A kpụpụla nwoke FBI sị nwara igbu Trump ụlọikpe

Oge ndi uweoji jidere Ryan Wesley Routh

Ebe foto si, Florida state police

Nkọwa foto, Ndi uweoji na Ryan Wesley Routh
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ryan Wesley Routh bụ nwoke ahụ FBI boro ebubo na ọ chọrọ igbu Donald Trump gara ụlọikpe dị na Florida taa.

Mana n’ụlọikpe, ebubo Ryan na-azara ọnụ ya arụtụghị aka na ọ wara igbu Trump dịka FBI sị kwuo.

Ọkaikpe Judge Ryon McCabe gụpụtara ebubo e boro Ryan nke gunyere iwe egbe na ngwa agha dara iwu.

Ndeko dị n’ụlọikpe na-egosi na ụlọikpe amaala Ryon ikpe ugboro abụọ n’afọ 2002 nakwa 2010.

N’afọ 2002,n’ọnwa Desemba ka ụlọikpe dị na Greensboro, Nọth Carolina mara ya ikpe maka i ji ngwa agha nwereike igbu mmadụ n’ọha.

N’ọnwa Maachị, afọ 2010 ka ụlọkpe ọzọ na Nọth Carolina makwara ya ikpe maka iji ihe e zuru n’ohi.

N’ụbọchị monda ọzọ na-abịaabịa ka ụlọikpe ga-ekwu ka ha aga etinye Ryan na nja ruo na-ekpecha ikpe ya.

Onye bụ nwoke nwara igbu Donald Trump ugboro abụọ?

Ryan Routh

Ebe foto si, Reuters

E burula onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gbabanye na nzuzo dịka ụlọọrụ FBI kwuputara na a nwara igbu ya ọzọ n'ogige golf na mpaghara West Palm Beach.

Nke a na-eme dịka ọ fọrọ ntakịrị ka o ruo ọnwa abụọ kemgbe agbara egbe ebe Trump na-achụ nta vootu nke merụrụ ya ahụ ma gbuo otu onye.

Ozi gbasara onye nwoke ahụ bụ ka na-apụta dịka ndị ntaakụkọ mba Amerịka nyere aha ya ka Ryan Routh.

Ihe anyị ma maka Ryan Routh?

Nwa nwoke ahụ bụ Oran kwuru na nna ya bụ "onye ịhụnanya na-elekọta mmadụ"

"A maghị m ihe mere na Florida mana olileanya m bụ na emefeghi ihe oke, n'ihi na site na ihe m nụrụ ọ dịghị ka nwoke m ma enwereike ịme ihe dị etu a" ka Oran gwara CNN.

Nchọpụta BBC Verify mere gosiri soshal midia nwere aha nwoke ahụ. O giosiri na Routh kpọrọ oku ka ndị agha mba ọzọ gaa Yukren ịlụsọ ndị agha Rọshịa agha.

O nwekwara ihe ndị na-akwado Palestine, Taiwa nakwa ozi megide mba Chaịna n'ọbaozi ya nke gụnyere ịbo mba Chaịna ebubo iji ọrịa alụsọ ndị mmadụ agha dịka ọ kpọrọ Covid-19 'mwakpo'.

Etu e si jide Routh?

Ihe ahụ mere n'ebe akpọrọ Trump International Golf Club dị na West Palm Beach ihe dịka elekere iri na ise n'ebe ụlọ Trump dị na Mar-a-Lago.

Ndị ọrụ nchekwa nzuzo hụrụ nwoke ahụ ji egbe mgbe ha na-enyocha ebe Trump ga-eme egbuwregwu nke ya. Ha na-ebukarị ya ụzọ a ga ihu enyocha ebe niile dịka ndị uweojii si kọwa.

Ha hụrụ ọnụ egbe ahụ bụ nke e chebu na ọ bụ AK-47 mana a chọpụtara na ọ bụ SKS-style rifle ka o jị si n'ime obere ọhịa dị n'akụkụ ebe ahụ epiopute isi.

Ozugbo ahụ onye ọrụ nchekwa lụsoro ya ọgụ dịka nwoke ahụ gbapụrụ ọsọ" ka Sheriff Bradshaw kwuru.

"Ndị ọrụ nchekwa nzuzo mere ihe ha kwesiri ime" ka o kwuru.