Kedu ka ego 'Ecological Fund' si aga n'Ọwụwa anyanwụ Naijiria?

Ọnọdụ Mbuze
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter

'Ecology Fund' bụ ego gbata gbata nke gọọmenti etiti na-amaputa kwa afọ iji gbochie maọbụ belata ọdachi dị icheiche si na chi.

Ebumnobi gọọmentị ji guzobe ego 'Ecological Fund' n'afọ 1981 bụ iji nwee ebe edebere a ga-eji gboo mkpa sitere n'ọdachị osinachị dịka mbuze, ide mmiri, nchekwaba ọhịa, nchekwa maka mmetọ gburu gburu a kpọrọ 'Enviromental degradation' na bekee.

Ọ bụ akwụkwọ iwu a kpọrọ 'Federation Account Act 1981' hibere akpa ego a bụ 'Ecological Fund'. Iwu a kwuburu na a ga-ewepụta otu pasentị n'ime ego a na-ekesa steeti dị icheiche ma debe ya iche iji gboo mkpa ndị a si n'ọdachi ọnatarachi.

E mechara bulie ego ahụ ruo pasentị abụọ, mana na 1992 ka e buliri ya ka ọ bụrụ pasentị atọ nke ego gọọmentị.

Dịka iwu ahụ si dị, ọ dị ngalaba atọ ebe e ji ego 'Ecological Fund' arụ ọrụ:

  • Ngalaba National Emergency Management Agency
  • Ngalaba 'Ecological Fund Office' nke dị n'ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmentị etiti
  • Ọrụ ọbụla nke onyeisiala nyere nkwado ka e were ya rụọ.

Lee ụfọdụ ọdachi ọnatarachi dị icheiche e kwesịrị iji ego 'Ecological fund' gboo

Mbuze

Mbuze

Anambra steeti bụ ebe nsogbu mbuze kacha enye nsogbu na Naịjirịa, n'ihi etu ala ha si dị.

Mana nke a apụtaghị na ọ bụ naanị n'Anambra ka mbuze na-eme. Nsogbu mbuze gazuru ọtụtụ steeti na Naịjirịa.

Gọọmentị etiti etinyekwala ọtụtụ ego si n'akpa ego 'ecological fund' iji gboo nsogbu mbuze.

Na 2020, ụlọ ntaakụkọ ICIR dere akụkọ etu mbuze si akpa ike n'Anambra n'agbanyeghị ego 'ecological fund' gọọmentị nyere ha.

Aha onyonyo, Lee mkpamkpa mbuze na-akpa na Nanka dị n'Anambara steeti

Ide mmiri

Ide mmiri

N'afọ a, nsogbu ide mmiri egbuola ihe karịrị mmadụ narị isii na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, chụọ ihe karịrị mmadụ otu nde na ụma ise n'ụlọ ha, ma mebie ụlọ karịrị puku isii.

Ihe dị otu a mekwara n'afọ 2012 ebe ọtụtụ mmadụ nwụkwara, ọtụtụ ụlọ na akụnụba lara n'iyi n'ihi ide mmiri.

Mbuze

'Ecological fund' ọ na-arụ ọrụ na Naịjirịa etu o kwesịrị?

N'ọdịnso a ka ụlọọrụ a kpọrọ 'Socio-Economic Rights and Accountability Project' (SERAP) kpọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka o nyochaa ngalaba gọọmentị na-ahụ maka 'ecological fund' ka ha kọwaa etu ha si eji ego ahụ arụ ọrụ.

SERAP kwuru nde kwuru nde naịra e wepụtara maka iji gbochie ọdachi ọnatarachi alaala n'iyi n'ihi nrụrụaka.