You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Obi Cubana: Ihe mere akwamozu nne m ji dịka ebe a na-eme 'carnival'
Kemgbe akwamozu nne Obi Iyiegbu a ma dịka 'Obi Cubana', ihe ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ kedụ etu nwa amadị a sị kpaa ego ericha ericha nke na ndị enyi ya tụkọtara ya ehi ruru narị atọ.
Mana nwa afọ Ọba dị n'Anambra steeti akọwaala na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, na ya na ụmụnne ya tara ahụhụ tupu ha akpata ego.
Na mgbarịtaụka ya na BBC Pidgin nwere ụbọchị Tuzde, Obi Cubana kwuru na ya chọjuru ọrụ afọ ka ya gụchara mahadum, ya ahụghị, tupu mbọ ya na-agba n' Abuja mepere ya ụzọ.
'Na mbido, a mụghị m n'ikpo ego'
"A mụrụ n'Ọba, Anambra steeti. Nne m bụ onye nkuzi. Ụlọakwụkwọ anyị, 'Central School Oba' chere ihu n'ebe a nọ kwaa nne anyị.
"E mechara gaa DMGS, Onicha ."E mechara gaa mahadum 'Unversity of Nigeria Nsukka' bụ ebe ọ ga -atụ gị n'anya na m gụrụ 'Political Science."
"Anyị chọrọ ọrụ, chọọ ọrụ, akpụkpọụkwụ anyị kwọchacha, anyị bido rewe 'Mama put.'"
" Anyị lekwara 'Beer Parlour'na Garden Abuja tupu El-Rufai bịa kụkpọ ihe niile. Anyị gbara aka mana mecha mepe Ibiza nke mụtara Cubana."
" Oge anyị nọ na Garden, m̀ụ na ụmụ nane na ndị eji bi n'otu ọnụụlọ na Zone 4, Abuja. Ebe anyị na-atọgbọ matras n'ala nkịtị , mmadụ isi n'otu ọnụ ụlọ."
Ọ bụ ebe ka anyị nọ na-agba mbọ si ebe ahụ mụba mepe na Pọtakọt, Czechoslovakia, na Legọs. Mana ụfọdụ n'ime anyị kwechiri n'Abuja si n'ebe a ka anyị ka ga-ahụ isi ije anyị."
Obi Cubana nwere ụllọ oriri na nkwarị Bekee kpọrọ club'n'ebe dị iche iche na Naijiria nakwa mba dị ọzọ ma na-anọchitekwa anya mmanya Bekee dị oke ọnụ na Naijiria.
'Ihe mere ka akwamozu nne m ji dịka ebe a na-eme carnival'
Ewu na ọkụkọ gwụrụ n'ụlọ n'akwamozu nne Obi Cubana.
Anaghị ekwuzị okwu ehi e jiri bịara ya akwamozu. ego e fere ebe ahụ dịka akwụkwọ ụkpaka dịka ndị enyi ya na ndị ihe ya na-amasị na-elu ya ego ma na-efekwa ndị ọbịa bịara n'akwamaozu nne ya.
Iyiegbu kọwara ihe meere na akwamozu ya ghọrọ oriri na ọnụnụ kpọtụrụ akpọtụ.
"Ihe mere n'akwamozu nne m bụ na anyị kwere ya nkwa na ọ bụrụ na o rue afọ 80s, na anyị ga-emere ya mmemme pụrụ iche."
"Mana ọ nwụọ tupu ọ gbaa ya bụ 80 anyị wee were ike anyị jibu a kwadoro ya mmemme ncheta ọmụmụ ya were kwaaa ya. Ya mere o ji dịka akụkọ ya ọ na-ewu ebe niile."
"Enwere m anụrị n' ihe mere n'ihi na ọ bụ ihe ọma mere n'Ọba nakwa Anambara steeti. Ọ bụghị na e jidere m n' ebe m na-ezu ohi maọbụ na-emebi aha Naijiria."
"Anyị amaghị na ya bụ akwamozi ga-ekworu etu ahụ. Ụmụnwoke niile ị hụrụ n'akwamozu a bụ ndị nnukwu mmadụ maara ihe ha na-eme n'achụmntaego maọbụ akaọrụ ha."
"Kedụ ka m ga-esi agwa ha wụwa m ego? Ọ bụ ego ha, ọ bụghị m ga-agwa ha etu ọ ga-esi mee ego ha kpatara."
"Ọ bụghị ego mere n'Ọba, ọ bụ obioma ndị mmadụ nwere ebe anyị nọ, ego mere n'Oba abụghị ihe ego nwere ike igoli."
"Ego enweghị ike igoli ya. A nụghị akụkọ na awakporo nwaanyị, o nweghị onye e zuru ụgbọala ya."
"Ihe ọ bụla ị na-eme e jila ndị mmadụ egwu egwu. Ọ bụ ndị m̀ụ na ha maara tupu a nụwa aha ezinaụlọ anyị mere ihe nile a ị na-ahụ."
'Ụkọchukwu maọbụ dịbia apụghị ịbawa gị ọgaranya'
Iyiegbu kwuru na ọ bụ onye na-agba mbọ, na-arịọkwa Chukwu amara , o nweta ngọzị.
"Ụkọchukwu agaghị enye gị ego n'ihi na ọ bụ ya ka ego kachasị dị mkpa. Dịbịa agaghị enyenwu ego n'ihi na ya onwe ya ụmụ ya na-echu mmiri n'iyi.
"O nweghị ncha a na m ebenye onye ọbụla, gbaa mbọ, na-ekpe ekpere , na-emeso mmadụ ibe gị obi ọma,Ngozi ga-ezute gị."