Etu otu onye siri nwuo, ndị ọzọ merụọ ahụ n’ọgbakọ ime ụlọ APC na Rivas steeti

Akụkọ si Rịvas Steeti pụta taa bụ Wenezde, ụbọchị 18 ọnwa Mee, 2022 kọwara etu ọgbaghara siri dapụta n'Ọgbakọ ime ụlọ ndị patị All Progressives Congress (APC) na steeti ahụ.
Otu onye nọ ebe ahụ ihe mere na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ya bụ ọgbaghara tara isi otu onye ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Ka o si kwuo, ndị nkwado otu onye pati ahụ bụ sịnetọ Magnus Abe pụtara n'igwe malite ngagharịiwe n'akuku okporoụzọ Evo maka okwu ha sị bụ okwu Ikpe na-ezighị ezi nye nna ha ukwu bụ Abe.
Nwoke ahụ kwukwara na ndị mmadụ tuziri ha aka ka ha gaa n'ụlọọrụ APC nke steeti ahụ dị n'ụzọ Woji, GRA, Pọtakọtụ.
O kwuru:
"Mgbe anyị ruru ebe ahụ bụ ebe a na-eme ọgbakọ ime ụlọ APC anyị malitere igosi iwe anyị"
"Ọtụtụ ndị nchekwa jupụtara ebe ahụ ma gbuochie anyị ibanye geetị ụzọ ebe ahụ"
Ọ gara n'ihu kwuo:
"Ụfọdụ ndị ntorobịa so pụta ngagharịiwe ahụ malitere ịtụ ndị nchekwa karama nke kpasuru ha iwe"
O kwuru na ọ bụ mgbe ahụ ka ndị nchekwa malitere gbaliwe egbe elu nke mere ọsọ jiri taa.
Ọ kọwara na ndị nchekwa ahụ gbara egbe aghara aghara nke tinyere ha ụjọ n'ahụ.

"Mgbe ya bụ ihe dajụrụ, anyị huru ozu otu onye a na-eche azọgburu mgbe ọsọ tara"
Ndị nọ ebe ahụ kwukwara na ọgbaghara merụrụ ọtụtụ ndị nke ha ahụ.
Mbọ niile BBC gbarala ịnụ olu ndị uweojii na Rivas Steeti maka okwu a amịtabeghị mkpụrụ ugbua.









