Gịnị bụ ụlọikpe ụkwụ nke mba ụwa? Gịnị mere ha ji ekpe Izrel ikpe ogbugbu ọtụtụ mmadụ?

Ụlọikpe 'International Court of Justice'

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Aine Gallagher dere ya, ebe Mark Shea gụrụ ya
    • Ndị mere akụkọ a, Global Digital

Gịnị bụ Ụlọikpe Ụkwụ nke mba ụwa, gịnị meere ha ha ji ekpe Izrel ikpe ogbugbu ọtụtụ mmadụ nke a kpọrọ 'Genocide' na asụsụ bekee?

Ọ bụ umuwaanyi na ụmụaka kachasị nwụọ na agha Izrel busoro Gaza kemgbe agha ahụ jiri bido.

Ikpe ahụ ga-abụ ikpe ga-atụ ụwa n'anya.

Ndị ọkaiwu Izrel na okaiwu Saụt Afrịka ga-abanye ụlọikpe, ebe ụwa ga-anọ na nkiri.

A ga- ekpe-ikpe a n'ụbọchị 11 na 12 Jenụwarị nke afọ 2024.

Izrel a dara ịwụ ọgbụgbu ndị nne na ụmụaka ndị Palestine na obodo Gaza?

Saụt Afrịka kwụrụ na Izrel dara ịwụ mere ha jiri gbaa ha akwụkwọ na ụlọikpe ụkwụ nke mba ụwa niile, n'ụbọchị 29 Disemba 2023.

Praịam Mịnịsta Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na ha ji ụzọ nkwụmotọ eso Gaza.

Otu onye na-ekwuru Gọọmenti kwuru na akwụkwọ Saụt Afrịka gbara Izrel bụ akwụkwọ ụgha nke ọ kpọrọ '' Blood Libel'', nke kwuru N, ndị Jews na-egbu ndị ekperechi Kraịstị ma nwere ọbara ha gbooọgbu mgbe ochie.

Gịnị dị n'akwụkwọ Saụt Afrịka gbara Izrel?

Gaza

Ebe foto si, Getty Images

Saụt Afrịka kwuru na Izrel ji usoro ha maputara egbukpọọsị ndị Gaza bi na Palestine.

Izrel ji usoro ogbugbu na mmekpa arụ, na mmeghari uche na-emegide ndị Palestine. Ha na akọwa na okwu Mịnịsta Izrel kwuru gosiri na ha bu n'obi ị gbukpoọsị ndị Gaza.

Juliette Mclntyre bụ onye nkụzi iwụ obodo na mahadum 'University of South Australia,' kwuru na Saụt Afrịka dere akwụkwọ ha gbara Izrel nke ọma.

N'okwu ọ gwara BBC Mclntyre sịrị, ''Ọ gbadoro ụkwụ n'ịsa ihe ọbụla Izrel ga-ekwu, .. ma kwukwa maka arụmamaụka ma ụlọikpe ahụ enere ikike ikpe ya bụ ikpe."

'' Saụt Afrịka kwuru na ha na Izrel nwere mkparịtaụka mgbe dị iche iche maka oké ọgbụgbu ha na Gaza tupu ha wega ya ụlọikpe.''

Cheta na Gaza wakporo oke ha na Izrel n'ụbọchị 7 nke ọnwa Ọktoba afọ 2023.

Gịnị ka Izrel sara Saụt Afrịka?

Ụlọikpe mbaụwa

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuru Izrel bụ Elyon Levy kwuru na ha ga-eje ya bụ ikpe ma kpeta ọnụ ha.

Ha kwuru na ihe Gaza hụrụ bụ ihe ha tụrụ n'ahia.

Gịnị bụ '' Genocide''?

Ọ bụ ogbugbu ọtụtụ mmadụ na mba nke a ma ama mee. Oke ọgbụgbu a nwere ike i kpochapụ agbụrụ maọbụ kwụsị ọmụmụ n'mba ahụ.

' Genocide' bụ mpụ kachasị hia-arụ nkọwa n'ụlọikpe 'ICJ' n'ụwa niile.