You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Peter Obi: 'E nweghị m obi nkoropụ ọbụla'
Kepukepu anyị nụrụ maka Peter Obi kwuru na "obi koropuru ya ma kwuo na ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ".
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'ekwentị ịmata nke bụ eziokwu, Peter Obi kwuru na ọ bụ ya bụ onye ikpeazụ obi nkoropu ga-eme makana ọ ka ga-adị ndụ wee kwuo okwu gbasara ọdịmma Naịjirịa.
Gịnị butekwaranụ okwu a?
Peter Obi kwuru na ọ gwara ndị ya na ya nọ na ọ chọrọ ịga mee nyocha ahụ maka ọrịa ịba, ha asị ya ya gaa obodo oyibo gaa mee ya.
O kwuru na ọ ga-aga Onịcha gaa mee ya makana Naịjirịa ka nwere ezigbo ụlọọgwụ ebe mmadụ nwereike ịnata ọgwụgwọ zuru oke.
O kwuru na ọ bụ ndị iro ya buuru ya bụ mkparịtaụka gaa tụgharịa ya n'ụzọ ọzọ.
Ebee kwanụ ka ị nọ ugbua?
Obi kwuru na otebeghị aka ọ wụturu n'ụgbọelu maka njem ịga n'ụlọikpe gere ikpe gbasara ntuliaka 2019 pati ya kpesara n'ụlọikpe.
N'elu Twitter, anyị hụrụ foto ndị a gosiri na Peter Obi nọ n'ụlọikpe dịka o si kwuo.
Gịnị bụ olileanya gị maka ikpe ntuliaka onyeisiala?
Obi gwara BBC Igbo na ọ naghị etinye ọnụ n'ihe ọbụla gbasara ụlọikpe makana ọ ma na ha ga-eme ihe ziri ezi.