Akụkọ kachasị n'abalị a: A nwụchiela mmadụ 13 na Plateau
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a
A na-enyo mmadụ 13 maka ihe mere na Platu steeti

Ndị agha 'Operation Safe Haven' kwuru na ha anwụchiela mmadụ 13 na Platu steeti kamgbe mwakpo ahụ butere ọnwụ mmadụ iri asatọ na isii.
Ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ gwara BBC na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe n'oge na-adịghị anya, ma kwuo na ndị a ha na-enyocha si n'otu abụọ a na-alụ ọgụ.
Buhari atụla ụkwụ na Plateau Steeti
Onyeisiala Muhammadu Buhari gara kalaba taa, ebe ọ nọ gbapee ebe a na-emepụta mkpụrụ e ji akụ osikapa. O kwuru na gọọmentị ya na-etinye uchu n'ikwalite ọrụugbo.
Buhari si ebe ahụ gaa Platu steeti ebe osote ya bụ Yemi Osinbajo nọ kamgbe ụnyaahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ka ọ rutere ebe ahụ, ya na gọvanọ Plateau bụ Simon Lalong na ndị na-anọchite anya obodo abụọ ahụ ihe a metụtara na ndị isi ọrụ nchekwa banyere nzukọ.
O kwukwara na ndị ọrụ gbata gbata ga-enye ndị ihe metụtara ihe dị iche iche ha ga-eji nyere ndụ ha aka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Obi ga-abụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump sọ aṅụrị maka ihe ndị ụlọikpe ukwu ha mere taa.
Ndị ụlọikpe ukwu mba Amerịka akwadola iwu Trump tinyere ịmachi ndị si mba ndị Alakụba dịka Libya, Iran, Somalia, Syria na Yemen ịbata Amerịka.
Ka Trump nụrụ ihe a mere, ọ dere maka ya na Twitter
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
N'egwuregwu,
A ga-ama mbe nabọ nke bụ oke ebe Naịjirịa na Ajentina ga-ezute n'ọgbọ egwuregwu St. Petersburg n'elekere asaa nke mgbede a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Cheta na Ajentina ga-achọ imeri ka ha mara ma ha enwere ohere igafe agba mgbapụ.
Gee nkeji nke abalị a ebe a
Ihe nkiri nke taa
Onye otiegwu e ji Shuga Shaa mara, kwuru na kamgbe ọ zụtachara nwa bebi ya, nsogbu ụmụnwaanyị agbadala.











