You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Barcelona vs Man United: A fọjuola Man Utd ose Nsukka n'ọnụ
Ekwe kụrụ ndị Manchester United n'isi ka ndị Barcelona gbakọrọ aka tee ha ure n'ọgbọegwuregwu Nou Camp.
N'ime ọkara nke mbụ, Lionel Messi ji ọkpụ goolu abụọ kara aka dọkaa neetị David De Gea ka ọ bụ dike ọgụ n'agha na nkeji 16 na 20.
Man Utd malitere ọfụma ka egwu bidoro, kpatu ike ka ndị chị ọkụ bịa, mana isi ha apụtaghị.
Barcelona zuru ndị Man Utd ike n'ahụ, iji gwa ha na ha anabataghị ha n'azụ ụlọ ha ka ha bịa were ha gwuo egwuregwu.
Na-erughi nkeji iri abụọ e ji malite ọkara nke abụọ, n'ime nkeji 61, Philippe Coutinho si n'ezi igbe goolu fanyere De Gea "aka eru".
Alexis Sanchez nke Man Utd nwara ike ya iji isi takpuo bọọlụ na nkeji 90, mana Marc Andre ter Stegen bụ ochegoolu Barcelona sị ya "ọ bụghị taa".
Etu ọ dị ugbua, a gbaalara Manchester United ụgbọ nwamkpi isi na Champions League pụọ.
Ebe Barcelona ga-ezute onye meriri n'etiti Liverpool na Porto, n'agba nke ọkara-ikpeazụ.
Chee aka ghọrọ ihe ga-eme mgbe ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị: