You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nasir El-Rufai: Ịpị amụ na ogbugbu bụ ihe chere onye dinara nwata n'ike na Kaduna
Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steetị etinyela aka n'iwu ga-eme ka a pịa nwoke ọbụla dinara nwaanyị n'ike nakwa wepu akpa nwa nwaanyị dinara nwata nwoke n'ike.
Iwu ọhụrụ a pụtara na ntaram ahụhụ dịịrị nwoke maọbụ nwaanyị dinara nwata n'ike ga-abụ ịpị nwoke nakwa iwepu akpa nwa nke nwaanyị.
A ga-ebipụta aha ndị dị etu a n'akwụkwọ mpụ na nrụrụaka nke mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke ọkaikpe steetị ga-etinyeaka na ya.
Site n'itinye aka n'iwu nke Gọvanọ El-Rufai mere n'ụbọchị 11 Sepụtemba, nke a pụtara na ọ bụrụ na iwu na Kaduna Steetị.
Iwu a sibu na ọ bụ nga afọ 21 ka onye dinara okenye n'ike ga-aga, ma sịkwa na onye dinara nwata n'ike ga-aga nga ruo oge ọ nwụrụ.
Mana, mmegharị iwu ahụ kpebiri na onye dinara onye gafere afọ 14 zute ịpị amụ maọbụ iwepu kpa nwa.
Mmegharị ọzọ bụkwa itinye na onye dinara nwata n'ike ga-enwete ikpe ọnwụ.
Gọvanọ El-Rufai kelere ndị Omeiwu Kaduna maka iwu ha binyere aka, ma kwuo na iwu tara akpụ ga-enye aka chekwa ụmụaka na steeti ahụ.
Ihe ndị nọ n'iwu ọhụrụ a gụnyere:
- 1. Onye nwoke ọbụla dinara nwata nwaanyị maọbụ nwoke dị n'okpuru afọ 14 n'ike, a ga-apị amụ ma gbuo ya
- 2. Onye nwaanyị ọbụla dinara nwata nwoke dị n'okpuru afọ 14 n'ike, a ga-ewepu akpa nwa ya ma gbuo ya
- 3: Nwoke ọbụla dinara nwa nwoke dị n'okpuru afọ 14 ga-enwete ikpe ọnwụ
- 4. A ga-etinye aha onye ọbụla ikpe mara maka ajọ agwa a n'akwụkwọ bu aha ndị na-akpa ụdịrị agwa a
- 5: Ya bụrụ na onye edinara n'ike gafere afọ 14, a ga-apị amụ onye ikpe mara ma tụọ ya nga ebiebi
- 6: Ya bụrụ n'onye ikpe mara bụ nwata, a ga-eji usoro dị n'iwu Bekee kpọrọ "Children and Young Person Law Cap 26 Laws of Kaduna State 1991" maa ya ikpe
- 7: N'ikpe ikpe banyere idina nwata n'ike, ụlọikpe na ndị ọrụ ahụike ga-ejikọ aka ebe ọ masịrị.