You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Yoruba Nation rally: Nchọpụta egosila na ọ bụ mgbọ egbe tugburu nwa agbaghọ nwụrụ na ngagharịiwe e mere n'Ojota
Nchọpụta e mere ozu Jumoke Oyeleke bụ nwata nwagbọghọ nwụrụ na ngagharị nnwereonwe nke 'Yoruba Nation' mere na Legọs n'izu ole na ole gara aga egosila na ọ bụ mgbọ egbe tụgburu ya.
Ndị uweojii Legọs site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Olamuyiwa Adejobi, gọburu na aka ha adịghị n'ọnwụ nwata nwaanyị ahụ na-ere ihe dị afọ 25 bụ onye e gburu n'Ojota dị na Legọs Satọde abalị atọ nke ọnwa Julai afọ 2021.
Mana Akwụkwọ nnyocha e mere ozu ya n'ụlọgwụ 'Lagos State University Teaching Hospital' (LASUTH), Ikeja, nke Dkta Soyomi binyere aka kwuru na ọ nwụrụ site "ọbara kpụkọrọ ya n'obi, ngụ na mmerụahụ sitere na ngwa ọgụ n'obi ya".
Yoruba Nation Rally : Ndị Uweojii agọọla na ha egbughi nwata dịka ha chụsasịrị ndị pụtara ngagharị nnwereonwe na Legọs
Ndị Uweojii agọọla na ha egbughi nwata dịka ha chụsasịrị ndị pụtara ngagharị nnwereonwe na Legọs
Ndị ntaakụkọ kwuburu na afụrụ ozu nwata nwaanyị ahụ ma hụkwa na afọ ya gbawara agbawa.
Mana ndi uweojii sị na ọ nnyocha mbụ ha gosiri na ozu nwata ahụ agbụghị nke ọhụrụ. Ha sị na ọbara dị ya n'ahụ akọọla "nke gosiri na ọ bụghị nsonso ka e gburu ya".
Ọ bụ Olumụyiwa Adejobi bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs binyere aka n'ozi a.
Ọ sị na onweghị mgbọ egbe ọbụla ha gbara n'oge ha na-achụsasị ndị pụtara eme ngagharị iwe a na Legọs Taa.
Cheta na ndị nachọ nwereonwe mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa pụtara ya bụ ngagharị iwe dị olemole, ma ndị uweoji pụtara n'igwe, nwere akụrụngwa egbe mmiri na anwụrụ anya mmiri chụsasịa ha.
Chetekwa na-agbanyeghị na ndị uweojii pụrụ iche a na-akpọ DSS, wakpụrụ be Sunday Igboho onye bụ onyeisi ndị otu a na ụbọchị Tọọzde ebe ha tiri iwu na ya bụ nwoke bụzị onye ala Naijiria na-acho acho. Na ozi ndị DSS, ha kwuru na mgbe ha gara njem mwakpụ a, ha kpụrụ mmadu iri na ato ndị otu ahụ nọ na be nwoke a, ma na bụpụkwa ngwa agha ndị ọzọ ha hụrụ na be ya.
N'ozi ndị otu a zigara Legos Steetị gọọmentị nakwa ndi uweojii site n'aka onye ode akwụkwọ na okaịwụ ha bụ Arc. George Akinola maka ya bụ ngaharị iwe ha kwuru:
"Anyi ji udo a bia, anyi anaghi emebi ihe obula, anyi na arịọ gọọmentị , makwa ndị uweojii ka ha kwado atụmatụ anyi ime ngahari a"
Mana ndị uweojii sara ha site n'aka Kọmịshọna ha bụ Hakeem Odumosu, kwụọ na ha agaghị anabata ya bụ ozi. Hakeem kwuru na Legọs Steeị achọghịzị emụme ngahari iwe obula na Steetị ahụ dịka ndị ọmekọme n'esị n'aka ya bụ atụmatụ emebisi ihe.
N'ozi ya Kọmịshọna ahụ kwuru:"Anyi achọghị ihu ogbako ndị otu obula na ọgbọ Gani Fawehinmi Freedom Park"
Chekuwa na ọgbọ a bụ ebe ndị otu a kwuru na ha ga eme ngaharị iwe ha taa bụ Satụde.
Dịka a wakpụrụ be onyeisi ndị otu a bụ Sunday Igboho, o zịpụtara ndị ntaakụkọ BBC Pidgin ozi n'ụbọchi Tọọzude kwụọ na ya ga akagbu ya bụ atụmatụ ime ngahari iwe ahụ.