Ịkpa oke agwa: Ọ na-akara ụmụnwaanyị ndị isiojii dị ọcha mfe n'ọrụ ihe nkiri?

    • Onye dere ya, Cherry Wilson
    • Ndị mere akụkọ a, Newsbeat reporter
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Rihanna, Beyonce, Cardi B, Stefflon Don, Maya Jama, Mabel, Zendaya na Adwoa Aboah.

Ndị a bụ ụfọdụ ụmụnwaanyị nọ n'elu ihe ha na-eme n'ụwa niile gbasara ihe nkiri n'afọ 2018.

Mana agamnihu ha mkpụrụ ole bụ maka agwa ahụ ha?

Ụfọdụ ụmụnwaanyị isi ojii ekwuola na ndị dị ọcha n'ime ha na-aka aga n'ihu ọsịsọ maka ịkpa oke agwa.

Ịkpa oke agwa bụ ekworo megide ndị dị ojii na/maọbụ ịka meta ndị dị ọcha n'otu agburu ahụ nke ọma.

Ọ bụ otu ihe onye a ma ama bụ Lioness kwuru na ya gabigara.

Ọ gwara Newsbeat na ọ kwụsịrị ịgụ egwu afọ asaa ma otu ihe so n'ihe o ji kwụsị bụ maka ekworo a na-ekwosa ya maka na agwa ahụ ya dị ojii.

"A$Rs [ndị na-achọ ndị nwere onyinye pụrụiche] ga-ekwu ihe dịka: 'Ọ kara ịka mma ma ọ bụrụ na ọ dị ọcha' - okwu ahụ enweghi dị m isi na ntị.

"Ama m ihe ha na-achọ ikwu, ọ bụrụ na m dị ọcha, akara m ịka gaa n'ihu.

"E bido na-agwa gị ụdị ihe kwa nkeji ọbụla, ma m bụ obere nwa oge ahụ, ọ masịghị chaa.

"M wee kwụsị ime ihe m hụrụ m'anya maka ndị mmadụ gara n'ihu na-ekwu maka agwa ahụ."

'Ohere ndị dị ọcha'

Okwu gbasara ịkpa oke maka agwa ahụ bolitere ọhụrụ oge Maya Jama kwuru okwu gbasara ya site n'okwu ọchị o kwuru na twitter n'afọ 2012 ebe o mara ụmụnwaanyị isiojii akaja.

Ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia na-ekwu na ya bụ onye na-arụ na Redio 1 bụ naanị ohere ndị dị ọcha bụ ihe nyere ya aka.

Nna Beyonce bụ Matthew Knowles kwuru na mbido afọ a na ndị isiojii dị ọcha na-aka ewu ewu.

O kwuru na nwa ya na-ewu nke ukwuu maka na ọ dị ọcha ma kwuo na onweghi onye na-akụ egwu a ma ama bụ onyeisi ojii pụtarala ma gbawa ụzọ n'afọ iri gara aga.

N'ime ụmụnwaanyị 68 ndị na-agụ egwu nọ n'isi ọnụọgụgụ ndị na-ewu ewu na Briten, mmadị 17 n'ime ha bụ ndị isiojii ma ọkachasị n'ime ndị ahụ dị ọcha.

Kelli-Leigh onye nne ya bụ onye isiojii ma nna ya bụ onye ọcha rigoro n'ogo nke 10 n'afọ gara aga n'egwu James Hype a kpọrọ 'More Than Friends.'

O kwuru: "Maka ihe a na-amabeghi, ụzọ ka mechikwara emechi nye ụmụnwaanyị ndị isiojii na-eme ihe nkiri na mba UK ndị ahụ ha dị ojii n'ihe gbasara agwa...o kwesighi ịbụ maka agawa ahụ anyị, o kwesiri ịbụ maka ndị anyị bụ."

N'afọ 2017, Ray BLK tutu ugo nke ndị BBC a kpọrọ 'Sound of Music' mana ọkabeghi ruo n'ogo nke 40 na ndepụta nke egwu na-ewu ewu - dịka Jorja Smith na Raye bụ ndị nọkwa na ndepụa ahụ.

Nke a ebutela ajụjụ ma agwa ahụ ha eso n'ihe mere ha ji gaa n'ihu.

Nicole Vassell, odeakwụkwọ ihe nkiri na ihe ngosipụta n'akwụkwọ mgbasaozi Pride Magazine nke bụ maka ụmụnwaanyị isiojii kwuru na: "O nwere ihe kpatara na ọtụtụ ndị na-achawapụta na ndị kachasị bụ ndị isiojii dị ọcha.

"Ndị dịka Beynonce na Rihanna, eziokwu ha nwere onyinye pụrụiche ma marakwa ihe ha na-eme ma ọcha ha dị sokwa wee nyere ha aka n'ebe ha nọ ugbua.

"E nwereike inwe ụmụnwaanyị ndị ọzọ dị ojii ma nwekwaa ụdị onyinye ahụ mana anyị agahị ama maka na a naghị enye ha ụdị ohere maọbụ lee anya n'akụkụ ha."

Ndị ọkachamara na-atụ aka n'ịkpa oke agwa dị n'ime mgborogwu agụgụala nakwa ikpa oke agbụrụ ma ndị mmadụ oge ụfọdụ na-anata mmegbu n'aka ndị dịkwa ka ha.

Dọkịnta Kehinde Andrews, otu onye na-achọ ịbụ onye ọkammụa na 'Sociology na mahadum Birmingham City nakwa ọsọ bụrụ onyeisioche otu ndị isi ojii kwuru na: "Ọ bụrụ na anyị chee echiche banyere atụmatụ mma na ihe dị mma, ịkpa oke agbụrụ dị n'ime atụmatụ ahụ na e nwere ọkwa, ndị Amerịka isiojii nọ n'ala ebe ndị mpaghara Yurop dị ọcha nọ n'elu.

"Nke pụtara na ọ bụrụ na ịnọghị ojii nso cha cha, ọ bụrụ na ị nọ ịdị ọcha nso, e kwuola nọ ọ bụ ya bụ mgbe ị dị mma, ịnwghi ntụpọ, ị mara mma, ị mara akwụkwọ."

'Ụbọchị niile adị m nnọ ojii etu m dịkwa ụbọchị bu ya ụzọ'

Arụmụka dị n'akụkụ ịkpa oke agwa abanyela n'akụkụ ndị ọzọ na-eme ihe nkiri.

N'ihe onyonyo, ụmụnwaanyị dị ojii ndị nwetara agwa buru ibu n'ime onyonyo 20 kachasị ree na UK n'afọ 2017 gụnyere Zoe Saldana, Tessa Thompson, Halle Berry, Elise Neal na Nathalie Emmanuel.

Ị lee anya n'akwụkwọ magazin, magazin ụmụnwaanyị anọ kachasị ere bụ (Cosmopolita, VOgue, Grazia na Marie Claire) enwela ụmụnwaanyị ndị isi ojii a ma ama mmadụ itoolu n'ihu peeji ha dị 125 nke ha wepụtara kamgbe ọnwa Jenuwarị 2017.

Ụmụnwaanyị ndị a bụ Rihanna, Meghan Markle, Beyonce, Adwoa Aboah, Lupita Nyong'o, Zoe Kravitz, Zoe Saldan, Jennifer Hudson na Gugu Mbatha-Raw.

Dọches Suseks kwuru okwu banyere ịkpa oke agwa n'afọ 2015 ebe o kwuru na dịka onye na-eme ihe onyonyo, a na-ahụta ya dịka 'onye amaghị ebe o si".

Oge o na-ede n'akwụkwọ magazin Elle, o kwuru na otu ihe agwa o mere dịka Rachel Zane n'ihe onyonyo Amerịka a kpọrọ "Suits" jiri rie ya isi bụ maka na ọ bụghị maka agwa ahụ onye na-eme ya.

Ndị mere ihe onyonyo ahụ achọghị onye a gwara ọgwa, maọbụ onye ọcha maọbụ onye ojii.

"Ha nọ na-achọ naanị Rachel."

Onye so mee ihe nkiri 'Star Wars' bụ Lupita Nyong'o ekwupuola etu esi akọ ya ọnụ na 'agwa ahụ ya dịka uchichi' ebe ya na-ekpere Chukwu ka ya teta ụra n'ụtụtụ dịtụ ọcha.

"Kwa ụbọchị, ana m enweta obi mgbawa maka ana ma adị ojii ka m dịkwa ụnyaahụ."

Onye na-eme ihe onyonyo bụ Adele Oni mere agwa onye ose foto na ihe onyonyo nke Briten na-abịabịa a kpọrọ 'No Shade' nke bụ maka ịkpa oke agwa na ịhụnanya.

O kwuru na: "Anyị niile mara etu o si baa n'ime ụmị ụwa anyị, atụmatụ ịkpa oke agwa na atụmatụ itolite ma ghọta na ọbụrụ na ị dị ọcha, na ị ka maa mma n'anya ụmụnwoke, ka anyị nabatara.

"Onweghi mgbe anyị gbara ọkụ na ya ma gosipụta ihe ọ bụ maọbụ ihe ịtụ n'anya ụdị nsogbu ọ bụrụ anyị."

"E nwere mgbanwe"

Anabatala ndị nkiri na ndị mgbasaozi nkeọma n'oge adịghị anya maka na-agbasa aka karịa ugbua.

Edward Enninful, bụ onye odeakwụkwọ mbụ nke magazin briten Vogue bụ onyeisi ojii were oche n'ọnwa Ọgọstụ afọ gara aga ebe nke ha bipụtara n'ọnwa Mee gosipụtara ụmụnwaanyị nwere agwa dị icheiche.

Ma e toro ihe nkiri 'Black Panther' nke Lupita Nyong'o na Letitia Wright so na ndị mere ya maka na o gosipụtara ụmụnwaanyị nwere agwa ojii.

Onyeisi ụlọọrụ Liz Matthews PR bụ Jordan Mitchell kwuru na arụmụka dị n'akụkụ atụmatụ ịkpa oke agwa na-emegide ụmụnwaanyị ndị isiojii oge ụfọdụ.

"O zughu inwe mmadụ onyeisi ojii mana ọ bụ maka ụdị agwa ojii nke ka mma."

O kwuru na ihe e kwere ime bụ ikele ndị ọrụ nkiri maka na ha na-anabatazi mmadụ niile.

"Ama m na oge mbụ ụdị mmadụ Halle Berry bụ naanị onye a ga-eweta dịka onyeisi ojii, nke ahụ agala.

"Ebe m mara na e nwela ọtụtụ ụmụnwaanyị isi ojii nwere agwa dị icheiche, nke a gosiri na e nweela mgbanwe ma ihe na-aga n'ihu."

Lioness tiputara ntigharị egwu DBT nke bụ 'Dead Black Tin' na Bekee na mbido ọnwa a nke nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ezigbo ojii n'ime ya dịka Lady Leshurr na Little Simz iji megide ndị na-akpa oke agwa.

O kwuru na ọ na-emezi emume maka ya dị nnukwu ojii na chọkwa ka egwu ahụ "metụta na anyị niile bụ otu agbụrụ agbanyeghi ụdị agwa onye dị."

"Ọ dị m ka, ngwanụ ka anyị mee ya bụ ihe, Ị na-agbalisi ike ịkwụsị m maka etu ahụ m dị, nsogbu adịghị, ngwanụ ka anyị kwata ya."

"Aga m agbawa ụzọ niile m nwereike icehta."

Soro Newsbeat na Instagram, FacebooknaTwitter.

Gere Newsbeat live at 12:45 na 17:45 kwa izu na BBC Radio 1 na 1Xtra - Ọ bụrụ na i geghi anyị, inwere ike inweta anyị nahere.