You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị mkpa na mgbede a: Ụmụ ntorobia Rivas agharala iwu ndị uweojii
Ihe ndị dị mkpa na mgbede a:
Ụmụ ntorobia na Pọtakọtụ dị na Rivas steeti agharala iwu ndi uweoji ma pụta ị gba bọọlụ na okporo ụzọ.
Ndi uweoji nyere iwu sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka ntuliaka ọkwa local goomenti na-aga na steeti ahụ.
Ụfọdụ ndị ntorobia ahụ kwuru na ihe a tụrụ na ntuliaka ahụ agbasaghị ha
Ọzọ na Naịjiria,
Otu APC ndị nọ na Delta steeti akatọọla ọchụchụ a chụrụ ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọala a kpọrọ Delta Line.
Moses Kamnaya bụ ọnụ na-ekwuchitere APC na Delta kwuru na ọ bụ ihe mwute na ihe ruru mmadụ narị ise na iri isii na asatọ enweghịzị aka ọrụ ha na arụ.
Na mba Ofesi taa
Ndị agha Taliban na ndị nchekwa mba Afghanistan tọgbọrọ ngwa agha ha makụọ onwe ha taa.
Ha mere nke a ị ji gosi udo dị n'etiti ha abụọ ma mekwa mmemme dị na mmechị ọnwa Ramadan na obodo ha.
N'isi okwu ndị asọmpị dị ịcheiche taa
Ajentina na Iceland agbaala onwe ha onye laba onye laba
Peru na Denmark na aga niru
Ebe Naịjiria ga ezuta mba Croatia taa na njem ị bute iko mba ụwa
Unu adịkwa njikere?
Gee nkeji nke mgbede anyị ebe a:
Ihe onyonyo nke taa