"Ọ na-ewe m ụbọchị niile ịchọta ebe m ga-etinye ekwentị m n'ọkụ"

Ndụ nkịtị ka na-aga n'ihu n'isiobodo Niamey n'agbanyeghi mgbochi ụzọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndụ nkịtị ka na-aga n'ihu n'isiobodo Niamey n'agbanyeghi mgbochi ụzọ

Ala m, mba Niger anaghị apụta bu n'akụkọ mana nke ahụ gbanwere n'ụbọchị 26 ọnwa Julaị.

Kepu kepu malitere ifegharị maka ịnapụ ọchịchị n'ike n'obi gọọmentị. Ozugbo m malitere ịme nyocha na nchọpụta ịma nke bụ eziokwu.

O teghi aka, na mgbede ụbọchị ahụ, onyeisi ndị na-echekwa onyeisisala kwuputara na Onyeisiala Mohamed Bazoum nọ na nwụchi imeụlọ. E ewepụla nye ndu nke ahọpụtara. Dịka abalị abụọ gachara, General Abdourahmane Tchiani ahọpụta onwe ya dịka onye isi.

N'izu ụka abụọ so ya ehighi m ụra. Mmadụ niile na BBC chọrọ ịgwa m okwu mana ịkpa nkata rara m ahụ.

Onye agha

Ebe foto si, Getty Images

Ozugbo ahụ, ọnọdụ malitere ịgbanwe n'ama nakwa n'okporoụzọ. Ndị agha napụrụ ọchịchị na ndị nkwado ha malitere ikwu "ọ bụ na ịkwenyeghi n'anyị, ịsoghi anyị".

Mgbe BBC na-akọwapụta ihe niile na-agafe nakwa atụmatụ ndị na-agbanwe nakwa ihe ECOWAS na mba ndị ọzọ cheere na-eme, ọnọdụ na-akawanye njọ. A na m arụ ọrụ m na-akọwapụta ihe niile na-eme gbasara ọnọdụ ahụ.

Mana ụfọdụ ndị na-ege anyị ntị chọrọ ịnụ naanị akụkọ na-akwado nkwenye ha nwere. Ndị na-akwado Rọshịa, ndị na-akwado China, ndị akwadoghi mba Fransị nakwa ihe ndị ọzọ ha bu n'uche mana anya ha malitere ịdị n'ahụ m.

Ndị uweojii na-egosi karị onwe ha n'isiobodo bụ Niamey

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-egosi karị onwe ha n'isiobodo bụ Niamey

Ha malitere ịmaja m na soshal midia nke pụtakwara n'imaja m n'ekwentị. Junta ndị agha adọọla aka na ntị na ha ga-achụpụ ụlọọntaakụkọ mba ndị ọzọ. Ọ dịghịrị m mfe ị pụta n'okporoụzọ Niamey bụ isiobodo ị kọ akụkọ ndị na-akwado Tchiani.

Ọrụ m malitere ịnwe oke ahụhụ dịka ndụ m niile. Ugbua a na m anọzị n'enweghi ọkụ latrik ọtụtụ ụbọchị n'ihi na Naịjirịa esepụla ọkụ. Ọ bụ ọgụ na mgba ịtinye kọmpụta m na ekwentị m n'ọkụ nke na-enwekarị nsogbu. A ma m na okwu m na-ada ka 'nsogbu ọgaranya' na ntị mana ọ bụrụ na arụghị m ọrụ m kedụ etu ndị mmadụ ga-esi ma ihe na-eme?

Ọ na-esizi ike ịchọta nri ugbua maka mmachi ECOWAS machiri. Ndị mmadụ na-ata ahụhụ nke doro anya na ha na-achọ onye ha ga-ata ụta maka ihe dakwasịrị ha. Anyị enwekwughi ego nke dị ezigbo mkpa n'obodo a ebe e nwere oke ihe isi ike. Naanị CFA 50,000 ka mmadụ nwereike isepụta n'ụlọakụ maọbụ dọlla 83.

Ọ dị ka nnukwu ego mana ọnụ ahịa ngwa ahịa arịala elu nke ukwu.

Ndị na-akwado ịnapụ ọchịchị n'ike anaghị ezo onwe ha n'okporoụzọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-akwado ịnapụ ọchịchị n'ike anaghị ezo onwe ha n'okporoụzọ

M pụọ ịzụ ahịa, a na m ezo onwe m. Ọṅụ na aṅụlị m na-ahụbu ebe niile alaala. Mmadụ niile na-akọzị maka nnapụ ọchịchị n'ike mana ọ bụ naanị otu akụkụ nwereikeik ikwu uche ha.

Onye ọbụla katọrọ ya bụ atụmatụ nwereike ịdabanye n'aka Junta ndị agha ga-eti ha ihe maọbụ waghasịa ụlọ ha. Ụjọ nwụchi na-atụ m mgbe niile. Ọ na-echekasị m oge niile mana emeela m ụfọdụ ihe ịhụ na ọ gaghị eme.

A na m akpọchị ụzọ m ma m nọrọ n'ụlọ ma jụ impere ya onye ọbụla. O yighizi ndụ m na-ebi bu mana aka m chọrọ ị na-akọ akụkọ ala m ka ụwa niile nụrụ.