Sir Keir Starmer: Onye bụ Praịm Minista ọhụrụ mba UK?

Sir Keir Starmer n'ihu 10 Downing Street

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto Keir Starmer n'ihu 10 Downing Street

Keir Starmer e werela oche dịka Prịam Minista ọhụrụ mba Briten.

Pati ya bụ 'Labour Party' tuuru ugo na ntụliaka mba ahụ mere ụbọchị Tozde abaị anọ nke ọnwa Julaị afọ 2024.

Tupu e mee ntụliaka ahụ, ọ bụ otu pati 'Conservative' nọ n’ọchịchị kemgbe afọ 2010.

Mana onye bụ prịam mịnista ọhụrụ a bụ Sir Keir Starmer?

Sir Keir Starmer

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sir Keir Starmer

A mụrụ Keir Starmer n’abalị abụọ ọnwa Septemba afọ 1962 na mpaghara Surrey dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mba Ingland.

Nna ya Rodney Starmer bara ya ‘Keir’ aha onye izizi bụ onyeisi ndị omeiwu otu Labour Party bụ J. Keir Hardie.

Ọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ 'Reigate Grammar School', St Edmund Hall, mahadum 'University of Oxford ', nakwa 'University of Leeds'.

Ọ bụ onye onye ndọrọndọrọ ọchịchị na ọkaiwu n'ihe gbasara ikike mmadụ (human rights), ma bụrụ onye mbụ gara mahadum n’ezinaụlọ a mụrụ ya.

N’afọ 1987, Starmer malitere ọrụ dịka ọkaiwu n’ụlọọrụ Middle Temple otu n’ime ‘ụlọikpe ‘Inns’ London.

Starmer eburila ya n'ọkwa 'Queen's Counsel, nke bụ ọkwa a na-ebuli ọkaiwu ọbụla matarala evbe ọ dị ukwuu ihe ekwe na-akụ n' ọrụ ọkaiwu mba Briten.(senior advocate)

N’afọ 2002, a hụpụtara ya dịka onyeisi ‘Public Prosecution’ n' ụlọọrụ ‘Crown Prosection Service’ na-ahụ maka ikpe ndị omekome.

Ọ nọrọ n’ọkwa ahụ ruo afọ 2013.

Ikpe ndị Starmer kpere n’ọkwa ahụ gunyere ikpe Jimmy Savile, Chris Huhne na ndị ọzọ.

Starmer bụ onye omeiwu na-anọchiteanya Holborn na St Pancras kemgbe afọ 2015.

Starmer bụ onyeisi otu pati Labour kemgbe afọ 2020. Ugbua, o nwerela oche dịka praịm mịnista 58 mba UK.

Ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị ya

Foto Sir Keir Starmer

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto Sir Keir Starmer ebe ọ na-achọ nta vootu
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ka MP Frank Dodson nwụrụ n’ọnwa Desemba afọ 2014, a họpụtara Starmer dịka onye ga-azọ ọkwa onyeomeiwu ga-anọchiteanya ‘Holborn na St. Pancras’.

N’ọnwa Mee 2015, o turu ugo na ntụliaka ahụ e mere ma bụrụ onyeomeiwu n’ụlọomeiwu ‘House of Commons’.

N’afọ 2026, Starmer gbara arụkwaghịm maka agwa onyeisi otu 'Labour Party' bụ Jeremy Corbyn kpara banyere okwu ‘Brexit’.

Na ntụliaka afọ 2019, otu 'Labour Party' dara nke a mere ka Jeremy Corbyn rituo n’ọkwa dịka onyeisi otu ahụ.E mechara họpụta Starmer dịka onyeisi otu LP na ntụliaka e mere n’ọnwa Eprel 4 afọ 2020.

Otu pati Starmer bụ jiri vootu dị 411 merie otu pati Conservative na ntụliaka e mere na 4 Julai 2024. Mmeri ahụ pụtara na Starmer bụ praim minista mba UK nke 58.

N’ozi ọ gbasara n’obi ọchịchị mba ahụ bụ 10 Downing Street oge o nwere oche ọchịchị, Starmer kwere nkwa ịrụrụ ụmụafọ Briten niile ọrụ, ma ha ọ tụnyere ya ma ha atụnyere.

“Ma ị tụụrụ Labour Pati vootu ma ị tụụrụghị ya vootu – ana m agwa gị na ọchịchị ga-arụrụ gị ọrụ.

“Anyị agbanweela 'Labour Party' ma weghachi ya n’ọchịchị na-agara ọha ozi – etu ahụ ka anyị si achị. Mba anyị bụ mbụ tupu e kwuwe okwu pati."

O kelere Rishi Sunak bụ onye ọ na-apụrụ ọkwa praịm minista.

Ezinaụlọ ya

Sir Keir Starmer na nwunye ya Victoria n'ihu 10 Downing Street

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sir Keir Starmer na nwunye ya Victoria n'ihu 10 Downing Street

Keir Starmer lụrụ nwunye ya bụ Victoria Starmer n’afọ 2007.

Victoria bụ onye nwetara ọzụzụ dịka onye ọkaiwu mana ugbua, ọ na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ NHS.

Starmer na nwunye ya mụrụ ụmụ abụọ (nwoke na nwaanyị).

Starmer na ezinaụlọ ya bi na mpaghara ugwu (North) London.

Sir Keir Starmer gbara bọọlụ ma bụrụ onye na-akwado otu egwu bọọlụ Arsenal kemgbe.