụ m onwe n'ụwa. Enweghi m di, enweghi m ọrụ, enweghi m ego, enwere m nkwarụ."
Mana nso nso a, ọ malitere ịgbake. A pịachiri okwu nọ n'ụlọikpe afọ anọ n'ọnwa Julaị, mgbe Dkt. Guichet kwetere ịkwụ Elaine “ọkpụrụkpụ” ego iji tie ya aka n'obi maka ebubo ndị o boro ya - na-ekweteghi na o mere ihe ọjọọ.
Ọkaiwu dọkịta Guichet gọro na o nweghi nleghara anya ọbụla o mere, gwaa ụlọikpe na: “N'okwu Dkt Guichet bụ na onweghi nleghara anya ọbụla, mgbaji ụkwụ nakwa oge o gburu tupu ọkpụkpụ eto esighi na nleghara anya kama na ọ bụ ihe ndaba, na ọ bụ nwada Foo mere ka ọkpụkpụ ụkwụ nri ahụ ghara itochi ọfụma site n'ụfọdụ ihe ndị ọ na-eme nakwa mgbatị ọ gbatịrị igwe ahụ karịa ogogo ha kwekọrịtara."
O kwukwara n'ụlọikpe na "ọtụtụ oge" na Nwada Foo jụrụ iso ntuziaka Guichet ma gbahapụ usoro mgbake n'ọrịa e nyere ya.
Elaine katọrọ ebubo niile ndị a. O kwuru na ụfọdụ ihe ndị o tere dịka 'anti-depressant' enweghi ihe jikọrọ ya na etu ihe si mebie ma sị na ọ bụ dọkịta kpatara ihe mere ya.
Elaine bu n'obi na o nwere nchekwa maka na ọ kwụrụ nnukwu ego. Mana ọ kwụọla ihe karịrị naanị ụgwọ ego.
“Atụfuru m ọtụtụ afọ kachasị mma na ndụ m. Amaara m na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ka m taa onwe m ụta, ọ bụrụ na mmadụ jụọ m, ị m ga-eme ịwa ahụ a ma ọ bụrụ na ị maara na ihe dị etu a ga-adapụta? Aga m asị 'Mba, i meela nke ukwu'."









