You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E- Money: Kedụ ihe ọ na-eri inweta 'police escort'?
Emeka Okonkwo bụ onyeisi ụlọọrụ 'Five Star Group' e ji 'E-Money' mara enweghịzị ndị uweojii na-echekwa ka ọ dị na mbụ dịka Onyeisi ndị Uweojii bụ Mohammed Adamu nyere n'iwu ka a napụ ya ndị nchekwa a.
Adamu,onye kwuru na E-money ji ndị uweojii nchekwa e nyere ya were na-eme 'bọị-bọị, dịka ha na-ejidere ya ncheanwụ ma na-ebudoro ya akpa, nyekwara iwu ka e nyochaa etu e-money si akpata ego.
E-Money, onye Uli n'Anambara steeti bụ onye na-akwado egwu nke Bekee kpọrọ 'music promoter'.
Ọ bụ ya nwee ụlọọrụ bụ "5-Star Music bụ ebe ndị otiegwu dịka Harrysong na SkiiBii nwetara nkwado were wepụta egwu ha.
E bidoro kpọwa 'E-money' maka etu o si eji ụlọ kara aka, ụgbọala dị oke ọnụ na ihe enweenwe ndị ọzọ egosi ọgaranya na soshal midia.
E-Money bụ nwanne otiegwu a ma ama bụ KCee( ezi aha ya bụ Kingsley Okonkwo ) nke tiri egwu, 'Limpopo' na egwu ndị ọzọ.
A makwa E-Money dịka onye na-atụbata ahịa nakwa onye na-enyere ndị mmadụ aka nke Bekee kpọrọ 'philantropist.'
E-Money lụrụ nwaanyị ma jide ezinaụlọ.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Bala Elkana o kwuru sị n'ezie na ha nwetara ntụzịaka site n'isi ụlọọru ndị uweojii ka ha wepụ ndị uweojii na-echekwa E-money.
Kedụ ihe ọ na-eri ndị uweojii inye gị 'escort'?
Onye ọbụla bụ nwa afọ Naijiria na-enweta nchekwa ndị uweojii dịka ndị uweojii na-agagharị n'ogbe ọbụla ịhụ na obodo deere jii.
Mana o nwere ndị a na-enye ndị uweojii maka nchekwa pụrụ iche n'ihi ọkwa ha nwere.
Ndị a gụnyere onyeisiala,ndị gọvanọ, onyeisi Ụlọomeiwu Nta na Ụlọomeiwu Ukwu wdg.
Mana onye abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ike inweta ndị nchekwa pụrụ iche n'aka ndị uweojii.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n' Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe si kọwaa, tupu ndị uweojii enye mmadụ ndị ọrụ ha ga na-echekwa ya , onye ahụ ga-ebuụzọ detara ha akwụkwọ.
Ndukwe sị, " " I ga-etinye akwụkwọ, kwuo ihe iji chọọ ya tupu enye gị ya."
Ọ gara n'ihu sị na "ọ bụghị onye ọbụla gbabatara n'ogige ndị uweojii enye ya nchekwa, ọ ga-enwerịrị ihe kpatara ya."
"O nwere ike ọ bụrụ na ndụ gị nọ n'ihe egwu maọbụ dịka ụlọakụ, i nwere mkpa nchekwa pụrụ iche."