Femi Fani-Kayode na Precious Chikwendu: Gịnị na-esere di na nwunye a?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Esemokwu dị n'etiti Femi Fani-Kayode na nwunye ya bụ Precious Chikwendu abụghịzi ihe a na-ezo ezo.

N'ọnwa Sepụtemba afọ 2020 ka akụkọ fesara na mmadụ abụọ a agbasaala, mana n'ọdị nso a ka Chikwendu gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ka e kewaa agbamakwụkwọ ya na Fani-Kayode, bụ onye jibu ọkwa Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa.

Ha abụọ mụrụ ụmụ anọ, nwoke nwoke.

Gịnị na-ese?

N'akwụkwọ ahụ Chikwendu gbara n'ụlọikpe, o boro Femi Fani-Kayode ọtụtụ ebubo.

  • O kwuru na Fani Kayode ji ya mere ịgba, na-akụ ya oge ọbụla dị ya mma
  • Chikwendu kwuru na Fani Kayode tiri ya ihe ugboro ugboro oge o bu afọ ime nke mbụ na nke abụọ ya
  • O kwukwara na ọ na-emenye ya ihere maọbụ gbaa ya ọtọ
  • "Enwere m ihe onyonyo nakwa okwu ọnụ iji gbaa akaebe ihe m na-ekwu," Chikwendu dere n'akwụkwọ o gbara n'ụlọikpe.

Chikwendu kwuru na ọ chọrọ ka ụlọikpe kpọnye ya ụmụ ya, ma nyekwa iwu ka Fani-Kayode na-akwụ ya nde naịra atọ na ụma ise kwa ọnwa iji leta ha anya.

Ihe Femi Fani-Kayode sara

N'ụbọchị Satọde, Femi Fani-Kayode wepụtara akwụkwọ ozi ebe ọ nọrọ kwuo na ebubo niile Chikwendu boro ya bụ asị asị.

Akwụkwọ ozi a si n'aka onye enyemaka mgbasa ozi Fanị Kayode bụ Oladimeji Olaiya, kwuru sị:

  • "Onweghị mgbe Fani-Kayode tiri nwunye ya kpam n'ahụ."
  • "Onweghị mgbe o tiri ya ihe oge ọ dị ime."
  • "Ọ bụ Chikwendu ji aka ya kwara ihe ya pụọ, n'agbanyeghị na onye ọbụla na-arịọ ya biko ka ọ nọrọ."
  • "Ọ bụ Fani-Kayode jụrụ na ọ gaghị alọghachi azụ n'ụlọ ya."
  • "Ọ bụrụ na akpọnye ya ụmụaka a, ọ ga-abụ itinye ha n'ize ndụ."

Olaiya kwuru na ha nwere ihe akaebe ha ga-egosi n'ụlọikpe iji gosi na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu.

Amabeghị mgbe a ga-ekpe ikpe a.

Onye bụ Precious Chikwendu nwunye Fani-Kayode?

Akụkọ na-ewu ugbua bụ na Precious Chikwendu na di ya bụ Femi Fani-Kayode agbaala alụkwaghịm.

Akụkọ a malitere iwu n'ụbọchị Tọọsde mgbe Precious dere ngụpụta akwụkwọ nsọ n'Instagram ya.

Nke mere otu ngalaba mgbasaozi n'ịntanet bụ 'blog' ji dee sị na o kwuru na ọ sị na ya na di ya agbasaala.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ maara Fani-Kayode amaghị onye bụ nwunye bụ Precious Chikwendu Fani-Kayode.

Ihe i kwesịrị ị ma maka Preciuos Chikwendu.

  • Precious Chikwendu bụ nwada Igbo si Anambra Steetị.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 25 ọnwa Mee nke afọ 1989 n'ime ezinaụlọ ụmụaka asaa nke ọ bụ nwa nke abụọ.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n'ụlọakwụkwọ Makurdi International na nke Sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ ECWA dị chaa na Benue Steetị.
  • Ọ gara mahaudum Calabar dị na Cross Riva Steetị ebe ọ gụrụ maka gburugburu ebe obibi (ngalaba nchekwa ọhịa na ndụ ụmụanụmanụ).
  • Ọ malitere ime ngosi uwe a kpọrọ 'modelling' n'afọ 2006 ma turuugbo n'ihe ngosi a kpọrọ 'Miss United Nation n'ọnwa Juun, 2014.
  • Precious Chikwendu Fani-Kayode nwere ụlọọrụ na-ere akwa a kpọrọ 'Glowria Snow Fashion House'.
  • Ọ lụrụ Femi Fani-Kayode ma mụtara ya ụmụnwoke anọ gụnyere ụmụ ejima atọ ọ mụrụ n'ụbọchị 25 ọnwa Mee afọ 2018.

Na nzaghachị n'akụkọ ịgba alụkwaghịm ha, di ya bụ Fani-Kayode agbaala ụlọ mgbasaozi ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe maka imetọ aha ya.

Nke BBC maara ugbua bụ na Precious na di Fani-Kayode apụtabeghi kwuo na ha agbaala alụkwaghịm.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: