Obi Cubana: Ihe mere m ji tiere ya egwu 'Ọkpataozuora' - Anyi Dons (Onye Ịchaka)

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Anyi Dons (Onye Ịchaka) na-eti egwu kọwaara BBC Igbo ihe mere o ji tiere Obi Cubana egwu ọ kpọrọ 'Okpataozuora'.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Anyi Dons sị na o tiri egwu ahụ iji kwanyere Obi Cubana ugwu ma kelee ya n'ihi ọrụ ọma ọ na-arụ.

Ọ sị na ọ bụghị naanị n'ihi ihe Cubana meere ya kama ma nke o mere ọtụtụ ụmụ ntoroọbịa bụ ndị o nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ.

Anyi Dons sị na o tipụtala egwu ahụ tupu Obi Cubana elie nne ya n'ọnwa Julaị afọ 2021 bụ mgbe egwu a malitere na-ewu ewu.

Cheta na aha Obi Cubana malitere ịda ụda na soshal midia nakwa Naịjirịa n'oge ahụ o liri nne ya n'obodo ya bụ Oba dị n'Anambra Steeti.

Nsi e nyere m mere m ji tipụta egwu 'Deputy Jesus' - Anyi Dons, onye Ịchaka

Ifeanyi Donatus na-eti egwu ọdịnala Igbo bụ onye e ji 'Anyi Dons' (Onye Ịchaka) maara akọwaala na ọ bụ mgbe ọ gbakere site na nsi e nyere ya mere o ji tipụta egwu ọ kpọrọ "Deputy Jesus".

Anyi Dons kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, sị na ndị mmadụ na-eme ka ha bụ chi na ndụ ya ma na-enwe anya ụfụ na obi ọjọọ n'ebe ọ nọ.

Anyi Dons kọwakwara ọtụtụ ihe banyere ndụ ya nakwa egwu ndị ọ tipụtarala.

Ọ sị na ọ malitere iti egwu mgbe ọ dị obere, na mgbe ahụ ọ na-apị 'piano' n'ụlọụka ebe nna ya bụ ụkọchukwu n'afọ 1998.

Ọ sị na nna ya anabatachaghị egwu ọ na-eti mgbe ahụ maka na o chere na egwu chọrọ ịkpọrọ otu nwa nwoke ya nke mere na ọ chọrọ ịkwụsị ya iti egwu.

Anyi Don sị na ọ ego mbụ ọ natara site n'iti egwu bụ otu narị naịra na iri ise (N150.00) n'afọ 2000.

N'afọ 2002, Anyi Don sị na ọ malitere itinye ọnụ na-ekwere ndị na-eti egwu ukwe n'egwu ha.

Nwamadị a sị na o tiela egwu di iche iche nke gụnyere; Igbo nwere mmadu,Akpagi, Deputy Jesus, Okpata ozuora, Offor nakwa ndị ọzọ.

Kirie ihe o kwuru banyere ndụ ya n'ụju.

Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka Anyi Dons

  • Ezi aha ya bụ Iheanyichukwu Ilodi Donatus mana ihe e ji maara ya bụ Anyi Dons (Onye Ịchaka).
  • Ọ bụ onye Umuduru Aro Agbaja dị n'Ehime Mbano dị n'Imo Steeti mana a mụrụ ya Nnewi bụ ebe ọ nọ too.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na 'New Era Model' dị Nnewi nke Anambra Steeti.
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-agba ihe ọkụ (welder) tupu o were iti egwu mere aka ọrụ.