Gọọmenti na-ekwubi na ihe mere na Nimbo agaghị eme ọzọ ebe ọbụla n'Enugwu steeti

Ebe foto si, ENUGU STATE GOVERNMENT
Komishona mgbasaozi n'Enugwu steeti bụ Aka Eze Aka agwala BBC Igbo na mkparịtauka na gọọmentị steeti ahụ kwụ chịm n'ebe ihe gbasara nchekwa nọ.
Eze-Aka kwuru na mwakpo mere na Nimbo dị n'Uzo-Uwani bụ ihe mmebọ dịịrị Gọvanọ steeti ahụ bụ Peter Mbah nke mere ka o foro ntutu taa na ọ gaghị eme ọzọ.
Nke a mere dịka ụfọdụ ndị steeti ahụ na-eti mkpu enyemaka gbasara ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ dịka ha na-ekwu na ndị echeere bụ ndị ọchịehi na-awakpo ụfọdụ obodo ma na-atọrọ ụfọdụ ndị ọzọ.
Ọ kachasị nso nso a ebe otu nwoke na-eti mkpu n'ime ihe onyonyo na-arịọ enyemaka maka mwakpo ọ gabigara n'aka ndị echeere bụ ndị ọchịehi ọ sị na ha gbara ya gburugburu na-ebekasị ya mma.
Nwoke ahụ kwukwara na ọ lụrụ ọgụ ndụ ya ma si n'aka ndị ahụ gbapụta.
O nwebeghi ihe ndị uweojii kwuru maka nwoke ahụ nọ n'ime onyonyo.
"Enugwu steeti bụ ebe udo na-achị mana n'agbanyeghị nke a, nyocha amalitela banyere ndị mere ihe a" ka Aka-Eze kwuru.
Mgbe a jụrụ ya gbasara Kọmitii ehibere banyere ime nyocha ọ si na ọ bụ okwu nchekwa nke mere na idebe ya nzuzo dị mkpa.
"Ọ bụghị mụ ka ọ dịịrị ikwuputa ihe gọọmenti na-eme mana mara na ndị ọrụ nchekwa niile so n'izu agbara maka nchekwa
Ndị obodo ahụ makwa ihe na-aga mana agaghị m akpọputa aha ndị ahụ ugbua" ka ọ gwara anyị.
Banyere ihe mere n'Eke Egede ebe ndị uweojii zọpụtara nwaanyị di ime ọmụmụ n'aka ndị ọchịehi, Aka-Eze kwuru na gọọmentị amalitela ịrụzi ụzọ ndị dị njọ na-enyere ndị ntọ aka ịtọrọ ndị mmadụ.
"O nwere ihe ndị anyị ji nwayọ e me nke gụnyere ịrụ ụzọ, ụzọ niile dị n'Enugwu bụ nke a ga-arụ n'ime afọ anọ na asatọ na-abịa" ka o kwuru.
Lee Ebe niile e nwerela nsogbu nchekwa n'Enugwu na nso nso a

Ebe foto si, Supplied
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nimbo/Uzo-Uwani: Ndị echeere bụ ndị ochịehi wakporo obodo Nimbo ma gbuo mmadụ atọ nakwa otu nwatakịrị n'ebe a nae-eme mmemme akwamozu na mgbede ụbọchị Sunde gara aga n'Enugwu steeti. Cheta na ụdịrị ihe emebuola n'afọ 2016 ebe ihe karịrị mmadụ iri nwụrụ na mwakpo nke afọ ahụ.
Ezeagu: Ihe onyonyo e kesara na soshal midịa ụbọchị Wenezde Mee 1 afọ 2024 gosiri otu nwoke ọbara juru ihu ya na-akọwa ka ndị na achị ehi si wakpo ya nwere mma gbukasia ya ahụ na obodo Olo nke dị na Ezeagu, Enugwu steeti.
Ọ kpọrọ oku ka ndị ọchịchị gbata oso enyemaka. Ka ọ dị ugbu a, enwebeghi ihe ndị uweojii kwuru banyere ya.
Ụzọ Eke-Egede: Eprel 22 afọ 2024, otu nwaanyị ndị ntoo jidere ya na ụmụ aka ya abụọ mụrụ nwa n'ọdọ ndị ahụ tọrọ ya na Egede, okpuru ọchịchị Ụdị dị n'Enugwu steeti.
Di nwaanyị ahụ kwuru ụgwọ mgbapụta ruru nde 1.6 ị ji gbapụta nwunye ya na ụmụ ya a.
Ụzọ Mvene/Ụdị: Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị ana amaghị egbuola ọtụtụ ndị mmadụ na Mvene dị n'ụzọ si Akegbe-Ugwu gawa Udi.
Ndị bi na mpaghara ahụ mere ka anyị mara na ndị ahụ a na amaghị na-esi n'ime ohia pụta wee tọrọ ma gbuo ndị na-eme njem.









