You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ikeogu Oke: Etu ndị na-ede mbem si echeta ya ugbua
BBC Igbo chọpụtara na Ikeogu Oke dị afọ iri ise na otu nwuru n'ụbọchị 24 Nọvemba n'Abuja ebe ọ na-anata ọgwụ maka ọrịa kansa Ayịnya (Pancreatic cancer).
Cheta na Oke bụkwa onye turu ugo ndị ụlọọrụ Nigeria Liquified Natural Gas mụpụtara dịka onye kachasị ede mbem nke afọ 2017.
Ndị ihe ọ na-ede na-amasị apụtala na soshal media na-eto ndụ ọma o biri.
@martin_ijir n'elu akara ya na Twitter dere na mbem na-eto nnukwu mmadụ Oke bụrụ
@chikaunigwe dere na Oke nwere obi ọma.
@jekwuozoemene chetara onyeọbụla na Igbo nwere nkwenye na mmadụ anaghị anwụ anwụ na ọ bụ njem ka onye ahụ na-aga.
@BuraBariNwilo dere na ọgaghị echefu ihe ọma niile Oke dere.
Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye kachasị ede mbem na Naịjirịa nke a kpọrọ "Nigerian Prize of Literature" maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ "The Heresiad".
Ihe mere akwụkwọ ahụ ọdị iche bụ na o dere ya n'usoro ndị Igbo ji agụ mbem.