Plateau Attacks: Ndị uweojii anwụchiela ndị chọrọ iwakpo Ntam dị na Mangu

POLICE

Ebe foto si, NIGPOLICE

Ndị uweojii na Jos dị na Platu Steeti ekwuola na ha nwụchiri ma kwụsị ndị omekome chọrọ iwakpo otu obodo a na-akpọ Ntam dị n'okpuru ọchịcị Mangu na steeti ahụ.

Na mgbasaozi nke onyeisi uweojii AIG EBONG EYIBIO mere na Jos ụbọchụ Tọzde, o kwuru na ha nwuchiri mmadụ itoolu ma natasịa ha ngwa agha dị icheiche.

Police

Ebe foto si, POLICE

Plateau attacks: Ihe ndị Mangu kwuru maka mwakpo mere ha

Ụlọ a gbara ọkụ

Ebe foto si, ChannelsTV

Ndị bi n'obodo Mangu bụ ebe ọhụrụ ndị omekome wakporo akwaala arịrị maka ihe mere ha.

Ha kwuru na o teela aka ha na-arịọ ndị ọrụ nchekwa enyemaka tupu awakpoo ha maka na ha hụrụ ndị nọ n'otu na-aghagharị na-achọ ịgba ụlọ dị icheiche ọkụ.

Ha kpesaara onye ntakụkọ Trust TV bụ Ado Musa nke a mgbe ọ gbara ha ajụjụ ọnụ maka ihe mere ha ebe ihe ruru mmadụ iri atọ nwụrụ.

Cheta na mwakpo a mere n'agbanyeghi na aka na-achị steeti ahụ bụ Caleb Muftwang tinyere mmachi ngagharị n'ebe ahụ.

Ndị na-eme ngagharịiwe agbaala obi ezeọdịnala na Bokkos ọkụ

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe na Jọs n'afọ 2011

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ 2011, ụmụnwaanyị wujuru okporoụzọ na Jọs Platu steeti mee ngagharịiwe maka ndị ọrụ nchekwa wakporo ụmụakwụkwọ mmere ngaghariwe maka ogbugbu ndị mmacddụ mere na steeti ahụ.na-eme ngagharịiwe na Jọs

Ndị na-eme ngagharịiwe ụbọchị Fraide, ụbọchị nke ịse na ọnwa Jenuwarị na mpaghara Bokkos Saf Adanchin, gbara be eze ọdịnala ha ọkụ maka iwe etu ndị ọrụ nchekwa siri kpuru ụfọdụ ndị be ha n'okwu metụtara ọdachị mere n'abalị foro ụbọchị Ekeresimesi nke afọ 2023.

N'abalị 24 nke ọnwa Disemba afọ 2023, ndị bu egbe wakporo ọtụtụ ogbe n'Okpuru Ọchịchị Bokkos dị na Plateau steeti gbuo ihe karịrị mmadụ 160.

Ndị obodo dị na Bokkos mere ngagharịiwe maka etu ndị uweojiri siri kpụrụ ndị obodo bọ ha ebubo na ha mara ịhe mere e ji gbuo ọtụtụ ndị mmadu n' obodo ha.

Ọtụtụ na ndị ngagharịiwe ahụ bu ụmụntọrọbịa na ụmụwanyị.

Ha gara mee ngaghari iwe n’ ihuụ ndị nchekwa, ma na mgbe ha ruru n' obi eze ọdịnala bha, ha gbaa ụlọ ya na ụgbọala ya ọkụ.

Onye na-ekwuru ndị uweojii na Plateau steetị, bụ Alfred Alabo gwara BBC Igbo na ndị ngaghari ịwe ahu agbara ụlọ eze ọdịnala ha ọkụ, mana ọ bụghị ụlọ ya nịle ka ọkụ gbara etu ndị mmadu sịrị kwuuo.

Plateau attacks:'Akpara m ume, mee ka m anwụọla'

Christian Emmanuel
Nkọwa foto, Christian Emmanuel kpara ume, mee ka ọ nwụọla

Ndị steeti Platu ka na-eru ụjụ dịka mwakpo e mere na otu mpaghara steei ahụ tara isi ihe karịrị mmadụ 160 n'abalị foro ụbọchị Ekeresimesi afọ 2023.

Ụfọdụ ndi gbanarịrị ọnwụ mgbe ndị u egbe wakporo otu obodo na Plateau steetị akọọla ihe ha jịrị anya ha hụ.

Otu n'ime ha bụ Christian Emmanuel kwuru na mgbe ndi omekome bịdọro gbuwe ndị mmadu, na ya zoro, jiri egbe nke ya gbaa ha, ha chụwa ya ọsọ.

" Ha gbara m egbe, m daa, bewe akwa rịọwa ha ka ha hapụ. Ha sịrị na ha agaghị ahapụ, gbaa m egbe ọzọ."

"M mee ka arahụla m, ka m anwụrụ anwụ, ha nwere buru egbe ha, hapụ m."

Ot nọọsụ a kpọrọ Kindness Danjuma kọwara etu otu nwoke siri bute nwa ya n' ụlọọgwụ ha.

Ọ sịrị,“Nna nwa ọhụrụ a butere nwa ahụ, kọwaara ha na ndi omekome wakporo ha n'ime obodo”.

Otu Ụkọchukwụ bụ Pastọ Timothy Nuwan kpere ekpere, “Ka Chineke nke ebere mee ka ndụ nke ndị a ga-eli, na ọbara hara ịbu ihe efu.”

mwakpoo a mere bụ nke kachasị njọ na ndị nile meeela kemgbe ọnwa Mee oge e gburu mmadụ ruru 100.

Ndị ọrụ nchekwa aṅụọla iyi na ha ga-eke nkwụcha igbochi ụdị ha ime ọzọ.

Ihe Ọchịagha Abdulsalam Abubakar kwuru

Abdulsalam Abubakar

Ebe foto si, Rauf Aregbesola/X

Ọchịagha Abdullsalam Abubakar na afu ma ndi agha Naijiria akporo Operation Safe Haven kwuru na ha ga agba mbọ kwụsị ndị tigbọọ zọgbọọ na enyị ndi mmadu egwu.

Na okwu ya “anyị agaghị ezu ike ruo mgbe anyị wetara ndị ahụ niile dị njọ, mee ka ha hu ihe ọkụ jị ntị oke eme”

Ihe metụrụ anya,metụrụ imi- Shettima,Osote Onyeisiala

Kashim Shettima

Ebe foto si, Kashim Shettima/Facebook

Na okwu Kashim Shettima “Ihe mere otu obodo na Naijịrịa na emetuta mmadu nịle."

"Ihe mgbu anyị na-enwe ugbu a karịrị nkewa sitere na agbụrụ ma ọ bụ ebe onye na-eperechi ya, obodo onye sị ma ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị."

" Iru ụjụ ahụ anyị nịle nwere bụ ihe na- egosi mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọ bụghị ihe ngosi nkewa maọbụ ndịiche."

Etu ogbugbu ihe karịrị mmadụ 100 n'abalị foro Ekeresimesi si bute ụka

Ndị na-egwu ili ọha ebe e liri ndị egburu na mwakpo mere na Platu ụbọchị 24 nke ọnwa Disemba afọ 2023

Ebe foto si, Getty Images

Ka ọ gachara abalị ole na ole ndị bu egbe wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ na Platu steeti, mwakpoọzọ emela n'Okpuru ọchịchị Bokkos na steeti ahụ n'abalị Tozde.

Ndị bu egbe wakporo ime obodo abalị foro ụbọchị Ekeresinmesi ,gbuo ihe karịrị mmadụ 150, suo ụlọ nakwa ihe ha nwere ha ọkụ.

Onyesisioche nwa mgbeta okpuru ọchịchị Bokkos bụ Monday Kassah gwara ụlọntakụkọ Channels TV na ndị omekome ahụ wakporo mpaghara hụ n'abali malite sunyewe ụlọ ndị mmadụ ọkụ mana ndị ọrụ nchekwa gbata ha ọsọ enyemaka nke mere na o nweghị onye mwakpo ahụ tara isi ya.

Ọ gara n'ihu rụtụ aka na ndị nwụọọla site na mwakpo mere ụbọchịụka gara aga eruola mmadụ 195.

Volker Turk

Ka ọ dị ugbua, otu United Nations akpoola Gọọmentị Naijiria oku ka ha nyocha ihe mere dịka ndị bu egbe wakporo ndị mmadụ na Platu steeti na nsonso a, gbuo ihe karịị mmadụ 150 ụbọchịụka.

Onyeisi na-ahụ maka ikike dịịrị onye na ụlọọụ United Nation bụ 'United Nations High Commissioner for Human Rights bụ Volker Turk kwuru nke n'ozi o wepụtara n'akara ya n'ọbaozi X.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Peter Obi etinyela ọnụ n'okwu ihe karịrị mmadụ 70 e gburu na Plateau steeti

Peter Obi etinyela ọnụ n'okwu ihe karịrị mmadụ 70 e gburu na Plateau steeti

Otu n'ime ndị obodo ebe ọdachi ahụ mere na Plateau steeti.

Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi ekwuola okwu banyere ọtụtụ mmadụ e gburu na Naịjirịa n’oge mmemme ekeresimesi afọ a tụmadị na Steeti Plateau, Katsina na Zamfara.

Dịka Obi siri kwuo, “ụfọdụ obodo ndị nọ n’agha ahụbeghị ụdị enweghị nchekwa, tigbuo zọgbuo na igbu mmadụ dịka e si ahụta ya na Naịjirịa taa.”

Obi toro ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ma kwuo na ndị agha Naịjirịa, ndị uweojii na otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ bụ ndị ọrụ na-ebu aka dịkwa ka ha na-adịghị anata ekpere nakwa obi ebere ụmụafọ Naijịrịa n’oge ụfọdụ.

Ihe Gọvanọ Caleb Mutfwangi kwuru maka ihe mere

Caleb Mutfwang

Ebe foto si, Caleb Mutfwang/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Aka na-achị Steeti Plateau bụ Caleb Mutfwang ekwuola okwu banyere njinji jiri n’Ụbọchịụka ebe ndị ojiegbe mere mwakpo ma gbuo ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ.

N’otu ozi ọnụ na-ekwuru gọvanọ Mutfwang bụ Gyang Bere tinyere aka na ya, ọ sịrị na gọvanọ akatọọla ya bụ ọnọdụ ọjọọ ma kpọọ oku ka ndị bi n’ime obodo mụrụ anya.

Dịka ozi ahụ siri kwuo “Gọvanọ Mutfwang agwaala otu ọrụ nchekwa dị iche iche e nwere na Steeti ahụ ka ha malite ịnwụchi ndị omekoome aka ha dị n’arụ ahụ iji hụ na e kpere ha ikpe.”

“Ọ nyere mmasi obi ike na a ga-etinye atụmatụ ndị kwesịrị ekwesị n’ọrụ iji belata mwakpo ndị na-aga n’ihu ugbua na Steeti ahụ megide ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha.”

Gọvanọ gwakwara ndị bi n’obodo ahụ ka ha mụrụ anya oge niile ma nye mkpesa banyere omume ọ bụla na-ezighị ezi n’aka ndị ọrụ nchekwa.

Ọ gọkwara ọfọ ka ndị niile nwetara ihe mmerụahụ gbakee ngwangwa dịka ọ kasikwara ezinaụlọ tụfụrụ ndị nke ha obi.

Ọ bụ n’ụbọchị bọrọ ekeresimesi ka ndị ọkpaegbe wakporo ụfọdụ obodo ndị e nwere n’okpuru ọchịchị ime obodo Bokkos na Birnin-Ladi nke steeti Plateau gbuo ihe ruru mmadụ 70.

Onyeisioche kọmiti ọchịchị nchereoge nke Bokkos bụ Monday Kasa gwara ndị ọrụ mgbasaozi na mwakpo ahụ malitere n’abalị Satọde ruo n’ụtụtụ Sọnde n’oge ndị obodo ahụ na-akwado maka mmemme ekeresimesi.

Kasa kwuru na ndị ojiegbe ahụ mụnyere ụlọ ndị mmadụ ọkụ, bibie ngwongwo ha ma zurukwa ihe ndị ha kọtara n’ugbo.