Lee ụmụafọ Naịjirịa tuuru ugo na ntụliaka mba UK

Ebe foto si, Getty Images
Otu Labour Pati tuuru ugo na ntụliaka mba UK mere ụbọchị Tozde 4 Julaị 2024. Ha meriri otu pati Conservative nọ n’ọchịchị kemgbe afọ 2010.
Na ntụliaka ahụ, ụmụafọ Naịjirịa 30 zọrọ ọkwa ụlọomeiwu mba UK mana naanị mmadụ atọ n’ime nwetara mmeri.
Ngwa lee ha ebe a:
Bayo Alaba
A mụrụ Bayo Alaba na Forest Cafe dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ London.
Ọ bụ ọtụ ndị isi n’ụlọọrụ Phoenix Resource Centre nke ọrụ ha bụ ị nyere ndị mmadụ aka (Charity).
Bayo Alaba nke ọtụ pati Labour, nwetara mmeri ị nọchiteanya Southend East na Rochford n’ụlọomeiwu mba UK.
O ji vootu 15,395 merie Gavin Haran nke Conservative Pati nwetara vootu 11,368.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mgbe Alaba na-achụ nta vootu, o kwuru na “Oge e ruola mgbe Southend ga-enwere onwe ya”.
Kemi Badenoch
Kemi Badenoch onye a mụrụ n’ọnwa Jenuwarị 1980 na Wimbledon, turu ugo na ntụliaka ahụ ị nọchiteanya North West Essex n'ụlọomeiwu UK.
Kemi rụrụ ọrụ dịka onye odeakwụkwọ nchekwa na azumahịa oge Rishi Sunak nọ n’oche dịka praịm minista.
O nwetara vootu 19,360 na ntụliaka ahụ.
Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nnọchiteanya Saffron Walden n’afọ 2017.
Taiwo Owatemi
Taiwo Owatemi bụ onye otu Labour pati nwetara mmeri ị nọchiteanya Coventry North West n’ụlọomeiwu mba UK.
A mụrụ Taiwo Owatemi na Jụlaị 1992. Ọ gụrụ akwụkwọ na University of Kent.
O ge mbụ a họpụtara Taiwo n’ụlọomeiwu mba UK bụ n’afọ 2019,
O ji vootu 19,696 merie Tom Mercer nke pati Tories onye nwetara naanị vootu 8,522.
Taiwo Owatemi rụburu ọrụ dịka minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị site n’afọ 2021 ruo ọnwa Septemba 2022.
Chi Onwurah
N’ọnwa Eprel 12, 1965 ka a mụrụ Chinyelu Susan "Chi" Onwurah na mpaghara Wallsend.
Ọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ Kenton dị na Newcastle nakwa Imperial College London e be o nwetara asambodo na ngalaba 'Electrical Engineering'.
Ọ bụ onye otu Labour pati bu ụzọ rụọ ọrụ dịka onye omeiwu n’afọ 2010.
Ugbua, a họpụtara ya dịka onyeomeiwu nke Tyne Central na West nke mpaghara Newcastle. Ọ bụ vootu 18,875 ka o ji merie na ntụliaka ahụ.
Tupu e mee ntụlịaka ahụ, ọ rụrụ ọrụ dịka minista na-ahu maka ‘Industrial Strategy’.
Florence Dauta Eshalomi
Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị rụrụ ọrụ dịka onye omeiwu nọchitereanya Vauxhall site n’afọ 2019 tupu a kagbuo oche ya n’afọ 2024.
A mụrụ ya na Septemba 18,1980. Ọ bụ onye otu Labour pati na Co-operative pati.
Ọ rụrụ ọrụ na mbụ dịka onye otu London Assembly nọchitereanya Lambeth na Southwark site n’afọ 2016 ruo 2012.
Florence Dauta Eshalomi ji vootu 21,528 nweta mmeri dịka onye nnọchiteanya Vauxhall na Camberwell Green nke e mepụtara ọhụrụ n’afọ 2024.
Ọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ Middlesex University ebe o nwetara asambodo dịka onye ọkaiwu.
Ihe gbara ọkpụrụkpụ n’okwu mbụ Keir Starmer dịka Praịm Minista mba Briten

Praịm Minista ọhụrụ nke Briten bụ Keir Starmer agbasaala ozi mbụ ya nye ndị mba ahụ dịka o weere ọkwa ọchịchị.
N’ozi ọ gbasara n’obi ọchịchị mba ahụ bụ 10 Downing Street, Starmer kwere nkwa ịrụrụ ụmụafọ Briten niile ọrụ, ma ha ọ tụnyere ya ma ha atụnyere.
“Ma ị tụụrụ Labour Pati vootu ma ị tụụrụghị ya vootu – ana m agwa gị na ọchịchị ga-arụrụ gị ọrụ.
“Anyị agbanweela Labour Pati ma weghachị ya n’ọchịchị na-ejere ọha ozi – etu ahụ ka anyị si achị. Mba anyị mbụ tupu e kwuwa okwu pati.
O kelere Rishi Sunak bụ onye ọ na-apụrụ ọkwa ọchịchị ma kwuo ka onye ọbụla kwanyere nwamadị a ugwu ịbụ nwafọ Asia mbụ ga-abụ praịm minista.
Ihe ndị ọzọ Starmer kwuru
- “Ugbua mba anyị atụọla vootu mgbanwe ma lọghachị n’ọchịchị na-arụrụ ọha ọrụ.”
- “Ohere dị n’etiti ọrụ ndị mmadụ na-arụ nakwa ihe ha na-enwete n’aka ndị ndọrọ ndọro ọchịchị buru ibu nke mere obi ji na-ada ndị mmadụ mba banyere ọdịnihu ha.”
- “A ga-agwọnwu ọnya ahụ site n’ọrụ na-abụghị n’okwu ọnụ. I maara m nke a, mana anyị amalitela ime nke a site n’ịghọta na ịrụrụ ọha ọrụ bụ site n’ịkwanyere onye ọbụla ukwu.”
- “Ịgwa gị eziokwu, ịrụrụ ọrụ bụ inye ndị mmadụ olileanya mana o doro anya na anyị kwesịrị ịgbanwe ma chọpụta ndị anyị bụ.”
Rishi Sunak anabatala mmeri Labour pati meriri na ntuliaka mba UK

Rishi Sunak bụ Praịm minista mba Briten anabatala mmeri e meriri ya na ntuliaka mba ahụ e mere n’ụbọchị Tọzde 4 Julaị, 2024.
O kwuru na ụta dịịrị ya maka etu Labour Pati si were nkata kpokọrọ vootu ma merie ha na ntuliaka ahụ.
Sunak gwara ndị nkwado ya “ndị Briten emeghi nke ọma na mkpebi ha mere taa, e nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ịmụta ...ọ bụ m ka ụta dịịrị.”
Ọ gara n’ihu kelee Keir Starmer bụ onyendu Labour Pati dịka a na-akwado ịhọpụta ka praịm minista ọhụrụ nke mba ahụ.
N’otu aka ahụ, nwada Liz Truss bụbu praịm minista nwa mgbe nta dakwara afọ n’ala na ntuliaka ahụ dịka Labour pati wepụrụ ya oche n’otele.
A na-atụ anya na Sunak ga-edegara Eze Charles nke mba Briten akwụkwọ ịgba arụkwaghịm ma nyefee ọchịchị n'aka Steir Starmer.
Ndịisi mbaụwa ekeleela Starmer n'ọkwa ọhụrụ ya

Ebe foto si, PRESIDENCY OF THE REPUBLIC
Ndị ndu mbaụwa dị iche iche ekeleela ma nabata Keir Starmer nke Labour Pati na mmeri n’ọkwa Praịm Minista mba UK.
Emmanuel Macron, onyeisiala mba France kelere Starmer ma kwuo na ha ga-aga n’ihu ịrụkọ ọrụ maka udo, nchekwa na-akwa mgbanwe ihueluigwe mba Europe.
Ndị ọzo wepụtara ozi ekele gụnyere;
Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ya na Starmer ga-aga n’ihu ịbụ “ezi enyi”
Onyeisiala mba Isreal bụ Isaac Herzog kwuru na o nwere olileanya na mba abụọ ndị a ga-aga n’ihu ime ka “enyi ha dịkwuo mma”, dịka Isreal na-alụ ọgụ na Gaza.
Onyeisi otu European Commission bụ Ursula von der Leyen kwuru ebumnobi na ya na Starmer ga-enwe ezi mmekọrịta, na-agbanyeghi na Starmer ekwuola na ha agaghị esonye n’otu EU.
Praịm Minista mba Australia bụ Anthony Albanese na nke Canada bụ Justin Trudeau zigaara ‘enyi’ ha Starmer ozi ekele mmeri.
N’otu aka ahụ Peter Obi ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 kelekwara Keir Starmer na Labour Pati maka ji ọtụtụ vootu merie ma kwuo na o nwere olileanya na mba UK na Naịjirịa ga-enwe ezi mmekọrịta.
Etu Labour pati si kpokọrọ ọtụtụ vootu ma merie na ntuliaka ahụ

Otu Labour Party nke mba UK emeriela na ntuliaka ịhọpụta ndị ọmeiwu mba ahụ.
Labour Party mere nke a site n’inwete oche ọchịchị rurula 410 n’ụlọomeiwu bụ nke karịrị 326 a chọrọ tupu pati ọbụla ahụ e merie.
Ebe pati Conservative nọbu n’ọchịchị kamgbe ọtụtụ gbara ọnyụpa ma nwete ọkwa ọchịchị 144 n’ụlọomeiwu.
Na-agbanyeghi na a kpọtacheghi mpụtara niile mana n’ime ọkwa ọchịchị 580 a kpọpụtarala, Labour Pati ka ji pasentị 35% ebe Conservative ji pasentị 24%, Liberal Democrats jiri 12%, Reform jiri 15% ebe Pati Green ji 7%.

Mpụtara na-egosi na ọchịchị mba UK esila n’aka pati Conservative ji ya kamgbe afọ iri na na anọ ma fee n’aka Labour Pati bụ ndị ga-ehiwe gọọmentị ọhụrụ.
Ugbua a na-atụ anya na Kier Starmer bụ onyendu Labour Pati ga-abụ Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba Briten.
N’okwu nnabata mmeri Pati ha, Starmer kwuru “Anyị emeela ya, unu gbara mbọ ya, chụọ nta vootu ya, tụọ vootu ya ma nwete mmeri a.”
“Mgbanwe ebidola ugbua, obi dị m mma na m nọ n’isi mgbanwe a.
Ugbua anyị dị njikere ịrụrụ mba Briten ọrụ, i nwetere anyị mgbanwe nke ga-ewetere anyị ọganihu.”
Etu e si mee ntuliaka mba Briten

Ebe foto si, PA Media
Ntuliaka bidoro n'elekere 07:00 BST na mpaghara 650 bụ ebe a ga-ahọpụta ndị nnochiteanya n'ulọomeiwu na mba UK.
Ugbua ọtụtụ ndị aha ha na-ada ụda dịka Rishi Sunak bụ Praịm Mịnịsta UK na nwunye ya, Gavin Robinson, John Swinney na keir Starmer na ndị ọzọ atụọla vọọtụ.
Sunak turu vọọtu na mpaghara Nọt Yorkshire. Sunak na nwunye ya bụ Akshata Murty tụrụ vootu n'bodo a kpọrọ Northallerton.
Onye ọzọ tụrụla vootu bụ onyeisi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ SNP ma bụrụkwa Praịm Mịnịsta nke mbụ na Scotland bụ John Swinney.
John Swinney tụrụ vootu ya n'obodo a kpọrọ Burrelton dị na Blairgowirie.

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, PA Media
Na Belfast, onyeisi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Democratic Unionist (DUP) bụ Gavin Robinson na nwunye ya tụrụ vootu ha na Dundonald Elim Pentecostal.
Doug Beattie bụ onyeisi ndị Ulster Unionist tụrụ vootu ya n'ụlọakwụkwọ ọta akara ndị Seagoe dị na Portadown na Northern Ireland.
Na mpaghara Nọt London, onyeisi ndị otu Labour bụ nke ndị ọrụ bụ keir Starmer na nwunye ya nọ na Willingham Tenant Hall dị na Kentish tụọ vootu ha.

Ebe foto si, PA Media
Ọ bụlụ na gị ga atụ vootu, ị kwesiri imara ihe ndị a

Ebe foto si, PA Media
Ka nde puru nde mmadụ na-aga ịtụ vootu ha tupuu oge e ji atụ vootu emechie, anyị nwere ihe onye ọ bụla kwesiri imara tupuu ha esi na be ha pụọ gaa ịtụ vootu.
Echefukwana photo njirimara gị ya bụ ‘Photo ID’.
Nke a bụ nke mbụ ndị bị na England, Scotland na Wales ga-eji njirimara ha nwere tụọ vootu na ntuliaka.
Ị ga eji ezigbo njirimara gi dịka akwụkwọ ikike ịji anya ụgbọala na ndị ọzọ.
Ọbụghị ịwụ na ị ga eji nke a kpọrọ ‘Polling Card’ mana ọ bulu na gị jiri ya, ọ ga enyereaka ndị na ahụ maka ntuliaka elele aha gị ngwangwa ka ha mara na gị ekwesiri ịtụ vootu ebe ahụ.
Ebee ka m kwesiri ịnọ tụọ vootu? Ihe niile gbasara ebe gi ga atụ vootu dị na akwụkwọ e jị atụ vootu gi. Ọbụlụ na gị tufulu akwụkwọ vootu gị, nwere pọst-kod gị tinye na websịt ndị na achịkọta ntuliaka.
Enwere m ike ịkpọrọ anụmanụ m na azu gaa mee ntuliaka? Enwepu nkịta, anụmanụ ndị ọzọ ekwesighị ịnọ ebe a na eme ntuliaka. Anyị na ekwu na ị nwereike ịhapụ ya n’ilo.
Kedu maka ise photo? Ị were ike ise photo n’ilo na ebe a na eme ntuliaka, mana ikwesighị ise photo n’ime ebe a na ebinye aka ahụ.
Photo ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gara tụọ vootu na UK

Ebe foto si, PA Media



Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PACEMAKER

Ebe foto si, PA Media


Photo nkịta ndị mmadụ du bịa tụọ vootu

Ebe foto si, kyle pearson

Ebe foto si, Robert Bownes

Ebe foto si, ZACH BRIDGELAND

Ebe foto si, LORNA WALSH
Nnukwu agwọ a hụrụ na ebe a na atụ vootu
Anyị hụrụ nnukwu agwọ na ebe a na atụ vootu. Nke a bụ nke mbụ anyị na ahụ anụmanụ na abụghị nkịta na ogige niile a na atụ vootu.
Agwọ ahụ bụ Neptune ka anyị hụrụ na ịrọ ebe a na atụ vootu dị na Dorset.

Ebe foto si, JOE BERRY
Ihe mere ntuliaka ji gbasa ndị Naịjirịa nakwa Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Na Tọzde a bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Julaị, ọtụtụ ụmụafọ mba UK na-atụ vootu n'ọgbọ ntuliaka.
Ị họpụta ndị ga-eji ọkwa n'ụlọomeiwu na mpaghara ruru 650 dị England, Wales, Scotland nakwa Northern Ireland bụ ebe ntuliaka na-aga n'ihu.
Ọtụtụ n’ime ndị na-azọ ọkwa ahụ nọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ebe ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nọorọ onwe ha.
Ndị ndọrọndọrọọchịchị na-azọ ọkwa ntuliaka ahụ wepụtara ihe ha ga-eme ma etu ọ ga-esi metụta ndị Afrịka bụ nke Naịjirịa so na ya.
Lee ihe ha kwuru nwereike imetuta gị.
Ịbata mba UK
Otu ndọrọ ndọro ọchịchị abụọ bụ nke kacha ndị ọzọ bụ Conservertive na ogbo ha bụ otu-ndorondoro ọchịchịụ ndị ọlụ kwuru na ha ga ebeleta ọnụ ọgụgụ mmadụ na abata na UK ma kwụsị ndị na eso ụsọ adịgbọrọja abata na UK.
Ndị Convervatives kwuru na ndị batara na UK karịrị mana ha ga anabata ndị nwere akọnụche, na ndị nwere ezigbo ọlụaka ga enyereaka kwalite azụmụahịa ha na ọlụ dị icheiche na mba ahụ.
Ha sị na ha ga ebeleta ndị na abata na mba ahụ ma mee ka ọ hara imetuta ndị ọnọdụ ndị ọlụ na ụlọ obibi ndị mmadụ ma mekwa ka ndị mba ahụ nwe ezi ntụkwasịobi na ebe gọọmentị ha nọ.
Mana ha kwuru na ha ga etinye ịwụ ga ebeleta mmadụ ole na abata na UK site n’ụlọ ndị omeịwụ bụ ndị ga emeputa ịwụ ga enwedata mmadụ ole ga erịta erere na Visa ndị na achọ ọlụ na UK nakwa nke ndị na eso ezịnaụlọ ha abịa mba ahụ.
Mana ndị otu ndọrọndọrọọchịchị nke Scottish National Party (SNP) ekweghị nkwa na ha ga eme ga ọnụọgụgụ ndị na abata na UK gbadaa ( dịka ndị Labour na Conservative) , mana ha kwuru na ha kwuru na ha ga eme ga Scotland nweike ara ndị ga esi mba ofesi bia na be ha.
Ha kwuru na ha mee ka oke ala mba ahụ rụọ Holyrood na ndị SNP ga eme ga ịgaharị na EU dị mfe ma na enye ndị mmadụ Visa na enweghị nsogbu.
Na afọ 2023, n’ime 1.2-nde mmadụ ihe karịrị puku mmadụ 141,000 bụ ndị Naịjirịa.
Nke a karịrị mmadụ sị na mba Afrịka ndị ọzọ aga n’UK ma bụrụ nke abụọ kacha na mba na anọghị na EU na enwepu India.
Agụmaakwụkwọ
Ugbua ọbụlụ na ị na agụ akwụkwọ na UK, a ga enye gị Visa a kpọrọ Graduate Visa bụ nke ga eme ka ị nọrọ na UK afọ abụọ na ị gụcha akwụkwọ.
Mana ọ bụ ndị na agụ akwụkwọ dị elu naanị nwereike ịkpọrọ ezinaụlọ ha bịa na UK.
Labour na Conservatives ekwughị na ha ga agbanwe ịwụ ahụ.
Mana Nigel Farage bụ onye ndu otu a kpọrọ Reform UK kwuru na ga amachị ụmụakwụkwọ ịdụlụ dị ma ọ bụ nwunye ha ma ọ bụ ụmụaka ha bịa na UK.
Mana ndị Green Party kwuru na ha agaghị akwụsị ụmụakwụkwọ ikpọrọ ezịnaụlọ ha bịa na UK ma kwụọ na ha ga enye ndị nwere Visa ikike ịtụ vọọtụ.
Atụmatụ UK nwere na mba Rwanda
Ndị Conservatives kwadoro ịtụga ndị gbatara ọsọ ndụ na UK ka ha nọrọ na Rwanda.
Nkwekọrịta UK na Rwanda were bụ ka achunaa mmadu 300 bụ ndị banyere na UK n’ụzọ adịgbọrọja.
Na ọnwa Juun, mmadụ 600 gị ụgbọ mmịrị banye na UK.
Conservatives chọrọ ka a na eduga ndị bịara na mba ahụ n’Rwanda bido n’ọnwa July.
Mana ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na anọghị na ọchịchị kwuru na ha ga akwụsị atụmatụ UK nwere na Rwanda ma nye ndị uweoji ọzọ ọlụ ka ha na echekwa oke ala ha.
Ha kwuru na ha ga etinye anya na ndị na eso ụzọ adịgbọrọja nwere na edubata ndi mmadụ na UK.
Mana ndị Liberal Democrats kwuru na ha ga eguzobe usoro na ụzọ nwere ezi nchekwa maka ndị na agba ọsọ ndụ chọrọ ịnọ na UK.
Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Plaid Cymru katọrọ ịtụga ndị gbatara ọsọ ndụ ga Rwanda.
Ha kwuru na ha ga eme ka UK kwanyere ịwụ mba ụwụ nke gbadọrọ imeso ndị na esi mba abanye na mba ọzọ ezi agwa.
Mana ndị mara nke ekwe na akụ na ọchịchị obodo kọwara na ka e mesiri BREXIT na enwere ihe ndị UK kwesiri itinye anya na ya.
UK kwesiri iwe ezi nghota na etiti ha na mba Afrịka dị icheiche.
Mana Dọkịnta Antony Francis Mveyange na arụ ọlụ na African Population andf Health Research Center kwuru na UK kwesiri ime ka ụmụakwụkwọ baala ndị Afrịka ulu ma bakwara ndị UK ulu. Ọ na aju, kedu onye ga abụ ọnyị ndị Afrịka?
A na aju na ndị ga emeri na ntụlịaka ahụ enereike ịkwadọ mmekorita ha na mba Afrịka?
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kacha na UK ekwuola na ha chọrọ ka ha na ndị niile nọ na Kọmọnwet rụọ ọlụ nakwa mba Afrịka. Labour na Conservatives na ekwu maka uru ọ bara ịweta ezi mmepe obodo na Afrịka.









