ICJ enyela Israel iwu igbochi mkpochapụ agbụrụ na Gaza

Ụlọikpe mba ụwa bụ 'International Court of Justice' (ICJ) dị na Hague Enyela Izrel iwu ka ha kweụsị ihe ọbụla nwere ike ibute mkpochapụ agbụrụ na Gaza .
Mana ụlọikpe ahụ ekwughị kpọmkwem ha kwụsị agha ha.
Mba Saụt Afrịka gbara Izrel akwụkwọ n'ụlọịkpe ahụ sị ụlọikpe nye Izrel iwu ka ha kwụsị agha ganye na ekpebie ikpe ma Izrel emere mpụ mkpochapụ agbụrụ nke Bekee kpọrọ 'genocide'.
Izrel si na o nweghị ihe dị n'ebubo ahụ e boro ha.
Ụlọikpe ahụ nyere Izrel iwu ka ha gba mbọ hụ na ha emeghị ihe ga-ebuta mkpochapụ agbụrụ n'ihu agha maọbụ kpalite ọha ndị mmadụ ime nke a.
Ụlọikpe ahụ nyekwara ha iwu ịgba mbọ hụ na ihe enyem,maka rutere ndị mmadụ na Gaza aka na egbughị oge.'
N'ikpe e kpere taa bụ ụbọchị Fraide, nke a bụ mbụ ndị ọkaikpe ụlọikpe ahụ na-enye mkpebi n'ikpe ahụ malitere izuụka abụọ gara aga.
A na-atụ anya na inye mkpebi ma Izrel akpara arụ mkpochapụ agbụrụ ga-ewe oge.
Na-agbanyeghị na ụlọikpe ahụ amachi agha a na-ebu na Izrel dịak Saụt Afrịka si rịọ ụlọikpe ahụ, a na-ahụta mkpebi o nyere dịka mmeri nye ndị kwadoro ụkwụ Saụt Afrịka zọpụrụ site n'ịgba akwụkwọ ahụ.
ICJ kwuru na ha nwere ikike ikpe ya bụ ikpe ma kwubikwa na okwu ahụ metụtara iwu nkwekọrịa megide mkpochapụ agbụụ nke afọ 1948., si na ndị Palestine nọ na Gaza nọ n'egwu mmemila.












