You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ngagharịiwe ndị Katọlik: Ka o si ga
Ndị Katọlik na Naijiria niile mere ngagharịiwe iji gosi obi mwute ha maka oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naijiria.
N' ọnwa Epreelụ, ndị e chere na ha bụ ndị Fulani ọchịehi gburu ndị ụkọchukuw abụọ na ndị ụka Katọlik iri na asaa ndị Fulani ọchịehi gburu na Benue.
Ọgbakọ ndị Bishọp gwara ndị ha na-achịkọta ka ha mee ngagharịiwe taa dịka a na-eme emume akwamozu ndị ahụ nwụrụ taa bụ Tuusde na Benue.
N' okwu ya oge o du ndị ụka kaolik na ngagharịiwe, Bishọp ụka Katolik na Port-Harcourt bụ Camilus Etokudoh kwuru oke mkpa ndụ mmadụ dị ma katọọ oke igbu mmadụ.
O kwuru na ngariiwe ahụ abụghị maka okwu ndọọndọrọ ọchịchị.
"Ndị ọchịehi ewegharala ọtụtụ ala anyị dịka anyị gara n'ihu na edegara onyeisiala Buhari akwụkwọ maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa."
N'Enugwu, ndị nne, nna, ụmụaka na ndị chiri echiche n'ụka pụtara n'igwe maka ngagharịiwe.