Nke bụ eziokwu maka nwata e si na '5-storey' kwapụ n'Onitsha

Aha onyonyo, Nke bụ eziokwu maka nwata e si na '5-storey' kwapụ n'Onitsha

Adanne Nwafor bụ nne nwata nwaanyị si n'ụlọelu ogogo anọ matuo n'Ọnịcha ekwuola ihe bụ eziokwu mere n'akụkọ ahụ.

Ọ gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụchaghị etu akụkọ ahụ si ewu na soshal midia ka o si mee.

Adanne kọwara na ihe butere okwu n'etiti nwa ya nwaanyị na onye ya na ya bi bụ ịba mamịrị n'elu akwa.

Ọ sị na nwaanyị ahụ akpọọla ya ugboro abụọ gwa ya maka ajọ omume nwa ya nwaanyị nke mere ka o nye ya ikike iti nwa ya ihe mgbe ọbụla omehiere.

Nke meziri na nsonso a bụ na nwata ahụ bara mamịrị ọzọ ma gọọ na ọ bụghị ya nke mere ka nwaanyị ya na ya bi pịa ya ụtalị ma taa ya ahụhụ.

Nne nwata ahụ dị afọ iri anọ nakwa ụlọ ogogo ise o si na ya wụpụ.
Nkọwa foto, Adanne Nwafor bu nne nwa ahụ

Ọ bụzị dịka nke a na-eme ka nwata ahụ si n'elu ebe ha nọ wutuo maka ụjọ.

Nne ya kọrọ sị na ihe mere bụ "ọrụ aka ekwensu".

Ya na nwa ya nwaanyị nọzi n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Mgbe BBC Igbo gara ọrụ nchọpụta na be nwaanyị ya na nwa ahụ bi, o nweghi onye nọ n'ụlọ.

Mana ndị agbatobi ebe ahụ kwuru na nwaanyị ahụ bụ ji ụmụ atọ ma kwuo na nke obere ya dị naanị izu ụka abụọ.

E nweghi ike gba ya ajụjụ ọnụ n'ihi na ọ nọ n'aka ndị uweojii ugbua.

Ụlọ ahụ bụ ụlọ ogogo ise bụ ebe nwa ahụ si wutuo mana ha bi n'ogogo anọ ya.
Nkọwa foto, Ụlọ ahụ bụ ụlọ ogogo ise bụ ebe nwa ahụ si wutuo mana ha bi n'ogogo anọ ya.

Ihe ndị uweojii kwuru maka nke a

Nwaanyị a na-enyo maka isi n'ụlọelu kwapụ nwaodibo ya

Ebe foto si, Anambra state police

Ndị uweojii Anambra steeti anwụchiela otu nwaanyị gaara egbu nwaodibo ya dịka o si n'ụlọelu ogogo anọ kwapụ ya n'Ọnịcha, Anambra steeti.

Ikenga Tochukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti, ziputere ozi ebe o kwuru na nwaanyị ahụ dị afọ 29, si n'ụlọelu ahụ kwatuo nwaodibo ya dị afọ 14, dịka ọ na-eti ya ihe.

O kwuru na ya bụ ihe mere ebe elekere anọ nke mgbede n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Julaị afọ 2022, n'Otu streeti nke Awada dị n'Ọnịcha.

Ka ọ dị ugbua, aka ndị uweojii akparala nwaanyị ahụ, ebe nwaodibo ya na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.