Cubana Group: Ihe mere Obi Cubana ji gbachie otu ụlọ oriri ya dị n'Abuja

Otu ụlọoriri nke Cubana nwere n'Abuja akpọrọ 'Hustle & Bustle' agbachiela ụzọ ya.

Dịka ha depụtara n'akara Instagram ha ọ bụ n'ihi ọnwụ otu onye bịara ebe ahụ ka nke a jiri mee.

Ha kwuru sị "ekpere anyị na-aga ebe ezinaụlọ nwaanyị ahụ nọ, ka mkpụrụ obi ya zuo ike n'udo".

Onye na-arụ n'ụlọoriri ọzọ Cubana nwere gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ eziokwu na agbachiri ebe ahụ.

Ọ sị "ọ bụghị ebe m na-arụ ka agbchiri, mana ndị ọzọ gara ụnyaahụu(ụbọchị ụka) laghachite sị na akpọchiri ebe ahụ".

Ihe EFCC kwuru maka Obi Cubana

Dịka foto nke EFCC na ụfọdụ ndị mmadụ a sịrị na ha bụ ndị ọrụ ụlọọrụ EFCC, ngalaba gọọmentị ahụ na-ebu agha megide mpụ metụtara ego na-efegharị na soshal midia,, ekwuola na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Wilson Uwujaren binyere aka, ọ sịrị: "Isiokwu foto ahụ bụ ụgha."

"O nweghị mgbe Obi Cubana na ndị ọrụ EFCC sekọrọ foto dịka a na-eme ya nnyocha, oge e jichiri ya n'ọgige anyị maọbụ oge a tọhapụrụ ya."

Ụlọọrụ ahụ rụtụrụ aka na foto ahụ nke e sere n'abalị asaa nke ọnwa Oktoba afọ 2021 bụ na mmemme ibupụta akwụkwọ ọhụrụ nke Colonel Chukwu Obasi n'ọha nke e mere na "Nigerian Army Resource Centre dị na Abuja, ebe Obi Cubana bụ onye ọbịa ka e sere ya.

Obi Cubana enwerela onwe n'aka EFCC

EFCC atọghapụla Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara bụ onye ha ji n'ogige ha kemgbe ụbọchị Monde.

Obi gara ebe ahụ ịza oku nke ụlọorụ ahụ kpọrọ ya gbasara ebubo ibupu ego n'ụzọ ezighi ezi nakwa nrụrụaka ụtụ isi.

Cheta na o nwere mgbe akụkọ wuru n'ụbọchị Tuusde na atọghapụrụ ya mgbe Obi depụtara ozi n'akara Instagram ya.

Mana Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren gwara BBC Igbo n'ekwentị n'ehihie Wenezde na Iyiegbu ka nọ n'aka kemgbe abalị atọ.

Iyiegbu depụtara n'akara Instagram ya kwuo sị, "Okpataozueora, a hụrụ m unu n'anya!" nke mere ka ndị mmadụ chewe na a tọghapụla ya.

Otu onye nọ Iyiegbu nso achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo nke a mana ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajuren azaghi ekwentị ya ịkọwa nke na-eme.

Nwunye ya bụ Ebele Iyiegbu depụtakwara n'akara Instagram nke ya sị " a bụ m nwachinemelu!...onye chukwu goziri mmadụ apụghị ịbụ ya ọnụ"

O kwukwara ihe a ma na-eto di ya na ọ bụ odogwu, ọ bụ onye ndu, ọ bụ onye gbasiri ike na ihe ndị ọzọ.

Gịnị bụ 'Money Laundering' bụ ebubo e boro Obi Cubana?

Dịka iwu debere Naịjiria si nye, o nweghi ebe ọbụla nkọwa dị gbasara atụmatụ ahụ.

Mana o nwere iwu amalitere iche iji lebanye anya ma kwụsị ya bụ ihe bụ Money Laundering Prohibition Act nke afọ 2011.

Onye ọkaiwu bụ Barrister Chukwuemeka Eze kọwara ya bụ ihe dịka ikpata ego n'ụzọ ezighi ezi ma siri n'ụzọ ziri ezi mefuo ya.

O kwuru na site etu e si kpata ego ahụ e nwere ngalaba dị icheiche ga-etinye anya mee nyocha banyere etu ego ahụ si bịa.

Mana EFCC isi ụlọọrụ ọ dịrị ị mee nyocha gbasara ego ahụ maọbụrụ na ha chee na ego ahụ esighi ụzọ ziri ezi mapụta.

Ihe EFCC kwuru maka nwuchi Obi Cubana

EFCC atọghapụla Obi Iyiegbu a ma dịka Obi Cubana ha nwụchiri maka ebubo ibupu ego a kpara n'ụzọ ezighi ezi na mpụ metụtara ụtụisi.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission bụ WIlson Uwujaren ekwuola na ha ka ji Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara.

Uwujaren gwara BBC Igbo na ha nwụchịrị Obi Cubana ụnyahụ nakwa na ọ ka nọ n'aka ha ruo ugbua.

O kweghị ekwu ihe mere ha ji nwuchie ha nakwa ebe ha nọ nwụchie ya.

N'ọnụ ya, "anyị nwụchiri nwamadi a, ma kwe ka o jiri ụkwụ ya bia ụlọọrụ anyị mana enweghị ihe ọzọ m chọrọ ikwu maka ya bụ okwu."

BBC Igbo jụrụ ya etu ha si nwụchie Obi Cubana, ọ sara si " mgbe ọbụla ọ pụtara, ọ ga-eji ọnụ ya gwa ụnụ etu anyị si nwụchie ya.

Anyị jụkwara ya ihe kpatara EFCC ji nwụchie Obi Cubana, ọ sara si " onweghị ihe m ga-agwa ụwa ugbua gbasara nke ahụ karịa na anyị ka ji ya ruo ugbua."

Cubana Chief Priest ekwuola uche ya gbasara akụkọ na EFCC nwụchịrị oyị ya nwoke

Cubana Chief Priest bụ ezigbo ọyị Obi Cubana amanyela ọnụ n'akụkọ na-ewu ebe niile na ụlọọrụ EFCC nwụchiri ọyị ya nwoke ụnyahụ.

O depụtara n'akara Instagram na "ihe na-agaghị egbu anyị ga-eme ka anyị sịwanye ike, udiri ihe a amarala anyị bụ ndị Igbo ahụ. Mbakala ga-ama Ozo mana Ozo ga-ala. #Toghapụnụ Obi Cubana"

Ọ kpọghị okwu aha kpọmkwem mana etu o si tinye "tọghapụ Obi Cubana" gosiri na o nwere ihe mere n'ebe ya bụ nwa amadi ahụ nọ.

Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC .

Ụlọọrụ EFCC anwụchịrị ya n'ezie? Lee ihe anyị ma

Ihe na-ewu na soshal midia kamgbe mgbede ụnyaahụ bụ na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara.

Akụkọ kwukwara na ụlọọrụ ahụ kpọrọ Obi Cubana ma na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

Mana mgbe BBC Igbo zigara Obi Cubana ozi ka ha mata nke bụ eziokwu, ọ zabeghị ozi ahụ rukwa ugbua.

EFCC apụtabeghị kpọmkwem kwuo ma ha anwụchịrị nwamadi a maọbụ na ha anwụchighi ya.

Obi Cubana dị afọ iri anọ na isii bụ onye Anambra dị na mpaghara ọwụwa Anyanwụ na-eme ahịa oriri na nkwari.

O bidoro wuwe n'ọnwa Julaị 2021 mgbe ọ kwara nne ya nwụrụlanụ na be ha bụ Oba dị n'okpuruọchịchị Idemili Saụt nakwa etu e si mefuo ego n'akwamozu ahụ.

Ndị mmadụ malitere katọwa etu o si na-efesasi ego n'emume ahụ mana na mkparịtaụka Cubana nyere BBC Igbo o kwuru na ọ bụ ya na ndị ọyị ya kpatara ego nke mere na ha ga-erinwu ya etu ọ bụla o si sọ ha.

Akụkọ ka na-abia.