Lai Mohammed ọ rịorọ Obi Cubana ego maka ịkwụ ụgwọ Naịjirịa ji?Lee ihe anyị ma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Lai Mohammed bụ minista mgbasaozi Naịjirịa suru akara akụkọ ụgha n'ebe edepụtara na ọ rịọrọ Obi Cubana bụ onye azụmahịa na-ewu kamgbe ngwụcha izu ụka a ego e ji akwụ ụgwọ Naịjirịa ji.

Mohammed depụtara nke a n'akara Facebook ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na omenaala na Naịjiria nke ọ bụ minista ya.

E depụtara akụkọ ụgha fegharịrịnụ etu a ,"Obi Cubana nke Anambra nwere udiri ego a , Naịjiria wee na-agba mbibi n'aka mba China. Cubana nyetụ Naịjirịa ego.

Obi Iyiegbu e ji Obi Cubana mara wuru ewu na ngwụcha ịzụ ụka maka etu o si wepụta nnukwu ego kwa nne ya nwụrụlanụ n'ọba dị n'okpuruọchịchị Idemili South dị n'Anambra ma nata ọtụtụ onyinye n'aka ndị ọyị ya.

Ọtụ onyonyo ndị mmadụ setere na ya bụ mmemme na-egosi ebe ndị ama ama nakwa aka ji akụ n'efe nnukwu ego na mmemme Obi Cubana.

Ọtụtụ ndị ama ama gụnyere Cubana chief priest (onye ọrụ Obi Cubana), Davido, D'Banj, Phyno nakwa ọtụtụ ndị na-eme ihe nkiri ba Nollywood.

Etu e si fee ego na mmemme akwamozu Obi Cubana mere ka ọtụtụ ndị mmadụ kwuwe ka Obi Cubana binye Naịjiria ego.

Ụfọdụ na-ajụ kedụ ka Obi Cubana si akpata ego ya.

Ego Naịjirịa ji n'ụgwọ agbagotela kamgbe onyeisiala Muhammadu Buhari banyere ọchịchị.

Ihe ndị ama ama kwuru maka mmemme akwamozu nne Obi Cubana

Okpa ọchị ama ama bụ Uche Williams Mba gosiri onyoonyo etu o si gaa ya bụ akwamozu ma kwuo na n'ikpeazụ onye ọbụla bụ ndị nwụrụanwụ ka dị ndụ.

Kanayo O kanayo na-eme ihe nkiri Nollywood pụtakwara kwuo n'onyonyo na-efegaharị na soshal midia na onye ọbụla na-achọ ọyị nwaanyị gawa Oba makana ebe ahụ ka ihe niile na-eme.

Akụkọ ka na-abịa