Mr Ibu: Etu ndị uweojii si nwuchie ma kpụpụ ụmụ John Okafor abụọ ụlọikpe

Mr Ibu na Jasmine

Ebe foto si, Jasmine/Instagram

Ndị uweojii anwụchiela ụmụ onye ejije Nollywood a ma ama bụ John Okafor a ma dịka 'Mr Ibu' abụọ ma kpụpụ ụlọikpe maka ebubo metụtara ịkpa nkata zupu ego nna ha dịka ọ nọ n'akwa ọrịa.

A kpụpụla Onyeabuchi Daniel Okafor na Jasmine Chioma Okekeagwu ụlọikpe majie dị na Yaba, Legọs maka ebubo ịkpa nkata kapụ Mr Ibu ego ruru nde Naira 50(N50m) bụ nke a sị ọha ndị mmadụ tụkọtara onye ejije ahụ na-arịa ahụ maka nleta ya, dịka ndị uweojii ngalaba na-eme nyocha a kpọrọ FCID, Alagbo Legos si kwuo.

Mr Ibu daara nnukwu ọrịa ọzọ n'afọ 2023 nke mere ka ezinaụlọ ya bekuo ọha Naijiria akwa enyemaka ego mana e mechara ndị dọkịta ya bepụ ya otu ụkwụ dịka a na-azọ ya ndụ.

Nnwuchi mmadụ abụọ ahụ na-eso akwụkwọ mkpesa nke nwunye Mr Ibu bụ Stella Maris Chinyere Okafor degara ndị uweojii site n'aka ndị ọkaiwu ya.

Nwunye Ibu boro ebubo na nwa di ya bụ Onyeabuchi na Jasmine kpara nkata ma jiri aghụghọ napụta ya ekwentị Mr Ibu bụ nke ọ sị ha hazigharịa akara akapeego ya n'ụlọakụ tinye ya n'ekwentị nke Onyeabuchi iji nwee ohere ịnaahazi ego na-abata n'akpaego Mr Ibu dịka ọha ndị mmadụ na-atụkọtara ya ego maka nleta ahụike ya.

Akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ahụ pụrụ iche na-ahụ maka nnyocha mpụ bụ Aminat Mayegun binyere aka kwuru na nnyocha ha merela dugara ịchọta ege dị nde naira 55 n'akpaego Onyeabuchi dị n'ụlọakụ bụ ebe a chọpụtara na o mefuola nde ise(N5 n'ime ego ahụ., ya afọdụzie (N50m).

Mbọ BBC igbo gbara ịnụta ọnụ mmiri Jasmine amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ozi e zigara ya n'ekwentị.