Bianca Ojukwu vs Ebele Obiano: Ihe anyị ma maka esemokwu Ebele Obiano na Bianca Ojukwu

Lee ihe anya BBC Igbo hụrụ mgbe esemokwu malitere n'etiti Bianca Ojukwu na Ebelechukwu Veronica Obiano.

O mere mgbe Ọkammụta Charles Soludo na-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịṅụ iyi dịka Gọvanọ ọhụrụ n'Anambra steeti.

Onye ntakụkọ BBC Igbo nọ n'ogige Gọọmenti Anambra kọwara si, "Odoziakụ Ebere Obiano gakwuru Bianca Ojukwu."

"Eche m na ọ na-ekele ya."

"Anyị atụghịanya na ha ga-eseokwu."

"Ihe m hụrụ bụ na Bianca Ojukwu o foturu ntutu isi Ebere Obiano."

"Ha sị anyị gbanyụọ kamera, ka anyị hapụ isete emeokwu na-eme"

"Amaghị m ma enwere onye gbara ibe ya aka ntị"

"Anyị hụrụ ntutuisi, Ebere Obiano nọ na-ahazị ntụtụisi".

Ndị gbara ha gburugburu bịara gbosaa ha ọgụ.

"Ka nke a na-eme, Gọvanọ Soludo nọ na-etinye aka n'akwụkwọ. Ihe niile a eruchaghị nkeji olemole"

  • Bianca Ojukwu bụ nwunye Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ebidola na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị dịka sinetọ n'ime Anambara steeti.
  • Ya na Odumegwu Ojukwu mụtara ụmụ atọ tupu di ya anwụọ n'afọ 2011.
  • Bianca na-azabụ Bianca Ono tupu ọ lụọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu.
  • Ọ bụ nwa CC Ono, aka chiburu Anambra Steeti.
  • Bianca kwuputere ebumnuche ya ịzọ ọkwa a n'ọgbọ egwuregwu dị n'Ekwulọbịa n'Agụata n'ime Anambara steeti.
  • Ọ nwetere nnturugo n'asọmpị e lelebe e jeghi ọrụ nke ụmụnwaanyị Naịjrịa n'afọ 1988 nakwa nke Afrịka
  • Amụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ, 1968
  • Ọ bụ onye ọkaiwu bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nnọchịte anya Naịjriịa na mba Spain n'afọ 2012

Onye bụ Ebelechukwu Veronica Obiano?

  • Ebelechukwu Obiano bụ nwunye Willie Obiano bụ aka chiburu Anambra Steeti
  • A mụrụ ya n'Ọnịcha, Anambra steeti
  • Ọ bụ onye obodo Ifite, Ogbunike dị n'okpuruọchịchị Oyi dị n'Anambra steeti, ma lụọ Obiano bụ onye Aguleri nke Anambra North
  • Ha mụrụ ụmụ abụọ, otu nwaanyị na otu nwoke
  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Legọs nakwa Okija ma gụọ mahadum na mahadum Legọs
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na Houston, Texas dị na mba Amerịka
  • Ọ rụọla ọrụ n'ọtụtụ ebe gụnyere ngalaba NNPC a kpọrọ NAPIMS
  • O hiwere ụlọọrụ na-ahụ maka inyere ndị mmadụ aka a kpọrọ 'Caring Family Enhancement Initiative' (CAFE) n'afọ 2014

Enwere onye gbara ibe ya aka ntị?

Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ihe mere gwara abyị na "amaghị m ma enwere onye gbara ibe ya aka ntị, ahụghịkwanụ ya mana ihe m hụrụ bụ na e foturu ntutuisi Ebere Obiano ihu ọha na eze bịara nnukwu emume a."

Ndị mmadụ bidoro gbowezie ha ọgụ.

Ka ihe niile a na-eme Gọvanọ chịburu Anambra bụ Willi Obiano gbara nkịtị na-ekwughị pim.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka esemokwu ahụ

Gọvanọ Charles Soludo arịola mgbaghara banyere okwu a

Gọvanọ Anambra steeti nke ọhụrụ bụ Charles Soludo arịola mgbaghara n'aka ndị Anambra, ndị enyị ha, ndị nkwado ha nakwa ndị ọrịa bịara n'emume ido ya iyi ọrụ ebe a sị ọgbaghara dapụtara n'etiti nwunye aka chịbụrụ steeti ahụ bụ Ebele Obiano na nwunye Odumegwu Ojukwu bụ Bianca Ojukwu.

N'ozi a Joe C Anatune binyere aka site na ngalaba mgbasaozi ya bụ 'Soludo Media',

O kwuru na ihe a mere sitere na nghọtaghe n'ozi nke isi mmiri ya malitere na nsogbu nọbụ n'etiti Ebele na Bianca kamgbe.

O kwukwara na ha amalitela usoro ikpe udo n'etiti Ebele Obiano na Bianca Ojukwu.

Sịnetọ Stella Odua akatọọla ihe mere n'etiti Ebele Obiano na Bianca Ojukwu

Sịnetọ Stella Odua na-anọchiteanya Anambra North n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa etinye ọnụ n'esemokwu dapụtara n'etiti ụmụnwaanyị ibe ya bụ Ebele Obiano na Bianca Ojukwu.

N'ozi o wepụtara na Twitter, Oduah katọrọ 'agwa ọjọọ' Ebele Obiano, nwunye onye chiburu Anambra kpara site n'ịba Bianca Ojukwu ọgụ.

Ọ sị na nke a gosiri na Ebele enweghi nkwanye ọbụla dị ka nwaanyị nakwa onye nne, ọkachasị nke Anambra Steeti.

Oduah katọkwara aha ọjọọ nke Ebele kpọrọ Bianca mgbe esemokwu ahụ na-aga n'ihu.

Ọ sị ka ụmụagbọghọ ndị na-etolite etolite eṅomikwala agwa ọjọọ a Ebele kpara.

Cheta na ihe onyonyo gosiri ka Ebele Obiano si n'oche ya bilie gakwuru Bianca Ojukwu ebe ọ nọ ọdụ,

Ihe ọzọ a hụziri bụ ka ha abụọ malitere ise okwu nke mere ndị mmadụ ji bịa gbosaa ha.

Nke a mere n'oge a na-edu gọvanọ Charles Soludo n'iyi ọrụ n'obi ọchịchị gọọmentị dị n'Awka.