Ụlọọrụ EFCC atọhapụla Willie Obiano

Ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission, EFCC, ekwuola na ha atọhapụla Willie Obiano bụbu Gọvanọ Anambra steeti agbanyeghị na ha ka na-eme nnyocha.

Ọṅụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren sị na ya agaghị ekwụ ma ha napụrụ ya akwụkwọ ikike njem ya.

Ihe e mere onye wepụtara onyonyo Willie Obiano dịka ọ nọ n'aka ndị EFCC

Oge gara aga, Ụlọọrụ ahụ na ahụ maka mgbochị mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa kwuru n'ụbọchị Mọnde na ha enyochapụtala otu onye ọrụ ha ha na-ebo ebubo na ọ bụ ya sere ma kesaa ihe onyonyo aka chibụrụ Anambra steeti bụ Willie Obiano dịka ọ nọ n'aka ha.

Ụlọọrụ EFCC kwuru na ha akwadoghị agwa a onye ọrụ ha kpara ma kwuo na o soghị na usoro ọrụ ha.

Ha kwukwara na ha ga-enye onye ahụ ntaramahụhụ dịrị ya agbanyeghị na ha ekwupụtaghị ihe ntaramahụhụ a gụnyere.

Cheta na ebe ngwụcha izu gara aga otu ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia nke gosiri Obiano ebe ya na otu nwoke nọ n'ụlọọrụ ndị EFCC.

Ihe Ị kwesịrị ịma maka nwụchi Willie Obiano

Kepụkepụ pụtara ihe n'ụtụtụ Fraịde na-akọwa na atọhapụla onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti nke ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) jidere n'abalị Tọọzde.

Wilson Uwajaren bụ ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ a sị na "akụkọ ahụ na-ekwu na EFCC atọhapụla Obiano bụ akụkọ ụgha. Ọ ka nọ na-aka anyị rụrọ mgbe anyị mechere nchọpụta".

BBC Igbo juru Wilson ka ọ ma ihe a na-ebo Obiano ha nwụchiri ebubo maka ya.

Ọ zara na ọbụghị ihe ya ga-aza ozugbo, mana "tupu anyị ejide mmadụ, ọ ga-enweriri ihe onye ahụ mere. Mana ihe m ga-agwa unu ugbua bụ na Obiano ka nọ na-aka anyị maka nnyocha".

Ọ sị na Obianọ ma na ya nọ na-akwụkwọ ndị EFCC na-achọ achọ were chọọ ịgbapụ.

O kwuru na ha esila Legọs steeti buga ya Abuja.

Wilson sịkwa na ya amatabeghị mgbe a ga-akpụpụ ya ụlọikpe, na ndị ga-ama nke ahụ bụ ndị ngalaba "operations" ha, bụ ndị jidere ya.

Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), nwụchiri onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti n'ọdọụgbọelụ Murtala Mohammed International Airport dị na Legọs steetị ụnyaahụ bụ Tọọzde ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị 2022.

Nke a mere ka ọ nyefechere ọchịchị Anambra steeti n'aka Gọvanọ Charles Soludo ụnyaahụ, na-emezị njem nke a sị na ọ bụ mba ofesi ka o zubere ịga tupu anwụchie ya.

Akụkọ kwuru na Obiano na-aga Houston, Texas mgbe a nwụchiri ya n'ọdọụgbọelụ ahụ.

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajaren bụ onye gwara BBC nke a, sị na Obianọ nọ n'ụlọọrụ ha dị na Legọs ugbua.

EFCC kwuru: "ọteela anyị ji arọ ya anya mana iwu nchekwa ndị nọ n'ọchịchị nke Bekee kpọrọ "immunity" ekweghị anyị ruo ya nso. Mana ya bụ "immunity" gwuru ụnyaahụ, nke mere anyị jiri nwee ohere ịwụchi ya".

O dobeghị anya ihe mere anya EFCC jiri nọrọ n'isi Obiano maka amabeghị ihe a na-ebo ya.

Anyị ka ga-ewetere gị akụkọ a n'uju ka ọ na-apụta.

Onye bụ Willie Obiano?

Obiano bụ aka chiburu Anambra steeti site n'afọ 2014 ruo 2022 bụ onye Aguleri nke dị n'okpuruọchịchị Anambra North.

O ji ọkọlọtọ ndị All Progressive Grand Alliance, APGA, were chia Anambra steeti Afọ asatọ.

Ọ gara akwụkwọ na Mahadum University of Lagos bụ ebe ọ nwetere asambodo na Accountancy na njere nke "masters" na Business Admin n'afọ 1979.

Aha nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano

Lekwa Gọvanọ ndị ọzọ EFCC nwchigoro

Kemgbe Nịjirịa banyere repụblik nke anọ na 1999 ruo ugbua, EFCC anwuchiela gọvanọ iri atọ (30) maka ebubo nrụrụaka na mpụ.

Willie Obiano mere ya onye nke iri atọ n'otu.

Willie Obiano

EFCC nwuchiri ya ụbọchị Tọzde, ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachi 2022.

Ụbọchị anwụchiri ya bụ ụbọchị ọ nyefere ọchịchị n'aka Gọvanọ ọhụrụ Anambra steeti bụ Charles Soludo.

EFCC sị na ọ teela ha rọwara ya anya, mana ha enwghị ike ijide ya maka "immunity" ya.

James Ibori

James Ibori bụbu Gọvanọ Delter steeti (1999 - 2007) rachara afọ iri na atọ (13) na mkpọrọ maka ebubo $77m o zuru mgbe ọ na-achị steeti ahụ.

James kwetere na ya kpara nkata ezu ego ma bufee ya ofesi n'ụlọikpe South Crown n'UK.

Ọ gbara ọsọ na Naịjirịa, ha jide ya na Dubia 2010 buga ya UK.

Rochas Okorocha

Rochas Okorocha chịrị Imo steetị n'afọ 2011 ruo 2019 nọ n'aka EFFC na 13 Apreelu 2021 mgbe ha wuchiri ya Unity House office dị na Garki, Abuja.

Ha boro ya ebubo ibuba ego nakwa imefu ego steeti Imo.

A wụchiri Okorocha na Febụwarị 2021 mgbe gọomentị Imo steeti boro ya ebubo maka ụlọ nwinye ya ọ mepere.

Orji Uzo Kanu

A tụrụ Oji Uzo Kanu mkpọrọ afọ iri na abụọ (12) maka ebubo ibuba ego steeti.

Ụlọikpe mara ya na mmadụ abụọ ọzọ ikpe ibuba ego dị ijeri asaa na ụma (N7.65) mgbe ha nọ n'ọchịchị malite n'afọ 1999 -2007.

Lekwa Gọvanọ ndị ọzọ a nwuchigoro

Gabriel Suswam nke Benue steeti

Audu Abubakar nke Kogi steeti

Abdullahi Adamu nke Nasarawa steeti

Aliyu Akwe Doma nke Nasarawa steeti

Joshua Dariye nke Plateau steeti

Jonah Jang nke Plateau steeti

James Bala Ngilari nke Adamawa steeti

Murtala Nyako nke Adamawa steeti

Ali Modu Sheriff nke Borno steeti

Danjuma Goje nke Gombe steeti

Jolly Nyame nke Taraba steeti

Sule Lamido nke Jigawa steeti

Aliyu Wammako nke Sokoto steeti

Abdulaziz Yari nke Zamfara steeti

Theodore Orji nke Abia steeti

Chimaroke Nnamani nke Enugu steeti

Sullivan Chime nke Enugu steeti

Ikedi Ohakim nke Imo steeti

Godswill Akpabi nke Akwa Ibom steeti

Diepreye Alamieyeseigha nke Bayelsa steeti

Timipre Sylva nke Bayelsa steeti

Lucky Igbinedion nke Edo steeti

Olugbenga Daniel nke Ogun steeti

Adebayo Alao-Akala nke Oyo steeti

Rashidi Ladoja nke Oyo steeti