You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Liverpool Vs Barcelona: Ihe tụrụ n'anya ndị mmadụ mara aka mere
Akụkọ ihe mere dịka Liverpool nyụrụ Barcelona ịkpakwụ n'abalị Tuzde agwụbeghi dịka ndị mmadụ ndị mara aka maka mpụtara asompi ahụ mere n'Anfield na-emezu ihe e riri ha.
Otiegwu Kcee tụnyere otu nde naịra n'aka ya na otu onye na-akwado Liverpool a kpọrọ Chidozie mara banyere onye ga-emeri n'asọmpi ahụ.
Tupu a gbaa bọọlụ ahụ nke Liverpool jiri ọkpụ anọ kụọ Barcelona ekwe, Kcee turu ọnụ na Barca ga-akụ Liverpool isi aba okpu mana ọ bụghị ihe ọ tụrụ anya ka ọ hụrụ.
Chidozie mechara gbaa akaebe na ozi e ziri anwụrụ ọkụ eruola eluigwe ntị dịka ọ natara ozi n'ekwentị ya na Kcee akwụnyela ya otu nde naịra ahụ ha mara aka ya.
N'aka nke ọzọ, Charles Anazodo bụ onye ntaakụkọ egwuregwu a ma ama, tuburu ọnụ na ọ bụrụ na Liverpool merie Barcelona na ọ ga-eyi ọbante gaa ọrụ.
O mezukwara nkwa ahụ dịka ọ sụrụ ọbante nke Bekee kpọrọ 'boxer' gaa ọrụ taa bụ Wenezde.