You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Election Results: Atiku meriri Buhari n'Aso Rock
Lee ihe ndị dị mkpa pụtara na ntuliaka taa.
1. Atiku meriri Buhari n'ọgbọ ntuliaka Aso Rock
Ọnụọgụgụ ya APC - 1013 PDP - 1030
Otu PDP jiri ihe ruru vootu 17 merie APC n'ọgbọ ntuliaka nke Aso Villa.
2. PDP meriri n'ọgbọ ntuliaka Peter Obi
Ọnụọgụgụ mpụtara ya bụ: PDP - 258 APC - 1
Akụkọ na-ekwu na Peter Obi bulatara ọgbọ ntuliaka ya dị Agulu ebe otu ya bụ PDP meriri.
3. Onyeisiụlọntaakụkọ 'Sahara Reporters' meriri ọgbọ ntuliaka ya.
Ọnụọgụgụ ya bụ AAC - 208 APC - 82 PDP - 11
Omoyele Sowore meriri n'ọgbọ ntuliaka Kiribo dị n'Ese-Odo n'Ondo steeti.
4. A ka na-agụkọ vootu n'okpuruọchịchị Ụmụahịa
5. INEC akagbuola ntuliaka n'ọgbọ ntuliaka abụọ na Rivas steeti.
N'ihi ọgbaghara malitere n'ụfọdụ ebe nke tara isi ihe karịrị mmadụ abụọ, Inec bugharịrị ntuliaka ebe ahụ.
Ebe ndị mbugharị a metụtara bụ okpuruọchịchị Akuku-Toru nakwa nke ndị Bonny.
6. Ụfọdụ ndị Igbo bi na Legọs gabigara ntaramahụhụ tupu ha atụọ vootu ha.
N'ụfọdụ ebe e jiri mara ndị Igbo na Legọs, ọgbaghara dabara ya.
Ha gụnyere Okota, Aguda, Lafia, Alaba nakwa ụfọdụ ebe n'Ajegunle.
Ndị gwara BBC Igbo okwu kwuru na ndị agboro sị ha "laa n'obodo gị gaa tụọ vootu."