Ọgbaaghara adapụtala taata dịka a na-akwatu ahịa New Artisan Enugwu

Artisan Enugu ahía
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọgba aghara adapụtala taata dịka a na-akwatu ahịa New Artisan EnugwuNnukwu Nsogbu dapụtara taata n'etiti ndị Hausa/Fulani na-ere ehi, ewu na atụrụ n'Ahịa New Artisan Enugwu na ndị Uwe ojii.Ya bụ ọgụ malitere n'ụtụtụ tata oge ndị uwe ojii karịrị out nari na ndị nwe ala New Artisan ahụ malitere gbukasiwa ebe ahu ka ha nwee ike iweghara ala ha

Artisan Enugu ahía

Ndị Ugwu ahụ na-ere ehi malitere siwa ọnwụ na ha agaghị apụ dịka ha si eme na mbụ,

Nke a mere ndị uweojii jiri gosi ha ihe ọkụ ji ntị oke eme. Ka ọ dị ugbua ọtụtụ ụgbọala 'Buldozer' na 'caterpiller' na akurikọsi ebe ahụ niile.

Cheta na ndị ahụ sị mgbo ugwu Naijiria biri na ya bụ New Artisan Enugwu ma anụsakarị gọmenti ọgụ ma asị ha pụọ.

Cheta na ọnwa March na April ndị ahụ bi na ahịa New Artisan gbara ụgbọala karịrị asaa ọkụ nke gunyere 'buldozer' na 'caterpillar' abụọ ebe ha na egosi gọmenti Enugwu na ha agaghị apụ ebe ahụ.

Oge BBC rutere na New Artisan Enugwu, akwatusiwala ya bụ ahịa niile ebe ọtụtụ ụmụ okorobịa na atụtụ igwe gbakara agbaka na apụta na mmebi ahụ.

Ihe onyonyo a gosiri ihe BBC hụrụ mgbe anyị gara ebe ahụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Cheta na gọmenti Enugwu agwala ndị ahụ na-ere ehi ka ha gawa na new gariki Enugwu ebe enyere ha ọnọdụ.

Ebe ọtụtụ ndị Fulani na-ere ehi, ewu na atụrụ abụrụla nke akwaturu taata.