IPOB Sit At Home enforcer killed: Lee obodo ebe e gburu nwa okorobịa a na-eche na ọ bụ onye IPOB na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ

Ndị obodo ewerela aka tigbuo otu nwa okorobịa na-anaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko n'ihi 'sit-at-home'.
Ọ bụ ndị uweojii Imo steeti kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na mgbede ụbọchị Mọnde.
Dịka ndị uweojii siri kwuo, ya bụ ihe mere n'obodo dị na mpaghara Ahiara, nke dị n'okpuru ọchịchị Ahiazu Mbaise.

Ebe foto si, AFP
Aha nwa okorobịa a lara mmụọ bụ Obinwanne Iwu onye dị afọ iri atọ na anọ.
Ndị uweojii kwuru sị: "Obinwanne Iwu na ndị otu ya wakporo otu ahịa na achụsasị ndị mmadụ pụtara ịzụ ahia, ma na-ezukwa ngwaahịa ndị mmadụ."
"Ka ha na-eme nke a, ha na-eti mkpu na ndị mmadụ ga-asọpụrịrị iwu 'sit-at-home'."
"Mana ndị mmadụ gbakọtara jide Obinwanne, kechie ya aka azụ, ma kụọ ya duka duka."
"Tupu ndị uweojii abịaruo ebe ahụ, nwa okorobịa ahụ anwụọla."
BBC Igbo gara Mbaise, ebe ndị obodo gburu nwaokoroobịa ahụ, gee ihe ndị obodo gwara ha ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ na-abịa.










