Ifeanyi George: Ọnwụ gburu anapụla Rangers na Naijiria nnukwu 'striker' - Davidson Owunmi

Ifeanyi George na Emmanuel Ogbu

Ebe foto si, Enyimba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi na-elekọta Rangers bụ Davidson Owunmi ji anya mmiri gwa BBC na ọnwụ Ifeanyi George na Emmanuel Ogbu bụ ihe ahụ ọmajijiji nye ndị otu ha.

Ọ kọwara na Ifeanyi, onye nke nọ n'otu bọọlụ nke nnukwu ha kpọrọ 'senior team' na Bekee bụ Emmanuel Ogbu onye nke nọ na 'feeder team' na otu enyi ha nwoke oge ha na-ala Legọs maka ezumike izu ụka abụọ e nyere ha maka egwu Coronavirus.

Ha nwere ya bụ ihe mberede ebe a na-akpọ Benin "bypass" oge ụgbọ ala ahụ Ifeanyi na-anya gbabara n'okpuru nnukwu ugbọala kwụrụ onwe ya, ha atọ nwụnyụrụ anya pii.

Owunmi kwuru na ha na ndị ezinaụlọ nwa amadị ahụ akpaala ka aga esi lie ozu ya, okwukwara na gọmenti Enugwu na akwụchi insurance anya.

Onyenkuzi ndị ụmụaka ndị Rangers, PRO nakwa onyeisi otu ndị nkwado ha kwuru na obi dị ha nwute nke ukwuu na ụmụ aka ha ji eme ọnụ nwụrụ na mberede.

Onye bụ Ifeanyi George nwụrụ anwụ?

Ifeanyi George

Ebe foto si, @rangersint

Nkọwa foto, Ifeanyi George si Enyimba banye Rangers International FC na 2016

Otu onye egwu bọọlụ Rangers International nke Enugwu ji eme onụ bụ Ifeanyi George alaala mụọ n'ụtụtụ Sọnde.

Ifeanyi nwụrụ n'ihe mberede okporo ụzọ ka o si Enugwu aga Legọs.

Dịka akụkọ siri kwuo, ọ bụ ya na mmadụ abụọ ọzọ nọ n'ime ụgbọala oge mberede a mere.

Otu egwuregwu bọọlụ Rangers kwuru n'ihe a mere n'akara Twitter ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọtụtụ ndị ihe ya na amasị na-ezigara ezi na ụlọ ya ozi itiaka n'obi na soshal midia.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Foto ndi mmadu setere n'ebe mberede mere gosiri na ụgbọala ya banyere n'okpuru ụgbọala.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụku na-ekwu na nwaamadị a nọ n'ụzọ ịlaghachị ebe o bi na Legọs dị ka akagburu asọmpị premiership na Naịjirịa oge ihe a mere.

Ifeanyi George na-agbaburu Enyimba nke Aba bọọlụ.

E nwere ihe ruwere ndị egwubọọlụ dịka Ifeanyi?

Onye nchịkọta ndị Rangers FC bụ Davison Owumi kwuru na-agbanyeghị na ha bụ anyammiri n'isi maka ọnwụ Ifeanyi na onye otu ya, na ndi egwubọọlụ niile aha ha dị n'akwụkwọ ndị Nigeria Professional League nwere ezigbo ihe nrite ma ọbụru ma ihe mee ha.

Owumi kwuru na steeti kwunyere ụgwọ n'isi ụmụ Rangers n'ụlọọrụ Premiere Brokers Insurance maka ihe ntụmadị ọbụla rụọ n'afọ 2021.

Akwụkwọ ọdeakwụkwọ otu egwubọọlụ ahụ bụ Emeka Ferdinand Ugwuerua tinyere aka na-egosi na ezi na ụlọ Ifeanyi ga-enweta ọkpụrụkpụ ego dị nde kwuru nde maka ọdachị ahụ dakwasara ha.

Aha onyonyo, Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ

Akụkọ ndị ga-amasị gị