Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na nrụrịtaụka Joe Biden na Donald Trump

Joe Biden na Donald Trump

Na nrụrịtaụka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka nke mbụ n’afọ 2024 nke mere n’etiti Onyeisiala Joe Biden na onye bụbu onyeisiala Donald Trump ewepụtala ọtụtụ okwu n’ọnụ ndị mmadụ na mbaụwa.

Nrụrịtaụka mmadụ abụọ a lebara anya n’ọtụtụ ihe gụnyere ntepu ime, akụnaụba, ikike ibu egbe, nnabata ndị mbịara mbịa nakwa ihe ndị ọzọ.

N’oge nrụrịtaụka ahụ nke were nkeji iri itoolu (90mins, Biden na Trump nọ na-adọrịta onwe ha aka n’ọnụ. Ha kọwakwara onwe ọnụ n’ụzọ dị iche iche.

Na mbido, ọ dịka a ga-asị na Joe Biden akwadoghi ọfụma maka nrụrịtaụka ahụ dịka ọ nọ na-atajagharị ọnụ ka onye na-amaghị ihe ọ chọrọ ikwu.

Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-ekwu na nwamadị a emeela ezi okenye ịchị oke mba dịka Amerịka.

Ọnọdụ a tinyekwara pati ya bụ Democrats na-agbagharịa dịka ha na-atụ arọ ịgbanwe ya ma were onye ọzọ dochie anya n’ịzọ ọkwa onyeisiala nke afọ a.

N’aka nke ọzọ, Donald Trump kwuru okwu dịka onye kwadoro ọfụma na nrụrịtaụka ahụ, karịa ka o si kwadoo na nke afọ 2020.

O kwuru ọtụtụ okwu nke na-enweghi ihe nkwado gosiri na ha bụ eziokwu ma tụọkwa asị n’ọtụtụ ihe ndị o kwuru.

Ebe Biden na Trump kwụụ n’ụfọdụ iwu na mba Amerịka

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị na-atụ vootu ga-ahọrọ otu onye n’ime mmadụ abụọ ma ntuliaka ruo n’ọnwa Nọvemba afọ a.

Ngwa, lee ebe ndị kwụụ n’ụfọdụ iwu na etu ọ ga-esi metụta ndị Amerịka nakwa mbaụwa.

Akunaụba

Iwu akụnaụba Onyeisiala Trump nke a kpọrọ - Bidenomics gbadoro ụkwụ na nwulite akụnaụba – site n’ala gbagoo n’elu. Nke a gụnyere itinye ego na nrụrụpụta ihe dị iche iche, ikike dị ọcha nakwa mmụbanye ọrụ. Ihe akaebe gosiri na akụnaụba mba Amerịka gbagoro elu n’ọchịchị Biden mana ọnụahịa ngwa ahịa rịrị elu.

N’aka nke ọzọ, Trump kwenyere na ọ ga-ebelata ọnụahịa ịrị elu site n’iwepụ oke ụtụisi nakwa mmachị dị iche iche. O kwere nkwa iwepụ onyeisi ụlọọrụ nchekwa akụnaụba ha bụ Jerome Powell bụ onye o tinyere n’ọchịchị.

Nnabata ndị mbịarambịa

Mmepe okeala Amerịka nke Biden mepere mgbe ọ banyere ọchịchị mere ka ọtụtụ ndị mmadụ nubata na mba Amerịka n’ụzọ na-ezighi ezi mana nkatọ ndị mmadụ na-akatọ ya ugbua emeela ka o tinye ụfọdụ mmachi. A na-atụ anya na ọ ga-etinye iwu ga-ahụ na achụghachịri ndị niile batara n’Amerịka n’ụzọ na-ezighi ezi.

Trump katọrọ iwu a Biden chọro ime ma kwuo na o sighi ike ọfụma. O kwere nkwa na ọ ga-etinye iwu ga-emechi okeala mba Amerịka ma ọ bụrụ ahọpụta ya ọzọ. O kwuru na ọ ga-akwụsị iwu ahụ kwuru na nwata ọbụla a mụrụ n’Amerịka ga-abụ nwafọ ha.

Ntepu ime

Onyeisiala Biden kwere nkwa na ọ ga-eweghachịte iwu ahụ akpọrọ Roe nke nyere onye ọbụla dị ime ohere itepu ime ma ọ chọghị ịmụ ya.

Trump kwuru na obi dị ya ụtọ maka na ọ kwụsịrị iwu ahụ nyere ndị mmadụ ohere itepu ime. Mana o kwuru na ọ ga-enye steeti dị iche iche ohere ikpebi iwu ha banyere ntepu ime. O kwughi ma ọ ga-eme iwu zuru mba ọnụ banyere nke a.

Ibu egbe

Joe Biden tinyere aka n’akwụkwọ iwu banyere ibu egbe nke kachasị gbapụta ihe na mba Amerịka nke gụnyere inyocha mmadụ ọfụma tupu enye ya ikike ịzụrụ egbe. Ọ gwala ndị omeiwu ọtụtụ oge ka ha mee iwu ga-egbochi ibu egbe na mgbọ ndị na-akpa ajọ ike.

Trump mere ka iwu ibu egbe na mba Amerịka daa mba oge ọ nọ n’ọchịchị kama o mechiri mmepụta akụrụngwa na-eme ka egbe na-agbasi ike. O kwuru na ọ ga-ekpochapụ iwu niile Biden mere banyere ibu egbe ma chụọ ndịisi ụlọorụ na-ahụ maka mmanya na-aba n’anya, anwụrụ nakwa mmepụta egbe.

Nkwado n’agha Isreal na Gaza

Onyeisiala Biden kwụsịrị ike n’ịkwado mba Isreal n’agha ha na Hamas site n’inye ha ọtụtụ ijeri dọla ngwa agha ma machọkwa ka e nyekwuoro ha aka.

Trump bụ onye na-etokaarị ọnụ ịkwado mba Isreal kwuru na Isreal mechaa ihe ha malitere megide ndị Hamas n’obodo Gaza ma mee ya ọsịsọ maka na akụkọ ya abụrụla ihe ochie.

Nkwado agha Russia na Ukraine

N’otu aka ahụ, Biden na-akwado Ukraine site n’inye ha ego nakwa ngwagha ma kwuo na ọ bụrụ Onyeisiala Russia bụ Vladimir Putin merie n’agha a na ọ ga-emetụta mba Europe n’ụzọ ọjọo, ebe ọ ga-enyere China bụ ndị iro Amerịka aka.

N’ọnwa Febụwarị, Trump dọrọ aka na ntị na ọ ga-enye ohere ka Russia mee mba nọ n’otu Nato ihe ọbụla masịrị ya ma ọ bụrụ na mba ahụ agaghị akwụ ụtụisi ya dịka onye otu a – Mana Trump agbanweela echiche dị etu a kamge.