You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
LGs and NFIU: Ego gọọmentị ọ kwaala okpuruọchịchị na-enweghi onyeisioche?
Dịka NFIU kwuru na ndị gọvanọ na Naịjirịa ga-esepu aka n'ego ọkpụrụochichi dị na steeti ha.
BBC Igbo kpọrọ onye ọkaiwu ka ọ kọwaa etu ihe ga-esi metụta okpuruọchịchị ebe enweghi onyeisioche na-anọchite anya ha.
Onye ga na-eketa ego n'aha aha? Ka ọ pụtara na ego gọọmentị agaghị eru ha aka?
Chima Nnaji kwuru na ọ dịrị ndị ụlọọrụ Inec na steeti dị icheiche ịhazi ma manye ntụliaka ga-ahọpụta ndị isioche ebe ahụ.
O kwukwara na tupu a họpụta ndị ahụ, na o nwere ụfọdụ ndị nwereike ịketa ego maka okpuruọchịchị ndị ahụ.
Ndị ọ kpọrọ aha bụ ndị ọdeakwụkwọ kachasị nakwa ndị isi na-achịkọta ndị ọrụ okpuruọchịchị ahụ.
Cheta na ngalaba ọhụrụ ehibere maka etu ego si agbasa na Naịjirịa nyere iwu ọhụrụ ka ndị gọvanọ sepụ aka n'ego ndị okpuruọchịchị.