Ezenwaanyị Elizabeth II: Ebe na mgbe a ga-eli ya

Ebe foto si, PA Media
A ga-akwa ozu Ezenwaanyị abalị anọ na Westminster Abbey n'ụbọchị mọnde bụ ụbọchị iri na itolu nke ọnwa Sepụtemba.
Oha mmadụ ga-enwe ohere ịọhụ agbati ozu ya.
Tupu nke a, a ga-edowe ozu ya n'ụloụka St Giles dị n'Edinburgh, awa 24 n'ụbọchị mọnde bụ ụbọchị iri naitolu nke ọnwa Seputemba, ebe ndị mmadụ ga-akwanyere ya ugwu
Ezinụlo ya, ndị ndọrondọrọ ọchịchị ba-abịa olili ya n'elekere 11:00BST n'ụbọchị ahụ, ọ ga-abụkwa ụbọchị ezumike ụlọakụ agaghị emepe.

Ebe foto si, Reuters
Site na Balmoral, Aberdeenshire, ebe ọ nọrọ nwụọ, igbe ozu ya nke osisi oak ga-aga Edinburgh n'ụbọchị sụnde a na-abịa, were nwayọ gawa Obieze nke Holyroodhouse n'elekere 16:00 BST.
N'ụbọchị mọnde, ya na ezinụlọ ya ga-eso gawa ụloụka St Giles dị n'Edinburgh n'ehihe.
A ga-akara ya ụka ebe a ebe igbe ozu ya ga-anọ awa 24 ka ndị mmadụ kwanyere ya ugwu ikpeazụ.
N'ụbọchị na-eso ya, nwa ya nwaanyị bụ Anne ga-eso ozu nne ya laghachi Lọndọn.
A ga-ebu igbe ozu ya site ọdọ ụgbọleu Edinburgh gawa Obieze Buckingham.
N'ehihe Wenesde, a ga-ebu ozu ya gaa Westminster n'elekere 15:00 BST.
A ga-ahapụ ozu ya na ndokwa abalị anọ site n'ụbọchị Tọzde tupu elie ya.
Ọ bụ n'elekere 11:00 n'ụbọchị 19 ka a ga-eli ya, a ga-eme ngagharị pụrụiche na Windsor Castle nke gụnyere 'Up Long Walk'.
A ga-eli ya n'ụlọụka King George VI Memorial Chapel dị na Windsor.
Eze ga-eme njem nleta mba
Tupu eme emume olili, Eze ọhụrụ ga-aga njem nleta na Scotland, Northern Ireland na Wales.
A ga-eru uju tutu rụọ ụbọchị a ga-eme olili dịka gọomentị si kwuo.
Ebe ndị ezịnụlọ Obieze ga-eru uju ụbọchị asaa ọzọ dịka elichara ya.
Westminster Abbey bụ ụloụka oge gboo bu ebe a na-enye ndị Eze na Ezenwaanyị mba Briten okpueze ha - kama emebeghị emume olilionye Eze kamgbe oge '18th Century".
Emume olili nna Ezenwaanyị, nna nna ya, nne mụtara nne nne ya, Ezenwaanyị Vicoria, n'afọ ndị 1900 bụ na ụlọụka St George dị na Windsor ka emere ha.
A ga-akpoku ndị ọchịchị mba ụwa niile ka ha bịa soro ezinụlo Obieze cheta ndụ na ọrụ Ezenwaanyị.
A na-atụanya na ndị ndọrọndorọ ọchichi, praịmmịnịsta na ndị bubu Praịm mịnista mba Briten ga-abia na ya bu emume a ga-egosi n'ihe onyonyo.
Ọ bụghi iwu na ndị mmadụ nwere emume ha ga-eme n'ụbochi ahụ dịka egwuregwu ga-akagbu ya, kama gọomentị na-adụ ọdụ ka ndị dị etua hiarịa oge ha hiwere emume ha ka ọ nye emume a ohere.
Akagburu maọbụ hiarịa ụfọdụ emume a chọburu ime dịka Ezenwaanyị nwụrụ.
Ehiharịri asọmpi Premier League, English Football League, nke Scotland nanke Northern Ireland gaa ụbọchụ Tuzde, ebe asọmpi nke Women's Super League, Women's Championship, Women's FA bụ nke akwụsịri kpamkpam.
Ụfọdụ asọmpi ọsọ inyinya bụkwa nke akwụsịrị, akwụsikwara egwuregwu okpọ na nke gọlf maka ya bụ ọdachi.
Akagburu abụbọ ọru akwadoro ịgba n'izuụka na-abịa ebe akagbukwara nzụko Trade Union Congress ha na-eme kwa afọ na Brighton.
Mgbe akpopụtara ya dịka Eze ọhụrụ na Obieze St James ka ọ nọorọ hiwe ụbọchị olili Ezenwaanyị dịka ụbochi ezumike nke ụloaku agaghi emepe.

Ebe foto si, Jonathan Brady/PA
Ak[popụtara Eze dịka nna ya nwụrụ kama ọ bu nzukoprivy council nke ndi ndọrọndorọ ọchịchị, ndị ọrụ na ndi ụkochukwu hiwere ya.
Ọ bụ klarkị Privy Council bụ Richard Tilbrook kpopụtara ya dịka Eze were sị "Eze, Onyeisi otu mba nke Commonwealth, onye nchekwa okwukwe", tupu otie mkpụ sị "God Save the King".











