Xenophobic attacks: Otu nchekwa na mba Saụt Afrịka na-akpagbu ndị mbịarambịa
Otu nchekwa mba Saụt Afrịka a kpọro Operation Dudula abụrụ ndị a ma ama n’ikposa azụmaahịa ndị mbịara mbịa ma mee ka ha mechie n’Ike.BBC Africa Eye banyere n’otu nchekwa a kachasị gbapụta ihe na mba ahụ.
N’ụlọ usekwu dị n’ụlọakwụkwọ dị n’obodo Kwa Thema nke Johannesburg, Dimakatso Makoena nọ na-esi ‘sandwiches’. Nwaanyị dị afọ 57 nwere ụmụ atọ bụ osi ite kamgbe afọ 10 gara aga.
“Ịgwa eziokwu a kpọrọ m ndị mbịara mbịa asị, uche bụ ka ha kwara ngwo ngwo ha ma hapụrụ anyị obodo,” ka o kwuru dịka ọ na-ebe akwa.
A maghị na ịkpọ asị nwaanyị nwere bụ nke ukwuu ruo mgbe o wepụtara ekwe ntị ma gosi foto nwa ya. Ọ tara ahụ ma nwee mmerụ ahụ n’aka, n’ahụ ya nakwa ihu ya.
“Ọ malitere ise ọgwụike mgbe ọ dị afọ 14.” ka o kwuru, ọ kọwara na nwa ya na-ezi ohi. Otu ụbọchị ọ gara izu ụdọ ọkụ latrik mana ọkụ latrik dọrọ ya ma merụọ ya ahụ.

Nwa ya na-aṅụ ọgwụike a kpọro ‘crystal meth na nyaope bụ ọgwụike ndị juru n’ọtụtụ obodo dị na Saụt Afrịka. O kwuru na ọ bụ ndị mbịara mbịa na-eresi nwa ya ọgwụike ahụ nke mere o jiri na-akwado ndị nchekwa ‘Operation Dudula.
Dudula bụ naanị ihe m ji ebi”, ka ọ gwara BBC.
E hiwere Operation Dudula na Soweto afọ abụọ gara aga, ọ bụ otu nchekwa mbụ malitere ịkwado ịkpaso ndị mbịara mbịa oke agbụrụ (xenophobia) na Saụt Afrịka, mgbe ọchịchị ndị isiọcha kwụsịrị na 1994. Otu a na-arụ ọrụ n’ukporo megidere ndị mbịara mbịa a kpọrọ ‘dudula’ nke pụtara “nchụpụ n’ike site na Zulu”.
Soweto bụbu obodo kachasị ibuagha megide ịkpa oke agbụrụ bụ ebe onyeisiala mbụ ha bụ Nelson Mandela si mana ugbua ọ bụrụla obodo kachasị akpagbu ndị mbịara mbịa.
Nyocha e mere n’afọ 2022 gosiri na ọnụọgụgụ ndị mbịara mbịa nọ na Saụt Afrịka bụ nde 3.95 nke bụ pasentị 6.5 ọnụọgụgụ ndị bi na mba ahụ.
Etu ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ gọọmentị na ndị ọzọ si ekwu maka ịgba oke agbụrụ mere ke e chere na ọ bụ ndị mbịara mbịa na-ekwuzi ihe na-eme n’obodo.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu nchekwa Operation Dudula esila n’ịbụ otu nchekwa ọdịnala ma bụrụzie otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma kwupụta mmasị ha izọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka afọ ọzọ.
Zandile Dabula bụ onyeisi otu a họpụtara n’ọnwa June 2023 na-ekwusi ike na “ndị mbịara mbịa bụ mkpụrụọgwụ nsogbu akụnaụba na ihe isi ike mba Saụt Afrịka nwe.
Mgbe a gwara ya na atụmatụ ahụ bụ akpọmasị, ọ gwara BBC. “Anyị ga-agwa onwe anyị eziokwu na ọtụtụ nsogbu anyị nwere bụ nnubata ndị mbịara mbịa.
O kwuru na-agbanyeghi na akụkọ ka bụ kepukpu mana o kwere na ọ bụ eziokwu.
“Ọgwụike juru ebe niile mana ndị na-aṅụ ya bụ ndị Saụt Afrịka na-abụghị ndị mbịara mbịa, ha na-agba ụmụnne anyị ọgwụike a ka ha nwee ike were obodo anyị?” ka o kwuru.
Ndị na-ebusa iwe a karịa bụ ndị bịara n’ụzọ iwu kwadoro ma na-azụ ahịa ha n’ụzọ iwu kwadoro. Otu nwafọ Naịjirịa na-azụ ahịa na Johannesburg bụ onye ndị a Operation Dudula mebiri ihe ya gwara BBC na ụmụnwaanyị abụọ gbara ya anwụrụ ose n’anya ma mebie uwe ndị ọ na-ere ajụghị ajụjụ ọbụla.
O kwuru na ha gwara ya “Ị ga-alaghachị na Naịjirịa...Anyị bụ Dudula, anyị bụ ndị Saụt Afrịka.”
Ugbua nwamadị a enweghizi ngwa ahịa, ọ na-ehizi ụra n’okporoụzọ. “Atụrụ m vootu ebe a, abụ m nwafọ ebe a. Ahụtụbeghi m mba na-esi etu a akpasị ndị mmadụ agwa. Ọ bụrụ na m na-eme ihe ọjọọ, kpọlaa m. O nweghi ihe ọjọọ m na-eme. Ugbua i meela ka ndị siere m ike. Agaghị akwụnwu ụgwọ ụlọ. Achọrọ m ịla, ọ karịala.”
Operation Dudula kwuru na nsogbu ha bụ etu ọgwụike si amụbawanye n’ime ime obodo na mba ha mana o nweghi ihe akaebe gosiri na ndị na-ere ọgwụike a abụghị ndị Saụt Afrịka.
BBC Sonyere ndị otu a n’obodo Diepkloof, Soweto gaa n’ọdọahịa otu onye Mozambique nwaanyị Saụt Afrịka boro ebubo na ọ kwụbeghị ụgwọ ụlọahịa ya.
O kwesịrị ịbụ mkparịtaụka mana ọ banyere ihe ọgụ mgbe otu nwoke bụ Mandla Lenkosi yiri egwu na ọ ga-eti nwoke ahụ ihe. Mgbe BBC jụrụ ihe ha jiri eme ka ndị agburu, ha kwuru na ọ bụ iwu ka na-amanye.
Lenkosi bụ onye enweghi ọrụ ọ na-arụ na-eso ikposasị ebe obibi nakwa ụlọorụ ndị mbịara mbịa e chere na ha na-eme ọgwụike.
“Anyị toro n’oge ịkpaoke agbụrụ mgbe ihe ka dị mma mana ugbua e nwere nsogbu ọgwụike.
“Ndị nna anyị malitere ụlọahịa ndị a mana ugbua ndị mbịara mbịa ewerechaala ha, ọkachasị ndị Bangladeshis, Somali na Ethiopian maka gịnị?”

Onyeisiala mba ha bụ Cyril Ramaphosa akatọọla agwa ịkpaso ndị mbịara mbịa oke agbụrụ nakwa otu nchekwa a maka ịwakpo ndị mbịara mbịa. O kwuru na agwa ndị a dịka ndị a kpọtara ka ha kpasoo ndị ojii ibe ha oke agbụrụ.
Nwada Dabula kwuru na ndị na-akatọ ndị nchekwa a sị na ihe ha na-eme dị njọ na-atụ asị.
“Anyị anaghị akwado ime ihe ike, anyị achọghị ka ndị mmadụ chere na a na-akpagbu ha, anyị agaghị anọ ebe a ka ndị mbịara mbịa were obodo anyị.”
Ọtụtụ ndị mmadụ mere njem na Johannesburg maka ọgbakọ mbụ nke otu a e mere n’ọnwa Mee, ebe ọtụtụ ndị otu ha tinyere aka ka e debanye aha otu a dịka otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ha jicha ọkọlọtọ mba ha na-abụ abụ na-agba egwu dịka ha si n’okporoụzọ gawara ụlọ ozuzu a kpọrọ City Hall.
Mana egwu ha na-agụ nwere okwu iyi egwu dị n’ime ya. “kpọọ ndị mbịara mbịa ọkụ. Anyị ga-aga zụọ mmanụ ụgbọala ma gbaa ndị mbịara mbịa ọkụ.”
Uwe nwere agwa ndịagha dịka ka otu nwereonwe mba Saụt Afrịka. Nke gosikwara ịdị njikere maka ọgụ.
N’elu ọgbọ ka onye ndụmọdụ otu Operation Dudula bụ Isaac Lesole nọ na-ajụ ndị nkwado ha sị: “Anyị na ndị mbịara mbịa ọ ga-ekpe udo?” “Mba,” ka ndị mmadụ zaghachịrị ya n’otu olu.
Dịka iwu mba Saụt Afrịka siri dị idebanye aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị apụtaghị na ha etozuola oke iso zọọ ọkwa ntuliaka – e nwere ọtụtụ nyocha ọ ga-agafe.
Operation Dudula enweghi akwụkwọ kọwara ebumnobi ha maọbụ iwu na-achị ya ma ọ bụghị naanị banyere ndị mbịara mbịa mana nwada Dabula kwuru na ha nwere ndị nkwado na mpaghara niile ewezuga Northern Cape.
Ndị nwado pati ọhụrụ a gwara BBC okwu chọro ka ihe dị mma n’obodo ha n’ezie. Ha chọrọ ka ihe gbanwee site n’etu ọ dị na mbụ.
Mana iwe n’ihi ụbịam, ọgwụike na egwu emee ka ha na-ata ndị mbịara mbịa dịka ọ bụ ha ka o si n’aka.










