South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?

Ndị kwụ n'ahịịrị ịtụ vootu na mba ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ntụliaka na-abịa na mba Saụt Afrịka Nomsa Maseko na-ele anya n'afọ 30 nke ọchịchị onyekwuouche ya nakwa etu mba ahụ si gbanwee kemgbe njedebe ọchịchị nchịgbu n'aka ndị ọcha a kpọrọ 'apartheid' na Bekee.

Nne m sị m na mgbe ọ tụrụ vootu ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Eprel,afọ1994, vootu ahụ dị ya ka ohere nnwereonwe," ọ dị ya ka onye e bunyere ike.

Ọ dị afo 43 mgbe ahụ ma ya, ma ndị mba Saụt Afrịka ibe ya, ọ bụkwa mbụ ha na-atụ vootu.

E tozubeghị m ịtụ vootu mgbe ahụ mana ndị ọrụ ntụliaka mgbe ahụ kwere tee m uhie n' aka.

Mgbe ahụ a hụrụ m mkpa ọ dịịrị ndị ojii ịnwe ike ịhọpụta gọọmentị ha.

Dịka ọ fọrọ ụfodụ ụbọchị tupu a tụọọ vootu, ụjọ ọgbaghara ji ndị mmadụ.

Ụfọdụ oge anwụrụ anyammiri na-ekusa n'obodo Kwa-Thelma, obere obodo dị n'akụkụ Johannesburg."

Ndị mmadụ kwụ n'akụkụ ụgbọala ndị agha

Ebe foto si, AFP

Ụgbọala ndị agha gbafere ọtụtụ oge n’ụlọ anyị ma n’ụtụtụ ma n’abalị dịka egbe na-ada n’ebe dị anya.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N’oge ehihie tupu nnukwu ụbọchị ahụ, mụ na ndị enyi m na-egwu egwu n’oge anyị n’oge ụgbọala trọọk ọcha a kwajuru uwe njirimara otu 'National Party', bọọlụ na ọkọlọtọ pati ahụ a ma ama n’ala anyị abịaruo anyị nso.

Ihe a bụ pati batara n’ọkwa n’afọ 1948 ma malite ịkpa oke agbụrụ bụ nke a maara dịka ‘apartheid’ maọbụ “nkewa”.

Ọtụtụ n’ime anyị enwebeghị bọọlụ ọhụrụ, ya mere obi jiri tọọ anyị ụtọ mgbe ha nyere anyị ya n’efu.

Mana obiụtọ anyị anọteghị aka.

Ndị ‘isi okpookpo’ na-ahụ maka ịkpa oke jichiri ha niile, ha mụnyere uwe niile ahụ ọkụ ma were mma supuo bọọlụ niile ahụ.

A baara anyị mba ma sị anyị: “Ụnụ anwakwala anwa nara onye iro ihe ọbụla.” O nwere ike ịbụ na obi jọrọ anyị njọ mana anyị ghọtara ihe mere o ji mee.

Ụtụtụ ụbọchị a ga-atụ vootu dị ezigbo jụụ. Anwụ na-acha mana ụjọ na obi iko n’elu juru ebe niile.

Ogbe ntụliaka dị n’ụlọakwụkwọ a na-azụ ndị nkụzi nke dị na ncherịtaihu ụlọ anyị. Ọtụtụ ọkọlọtọ tụrụ agwa ọcha na anụnụ anụnụ na-efeli elu. Ndị nnọchiteanya pati dị icheiche yi akwa ejirimara ha na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-agwa ndị mmadụ ka ha gaa tụọ vootu.

Mmalite oge ọchịchị onyekwuouche ya nyere ndị mmadụ olileanya.

Dịka Nelson Mandela chịchara ọchịchị nke mbụ ya, Thabo Mbeki nwetara mmeri na ntụliaka nke sotere ya, ebe na-agba mbọ maka ikike dịịrị onnye na ndị ọrụ ntaakụkọ nwekwara ohere ịrụ ọrụ ha na-enweghị mgbochi.

Mana ọtụtụ mmadụ chere na oge an̄ụrị nye otu ANC agaala, dịka a na-ebo ha ebubo ime nrụrụaka nakwa agha imeụlọ.

Mba ahụ na-agabiga ogogo anamachọọrụ dị ukwuu tinyere tigbuo-zogbuo dịka ọtụtụ ndị ọzọ na-ahụsi anya n’ihi enweghị akụrụngwa e ji enyere ndụ aka dịka mmiri na ọkụ latrik.

Uru ọchịchị ọhakarasị Maazị Maqubela nwetara agafeghị mpaghara Vilakazi St.

Otu okporoụzọ dị na Kliptown, Saụt Afrịka 2024

E nweghi ụlọakwụkwọ dị nso mana ọtụtụ 'shebeen' bụ ebe nnweta onwe juru ebe a. Ndị nne obere na-ata ahụhụ ibi ndụ nkịtị.

Tasneema Sylvester bụ onye yi okpu ojii, ma tie trụza ojii nanakwa uwe ọbara ọbara nọ ala n'ihu mkpọmkpọ ụlọ ya, sịrị, "Afọ 30 nke ọchịchị onyekwuouche ya edoghi m anya, o nweghi ihe aṅụrị dị ya."

Nwaanyị ahụ dị afọ 38 ma jiri ụmụ atọ kwuru sị,"Agaghị m ama ụma tụo vootu afọ a maka na o nweghi ihe m hụrụ ANC sị na ha mere."

"E nweghi m ọrụ, mmiri dị ọcha, mposi. Iwe ji m, enweghị m olileanya"

Akụkọ Oriaku Sylvester mere ka ndụ ọtụtụ ndị mmadụ na mba Saụt Afrika taa pụta ihe- e nwere nkewa ukwu n'etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye.

Ndị obodo Kliptown chere na ihe jikọrọ ha na ọchịchọ nnwereonwe bụ ihe a na-eleghara anya, maka na ọ bụ ebe ka e binyere aka n' akwụkwọ nwereonwe nke afọ 1955 ebe ndị na-alụ agha megide 'apartheid' depụtara ọdịnihu ọhụrụ maka mba Sụt Afrịka.

Otu onye ndugharị ndị njem nlegharị anya bụ Ntokozo Dube kwuru sị,"O teela aka a na-eleghara anyị anya. Ọ bụ ihe mwute na o nweghi otu n'ime ndepụta iri dị n'ime akwụkwọ 'Freedom Charter' bịarala na mmezu n'akụkụ obodo a."

Ntokozo Dube e gosiri na ugwu ncheta Freedom Charter dị na Kliptown Saụt Afrịka 2024

Ebe foto si, BBC/Thuthuka Zondi

N'uche otu onye ma ihe ekwe na-akụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Tessa Dooms, e nwere ọtụt ajụjụ tara akpụ e kwesịrị ilebanyere anya dịka Saụt Afrịka na-eme ncheta afọ 30 ha nweere onwe ha.

"O doro anya na ndị mmadụ na-ahụta na ọnọdụ ala anyị agbanwebeghị n'ụzọ pụrụ iche."

"O nwere ụfọdụ ihe ka ndị ka ọ dị mgbe ochie....e meghị nwata ka e mere ibe ya ka dị, ma na-akawanye njọ n'oge ọchịchị onyekwuoucheya."

Otu n'ime ihe ndị na-arụtụ aka na nsogbu e nwere bụ ngagharịiiwe narị kwuru narị dọkịta gụchara akwụkwọ na-eme n'ime ọtụtụ nnukwu obodo maka ahụghị ọrụ.

Dkta Mumtaaz Emeran-Thomas na-eme tii
Nkọwa foto, Mumtaaz Emeran-Thomas bụ dọkịta mana ọ chọtabeghi ọrụ

Dọkịta Mumtaaz Emeran Thomas bụ onye ji ihe ọzọ abụghị ọrụ dọkịta eri nri sịrị,"Ọ bụ ihe obi mgbawa n'ihi na ndị Saụt Afrịka nọ n'ọnọdụ ọchịchọ ọgwụgwọ zuru oke mana ọnọdụ ọjọọ pụtara na anyị nwere ndị dọkịta 800 nọ nkịtị."

Ndị ntorọbịa kachasị achọ mgbanwe nke mere na o nweghi onye ha kwadoro iche ọ kachasị otu ANC.

O nwekwara ndị wepụrụ uche na-ekwu na ha agaghị atụ vootu ma ncha.

Mana ọ ka nwere ụfọdụ ndị dịka nne m agaghị echezonwu uru igbe vootu bara.

Dịka m ga na-arụ ọrụ n'ụbọchị 29 Mee, ntuliaka nke asaa n'oge ọchịchị onyekwuoucheya, ọ ga-akpọrọ nwa m dị afọ isii dịka ha ga-akwụ n'ahịrị n'ọdọ ntuliaka Kwa-Thema ebe ọ tụrụ vootu n'afọ 1994.