You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Eji m egwu Egara achụ ndị mmadụ obi ịdamba, ọbara mgbalielu na obi mgbawa - Ada Egara Nsukka
Dịka omenala Igbo ji ọsịsọ ala n'ụfọdụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Blessing Chidiebere Emmanuel chọpụtara ụzọ ọ ga-esi mee ka egwu Egara ka nọdụsie ike.
Ọ sị na ọ bụ ka di ya nwụrụ n'afọ 2017 ka ya malitere ịgụ egwu Egara iji kasie onwe ya obi.
Ọ sị na oge ọbụla ya hụrụ onwe ya n'ọnụdụ ahụ, ya agụwa egwu Egara, nke mere ka ndị mmadụ na-akpọ ya ka ọ gụọrọ ha ya bu egwu.
Ugbua, ọ na-aga ebe mmemme agụrụ ndị mmadụ egwu Egara.
Lee etu o siri kọọ akụkọ ya.
Ndị mere akụkọ: Chris Okereke, Chiemela Peters na Vining Ogu.