Sunday Igboho: Buru ụzọ nwuchie Shekau na Gumi tupu ụnụ bịa ịnwuchi m - Sunday Igboho

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Sunday Igboho ekwuola na nkata ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-akpa iji nwụchie ya agaghị enwe isi.

Igboho kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ Punch gbara ya ajụjụ ọnụ, dịka ndị uweojii nakwa ndị DSS gbalịrị ịnwụchi ya n'ụbọchị Fraịde.

Cheta na Sunday Igboho bụ onye kwuru na ya na-alụ ọgụ iji kwụsị mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.

Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa chebiiri Sunday Igboho n'okporo ụzọ si Legọs aga Ibadan mana mbọ ha gbara ịnwụchi ya enweghị isi.

Igboho kwuru na "ndịọrụ nchekwa Naịjirịa ga-ebugodu ụzọ nwụchie onyeisi ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau nakwa Sheikh Ahmed Gumi tupu ha abịa nwuchie m".

O kwuru sị: "Gịnị ka m mere ha ga-eji chechie m n'ụzọ ka onye ohi?"

"Ndị uweojii agwabeghị m bịa n'ụlọọrụ ha mụ ajụ. Gịnị meziri ha ji bịa ichechi m n'ụzọ?"

Oge a jụrụ ya ma ọ ga-aza oku ma ndị uweojii kpọọ ya, Sunday Igboho kwuru sị: "Ha buru uzọ kpọọ Shekau na Gumi tupu ha akpọọ m.

Igboho gara n'ihu kwuo na ya agaaghị agba ọzọ, nke ya ga-ezo ezo, mana ndị uweojii agaghị enwe ike ịnwuchi ya n'ala Yoruba.

Sunday Igboho ekwuola na ebe ọzọ ya na-aga ebuso ndị Fulani na-achị ehi agha bụ n'Ogun Steeti.

Sunday Igboho bụ onye Yoruba na-ebuso ndị ọchịehi Fulani agha na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa adọọla ndị otu ahụ aka na ntị ha chee aka ghọrọ ya n'Ogun steeti.

Ya bụ nwaamadị etuola ọnụ na ya ga-aga ịchụpụcha ndị Fulanị na-achị ehi niile na steeti ahụ mgbe adịghị anya agbanyeghị na a sị na ndị agha Naịjirịa na-esozị ha na-azụ.

N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, akwụkwọ akụkọ "The Nation" Igboho sị na ya anụla maka mkpamkpa ndị ọchị ehi ahụ na-akpa na ya bụ steeti.

Ya bụ akwụkwọ akụkọ akọbụọla ka ndị agha Naịjirịa siri edugharị ndị ọchị ehi ahụ n'ọhịa n'Ogun steeti bụ ebe eboro na ha na-eti ndị mmadụ gara ịkwụsị ha ka ha ghara ịba n'ugbo ha.

"The Nation" kwuru na Igboho sị na ọ bụ Chineke chọrọ ịzọpụta ndị Ibarapa na-aka ndị ọchị ehi mere ya bụ ihe na-eme ebe ahụ jiri pụta ihe sịte n'ọnwụ Dọkịnta Aborode.

Sunday Igboho ekwuola na ihe wutere ya maka ụlọ ya a gbara ọkụ bụ maka na ọ bụ ndị Yoruba ibe ya kpara arụ ahụ.

Igboho kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n'ụbọchị Tuzde.

O kwuru sị: "Mbọ m na-agba bụ iji hụ na mwakpo ndị ọchịehi Fulani na-awakpo anyị n'ala anyị kwụsịrị, mana ọ na-ewute m na ndị Yoruba ibe m na-esonyere ndị ọchịehi a iji buso m agha."

"Ọ gbara m gharịị na ụfọdụ ndị Yoruba na-enyekwara ndị ọchịehi a aka n'igbu nakwa iwakpo ndị be anyị."

Igboho gara n'ihu kwuo na ihe mebiri n'ụlọ ya gbara ọkụ karịrị nde naịra iri ise (N50 million)

Ọ gakwara n'ihu kwuo na akụkọ ndị na-efegharị na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado ya, abụghị eziokwu.

"O nweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na-akwado m," Igboho kwuru.

"Ndị ọchịchị anyị achọghị ịma maka mwakpo na ogbugbu a na-egbu ndị nkịtị n'ime obodo dị icheiche."

"Ya kpatara m ji alụ ọgụ a iji weta udo na nchekwa na be anyị, agaghịkwa m akwụsị ịlụ ya bụ ọgụ ruo oge ndị ọchịehi a hapụrụ ala anyị."

Etu ndị ekperima si gbaa ụlọ Sunday Igboho ọkụ

BBC agaala n'obodo Soka nke dị n'Oyo steeti ịmata kpọmkwem ihe kpatara ọkụ gbara n'ụlọ Sunday Igboho, bụ nwa amadị ahụ foro ntutu taa na ndị Fulani ọchịehi ga-esiriri na mpaghara Ọdịda Anyanwụ kwapụ.

Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Tuzde na ụlọ nwa amadị a agbaala ọkụ, mana amaghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.

Mana ndị bi n'okirikiri ahụ gwara BBC na ọ bụ ndị ekperima bịara n'ime abalị ma tinye ọkụ n'ụlọ ahụ.

Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ekperima ahụ ji ụgbọala atọ wuchie n'ụlọ ahụ n'ihe dịka elekere abụọ maọbụ atọ nke ime abalị.

"Oge anyị pụtara n'ụtụtụ a, anyị hụchara komkom 'kerozine' nakwa gaasị, ma hụkwa mgbọegbe n'ogige ụlọ ahụ."

Onweghị onye ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ merụọ ahụ na ọkụ ahụ, mana ụlọ Sunday Igboho gbapịara agbapịa.

Onye mụnyere ọkụ gbara n'ụlọ Sunday Igboho?

Akụkọ pụtara n'ụtụtụ a na-ekwu na ọkụ bee Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho wee mara.

Bee ya ahụ dị n'ebe akpọrọ Soka n'Ibadan.

Ọkụ ọgbụgba ahụ gbara dịka otu ndị gọvanọ ọdịda anyanwu nwechara ọgbakọ n'Akure ebe ha kpara maka etu a ga-esi belata ọgbaghara dapụtara maka ndị Fulani.

Amabeghị etu ọkụ ahụ si malite mana onyonyo ruru BBC aka na-egosi ebe ndị mmadụ na-atụ ụlọ Igboho aka iji gosi etu ọkụ si gbarie ụlọ ya.

Ndị mmenyu ọkụ biara menyụọ ya bụ ọkụ mana onweghị onye ma ma mmadụ a nwụrụ n'ime ụlọ ahụ n'ime ọkụ ahụ gbara bee Sunday.

Sunday Igboho ekwubeghị maka ọdachị a n'akara twitter ya ,instagram maọbụ facebook ya.

Akụkọ ka na-abịa gbasara ihe a merenu n'ikpeazụ a.

Sunday Igboho ọ na-akwado Nnamdi Kanu?

Sunday Igboho chụpụrụ Seriki Fulani nọ n'Oyo steeti ekwuola na ya agaghị ịkwụsị atụmaatụ ya belụ ma ndị ọchịehi niile nọ n'ọhia ha e si ebe ahụ pụọ.

Igboho depụtara nke a n'akara twitter ya ma na-ekwu na o nweghị onye ga-achụpụli ha n'ala nna nna ha, katama egbuchiasịa ha mana nke a agaghị eme ka ha gbaa ọsọ n'ala ha .

Igboho gakwara n'ihu kọọ ka ndị bee ha si atụzi ụjọ maka mkpampka o kwuru ndị ọchị ehi na-akpa n'ogbe ahụ.

Ọ gara n'ihu wepụta ozi Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) dere na n'akara twitter ya nke mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ha abụọ a na-arụkọ.

O kwuru ka gọọmenti mata na o nweghị ihe dịka ọchịchị maọbụrụ na ndị ha na-achị anọghị ya.

Nke a bụ mbụ Igboho na-ekwu ihe gbasara ogbaghara dapụtara n'Igangan dị n'Oyo steeti kanmgbe okwu a malitere n'izu ụka gara aga.

Etu ndị ọnụ na-eru n'okwu si gaa njem nleta ikpezi udo n'Igangan

Gọọmenti Oyo steeti na ndị uweojii akpọọla oku udo n'ụfọdụ akụkụ ebe ọgbaghara dapụtara na steeti ahụ ma na-arịọ ndị ọnụ na-eru n'okwu ka ha nabata mkparịtaụka karịa ma ị na-emebisi akụ na ụba ndị mmadụ.

Fatai Owoseni bụ onye ndụmọdụ gọvanọ Oyo steeti nọchitere anya ya na njem nleta ahụ riọrọ ka ndị bi n'ogbe ahụ nabata nnagide agbụru iji buso mwakpo si n'aka ndị ekperima agha.

Kọmịshọna ndị uweojii Oyo steeti bụ Ngozi Onadeko kwuru okwu na njem nleta n'Igangan, Tede na Ago si na oke ọgụ a na-alụ na-ebute mmebisi ihe n'ogbe ahụ kwụsị.

O kwuru ka ndị ọnụ na-eru n'okwu zukọta ka enwe ọgbakọ n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ibadan ebe a aga-ekwu etu weta udo n'ebe ahụ.

Cheta na ọgbaghara dapụtara n'Igangan kamgbe otu izụka maka oke ntọrị na ogbugbu ndị ntoroọbịa kwuru na ndị Fulani na-eme n'ogbe ahụ.

Ihe m hụrụ mgbe m na-agba ọsọ ndụ Igboho- Nwunye Seriki, onyeisi ndị Fulani n'Oyo steeti

Otu nwa Seriki bụ onye isi ndị Fulani n'obodo Igangan akọrọla BBC ihe ha hụrụ mgbe Sunday Igboho wakporo ndị bee ha.

Umar Salihu Abdukadir gwara BBC na mgbe ọ kụrụ elekere atọ ha gbapụrụ n'Igangan, ha gbagidere ọsọ ọ kụọ elekere anọ nke mgbede ha ji ruo Ogun steeti.

O kwuru na ọụtụ mmadụ amaghị ebe ha nọ , gunyekwuru nna ya bụ seriki Fulani.

BBC hụkwara nwunye nke mbụ Seriki Fulani aha ya bụ Mariam nke e merụrụ ahụ ebe ọ na-anwụ mmiri.

Mgbe BBC gara bee ya , a hụrụ na o bu nnukwu ọnya n'ihu ya.

Anyị gbaliri ịnụta n'ọnụ nwunye Seriki Fulani , o kwunwughị okwu ọfụma.

Onyeisi ndị uweojii nakwa gọvanọ Seyi Makinde ga-aga Igangan dị n'Oyo steeti taa

Gọvanọ Seyi Makinde bụ aka na-achị Oyo steeti, onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu, nakwa ndị eze nọ na steeti ahụ ga-aga Igangan dị n'okpuru ọchịchị Ibarapa Notu ka ha wee kpaa maka etu a ga-esi weghachị udo n'obodo Ibarapa.

Osote onyeisioche ndị eze n;Oyo steeti gwara ndị ntaakụkọ Punch na ha na-enwe ọgbakọ a ka ha weghachite udo n'ogbe ahụ.

Cheta na ọgbaghara dapụtara n'Igangan, Ibarapa mgbe nwa amadị Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho mara na-azọ nwereonwe ndị Yọrụba kpọrọ ndị otu ya gaa n'ogbe ndị Fulani ịchụpụ onyeisi ha ma na-ebo ya ebubo mpụ na nrụrụaka dị iche iche.

lee ihe ndị ịkwesịrị ị ma maka Sunday Igbogho

Sunday Adeyemo eji Sunday Igbogho na-ewu dịka ọ gwara ndị ọchị ehi bụ ndị Fulani na Oyo steeti ka hwa kwara kwapụ.

Sunday Idogho bidoro iwu dịka ya na ọtụtụ ndị mmadụ wuchiri obodo Igangan dị na Oyo Steeti.

Nke a na-eme dịka onyere ndị Fulani abalị asaa isi Oyo steeti pụọ.

Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Jenuwarị bụ ụbọchị ikpeazu Igbogho nyere ha.

Sunday Igbogho boro onyeisi ndị Fulani na steeti ahụ bụ Saliu Kadri na ndị otu ya na-egbu ndị Youruba.

Igbogho kpọrọ Fatai Aborode, Alhaja Serifat Adisa na ụmu ya na nwaeze ndị Igangan na ndị ọzo dịka ndị Fulani gburu na steeti ahụ.

Lee ihe anyị ma maka okwu a

  • Ọ bụ n'ụbọchi iri na ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021 ka Sunday Igbogho bụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbara ndị Fulani nọn'obodo ha ka ha kwara mgwomgwo ha sị n'ala ha nọ pụọ.
  • Igbogho na-ebo ndị Fụlani na ha na-egbu ma na atọrọ ndị obodo ha.
  • O kwuru na ọ ga-achụpụ ha ma ọ bụrụ na ha apụghị.
  • Gọvanọ steeti ahụ bụ Seyi Makinde zịgara ndị ha na onyeisi ndị Fulani bi n'obodo Igangan dịka Idogho machara ọkwa a.
  • N'ụbọchị Wenesde ka Gọvanọ Makinde zịtere n'ihe onyonyo sị ka onye ọbụla na-eyi ndị Fulani nọ na steeti ahụ egwu kwụsị ya.
  • Onyeisi ndị Fulani bị na steti ahụ bụ Alhaji Abdulkadir gwara BBC Yoruba na ha enweghị ebe ọzọ ha ga-aga. Na ya bụ esem okwu ga-ebi.
  • N'ụbọchị Frịde ka Igbogho na ọtụtụ ndị nkwado ya wụchịrị obodo Igangan dịka oge ọ nyere ndị Fulani ka ha pụọ zuru.
  • Abdulkadir gwara BBC Yoruba na ụfọdụ ndị mmadụ agbaala ọtụtụụgbọala nọ n'ụlọ ya ọkụ
  • Ndị otu Igbogho na-ekwu na ha erughị ụlọ Abdulkadir

Ihe Gọvanọ Oyo Steeti kwuru ma okwu a

Gọvanọ Steeti ahụ bụ Seyi Makinde kwuru na ya agaghị anabata ka onye ọbụla nọrọ dịka onye na-alụrụ ndị Yoruba ọgụ ma bute nnukwu ọgụ agbụrụ na steeti ahụ.

Makinde kwuru sị, " Ọ bụ ịbulite akụnụba ndị Oyo steeti kacha dịrị ọchịchị steeti a mkpa, ọgbaghara agaghị ekwe ka atụmatụ a mezuo".

Ihe ndị Fulani nọ na steeti ahụ na-ekwu

Onyeisi ndị Fulani n'Oyo steeti bụ Alhaji Abdulkadir gwara BBC Yoruba na ha enweghị ebe ọzọ ha nwere ịgbaga.

O kwukwara na ya bụ nghọtahe ba-ebe nsonso a.

O kwukwara na ndị uweojii awụchiela maka nchekwa udo ma sịkwa ka arịọ Sunday Igboho ga obi ya dere duu.

Ndị uweojii kwanụ?

Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka anwụchie Sunda Adeyemo eji Sunday Idogho mara.

Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisi ndị Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu katọrọ ya bụ iwu.