Rangers FC Enugwu: gọmenti Enugwu enyela ezi na ụlọ Ifeanyi George nwụrụ anwụ 20m naira

- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Otu egwu bọlụ Rangers nke Enugwu steeti emezuola nkwa ha kwere site na inye ezi na ụlọ Ifeanyi George bụbụ onye egwu bọlụ ha nwụrụ anwụ ọkpụrụkpụ ego 20 m naira.
Ego ahụ bụ nrite ego insurance nke ndụ nwa amadị ahụ nwụrụ n'ihe mberede nke ụgbọala n'ọnwa March afọ a.
Nwanne ya nwoke George Onwụbiko natara ya bụ asambodo cheki n'aha ezinụlọ ha.
Commisioner nke egwuregwu na ndị ntorobia n'Enugwu bụ Manfred Nzekwe bụ onye nyefere ha ya bụ ego na aha Gọvanọ Ifeanyi Igwuanyi.
Onye nchikọta Rangers bụ mazi Davidson owumi buru ụkpọ ekene nye gọmenti Enugwu maka ya omalicha ya bụ atụmatụ insurance ha wepụtara.
Ndị otu egwu bọọlụ Rangers nke Enugwu steeti ekwuputala na ha ga-enye ezinụlọ Ifeanyi George nwụrụ anwụ ego dị nde naira iri abụọ (N20 million) iji tie ha aka n'obi.
Nke a bụ ego adịghị ama ama nke Bekee kpọrọ 'insurance' bụ nke a na-ewepụ n'ụgwọ ọnwa mmadụ kwa ọnwa oge ọ dị ndụ.
Mgbe e kwere ndị be George nkwa ego 20m naira maka iti aka n'obi

Cheta na Davidson Owumi bụ onyeisi Rabgers kwuru na ha ga enyefe ya bụ ego na aka ezinụlọ Ifeanyi George ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julaị.
Ifeanyi George bụ nwa afọ Rangers FC Enugwu nwuru n'ihe mberede okporouzo na ụbọchi iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maachị afọ 2020 oge o si Enugwu na-aga Lagos.

Ebe foto si, Rangers
Cheta na onye nchịkọta ndị Rangers bụ Davison Owumi gwaburu BBC na ndi egwubọọlụ niile aha ha dị n'akwụkwọ ndị 'Nigeria Professional Football League' nwere ezigbo ihe nrite ma ọ bụru na ihe mee ha.
Owumi kwuru na steeti kwunyere ụgwọ n'isi ụmụ Rangers n'ụlọọrụ Premiere Brokers Insurance maka ihe ntụmadị ọbụla rụọ afọ 2021.









