Cubana Chief Priest: EFCC atọhapụla ya dịka otu izuụka gachara.

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Pascal Okechukwu bụ otimkpu a ma bụ onye ejikwa Cubana Chiefpriest mara enwerela onwe ya site n'aka ụlọorụ na-ebu agha megide mpụ bụ Economic and Financial Crimes Commission.

Chiefpriest depụtara nke a n'akara Instagram ya ma sị "EFCC anwaala m ma kwete, ezinaụlọ m unu emeela. Agaghị m echefu."

Ọ gakwara n'ihu kwuo "Ihe egbugbi m ga-eme ka sikwuo ike, biko zighachịrị m nụ m ozi ncheta ụbọchị ọmụmụ m."

Nke a na-abịa dịka akụkọ pụtara na Sọnde na-ekwu na EFCC nwuchiri nwamadị a n'Abuja kamgbe otu izuụka gara aga.

O nweghi onye maara nke bụ eziokwu maka ụlọọrụ EFCC ewepụtaghị ozi banyere nwuchi ya ruo mgbe ha tọhapụrụ ya.

Nke a mere aha ya 'Cubana Chiefpriest' jiri malite iwu na soshal midia n'ụtụtụ ụbọchị ụka 4 Eprel, 2022 maka akụkọ sị na ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ bụ EFCC nwuchiri ya.

Akụkọ sị na EFCC boro ya ebubo ibupu ego n'ụzọ na-ezighi ezi nakwa ịgbanahụ ụtụisi, mana BBC Igbo e nweghi ike ịkọwa ma ọ bụ eziokwu.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC bụ Wilson Owujaren, ọ zaghị, n'otu aka ahụ ekwentị Cubana Chiefpriest gbanyụrụ agbanyụ oge a kpọrọ ya.

Ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprel kwesịrị ịbụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Chiefpriest mana o nweghi ozi ọbụla o wepụtara na soshal midia banyere ya.

Kamgbe ụbọchị anọ gara aga o nwebeghi ozi ọbụla o wepụtarala n'akara Instagram ya bụ ebe ọ na-ewepụta ozi kwa mgbe kwa mgbe.

Cubana Chief Priest bụ onye na-ahazibu ụlọọrụ 'Cubana Group' nke gụnyere: 'Grand Cubana Hotel'; Rolex Hotel; Cubana Night Club; Pablo Cubana; Crave Cubana; Opium Cubana; Gustavo Cubana; Cubana Leisure na ndị ọzọ.

A nwuchiburu ya n'afọ 2020, maka ebubo na o ji ndị nchekwa uweojii '(Police Escort) eme ka o siri masị ya.

Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ị ma banyere 'Cubana Chief Priest'

  • A ma ya dịka onye na-eme ihe ego ma na-egosikwa na o ji 'nkụ' I ji maa atụ, o nyere enyi ya nwoke bụ Obinna Iyiegbu (Obi Cubana) ehi 46 oge ọ kwara nne ya n'afọ 2021.Akụkọ kwuru na o nwere ụgbọala ndị oke ọnụahịa dịka: Rolls Royce Phantom, Toyota Prado, Mercedes Benz G-class na Range Rover.
  • Cubana Chief Priest na-egosikwa akụnaụba ya nke ukwuu na soshal midia.
  • Ọ bụ onye Umuhu Okabia dị n'Okpuru Ọchịchị Orsu n'Imo steeti
  • O toro n'Aba, Abia steeti
  • Ọ gara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ dị elu, "Federal Polytechnic Nekede'.
  • O bidoro ndụ ya dịka onye na-arụ akpụkpọụkwụ na otiegwu mana ọ chakeghị rue oge ọ banyere n'ọrụ otimkpu na onye na-ahazị ụlọnkwarị ndị nwere agba
  • Ọ malitere ịhazi ụlọọrụ nkwarị nke Cubana Group.
  • O mechara malite ụlọrụ nkwarị nke ya ọ kpọrọ "Club Xhrine n'afọ 2020.
  • Ọ lụọla nwaanyị ma jiri ụmụ nwoke abụọ.

Akụkọ ndị ọzọ na-amasị :