'Ahụike ụbụrụ isi ihe ruru ndị uweojii 2000 na mba Kenya ezuchaghị oke maka ọrụ nchekwa' - Onyeisi ndị uweojii Kenya

Onyeisi ndị uweojii na Kenya bụ Hilary Mutyambai

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii na Kenya bụ Hilary Mutyambai

Onyeisi ndị uweojii na Kenya bụ Hilary Mutyambai ekwuola na nnyocha ime ahụ ha mere gosiri na ihe ruru ndị uweojii 2000 mba ha nweturu nsogbo ahụike ụbụrụ isi nke nwereike imetụta ọrụ ha.

Mutyambai kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị isi ụka dị ịcheịche ebe o kwuru na nchọpụta a tụrụ ha n'anya.

Aha onyonyo, Police Brutality: Etu mgbọ egbe ndị uweojii si egbu anyị karịa coronavirus

Ihe ruru mmadụ 100,000 nọ n'ọrụ nchekwa ndị uweojii na Kenya ugbua.

Akụkọ a so nnyocha ha mebụrụla nke kwuru na ọtụtụ na uweojii ha nwere nsogbu ahụike ụbụrụ isi nke ndatu ime mmụọ Bekeee na-akpọ 'Depression' nke na-akpalịtezị atụmatụ mmadụ ịchọ igbu onwe ya.

Mutyambai sị na ha amalitela ị gwa ndị uweojii nọ n'ọnọdụ dị etu ka ha kwụsị ọrụ ma kwuo na usoro nkwụsị ọrụ a adịghịrị ha mfe.

Ka o si kwuo, ọnọdụ ahụike ndị uweojii sọ n'ihe na-eche gọọmentị mba ha dịka ndị uweojii na-ebu ngwaagha nke nwereike ịmerụ ndị mmadụ ahụ ma ahụike ndị uweojii nọrọ n'ọnọdụ ọjọọ.

Mutyambai kwukwara na ndị uweojii mba Kenya ehibela ngabala nke ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi si n'aka ministri ahụike mba ha ga na-enyere ndị uweojii ha aka n'ọnọdụ a.

Aha onyonyo, Africa Eye: 'O nweghi onye ga-etigbunwu m n'Afrịka niile - Jane Mugo