Ihe i kwesịrị ịma maka Ifeanyi Okowa dịka Atiku họọrọ ya ka ọ bụrụ osote ya

Ebe foto si, Ifeanyi Okowa/Twitter
Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Peoples Democratic Party' ahọrọla Gọvanọ Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa dịka osote ya.
Nke a mere n'ụbọchị Wenezde a, abalị iri na isii nke ọnwa Jun 2022, dịka ndị isi PDP nyochachara Okowa maka ya bụ ọkwa.
Onye bụ Ifeanyi Okowa?
Ifeanyi Arthur Okowa bụ Gọvanọ nke atọ Delta steeti na-enwe kamgbe Naịjirịa laghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999.
Tupu ọ bụrụ Gọvanọ, ọ rụọla ọrụ na ngalaba gọọọmentị dị icheiche malite n'afọ 1991 ruo ugbua.
- A mụrụ ya n'afọ 1959 - ọ dị afọ 62 ugbua
- Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Edo College dị na Benin
- O nwetara ọzụzụ dịka dibia bekee na Mahadum Ibadan n'afọ 1981
- Okowa rụrụ ọrụ dịka ode akwụkwọ nke okpuru ọchịchị Ika
- O mechara bụrụ onyeisioche okpuru ọchịchị Ika North-East malite na 1991 ruo 1993.
- Ọ banyere otu PDP n'afọ 1998, ma soro na ndị ịchụ nta vootu oge James Ibori zọrọ ma merie ọkwa gọvanọ Delta steeti na 1999
- Okowa rụrụ ọrụ dịka Kọmishọna ọrụ ugbo, Kọmishọna mmiri, nakwa Kọmishọna ahụike, malite na 1999 ruo 2006.
- Na Jun 2007, e nyere Okowa ọrụ dịka odeakwụkwọ Delta Steeti
- Na 2011, Okowa meriri ntuliaka dịka Sinetọ ga-anọchite anya mpaghara Delta North
- O meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ na 2015, merikwa ntuliaka nke ugboro abụọ ya na 2019.

Ebe foto si, Atiku Abubakar
N'ọgbakọ ndị PDP nwere n'Abuja n'ụbọchị Tọzde, Okowa sị na ya ji obi ya niile nabata nhọpụta Atiku họpụtara ya.
"Ana m ekwe nkwa na aga m agba mbọ ma kwụdosie ike n'agha a chere anyị n'ihu, nke bụ ịzọpụta obodo anyị Naịjirịa ka ọ ghara ịdakpọ."
Cheta na asịrị na-efegharibu na ọ bụ Gọvanọ Rivers Steeti bụ Nyesom Wike ka Atiku ga-ahọrọ, mana ugbua, o doola onye ọbụla anya na akụkọ ahụ bụ ụgha.
Atiku kwuputara na ọ bụ Okowa ka ọ họọrọ site n'akara Twitter ya n'ehihie Tọzde.
N'okwu ya n'ọgbakọ ndị PDP nwere n'Abuja na Tọzde, Atiku kọwara Okowa dịka "onye ihe na-anụ ọkụ n'obi, onye na-enweta mmeri oge niile, onye nwere mmasị maka ezi ọchịchị, nakwa onye ihe gbasara ndị mmaọ̄ụ na-emetụta n'obi".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Chetakwa na oge Atiku zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, ọ bụ Peter Obi ka ọ họọrọ dịka osote ya.
Mana ka ọ dị ugbua, Peter Obi na-azọkwa ọkwa Onyeisiala n'otu Labour Party.
Peter Obi nọbụ na PDP mana ọ pụrụ banye 'Labour Party' dịka o kwuru na ọ bụ nrụrụaka a na-eme na PDP ka o ji pụọ.










