Rangers akpanwughị ike ka ha zutere ndị Kwara United

Ebe foto si, Rangers FC
Otu Rangers nke Enugwu akpaghị ike ka-esi tụọ anya mgbe ha zutere ndị Kwara United n'asọmpi NPFL a gbara ụbọchị ụka.
N'agbanyeghị na a gbara asọmpi a na be ha n'ọgbọ egwuregwu Nnamdi Azikiwe dị n'Enugwu, Rangers enyenwughị goolu ọbụla ka ha na Kwara United na-azọ isi onwe ha zutere ụbọchị ụka.
Rangers na Kwara United ji otu otu pọintị gawa ka egwuregwu ha gwụchara, nke mere ka ha na Akwa United na Yobe Stars ka hara na pọintị iri abụọ na atọ.
Ndị na-akwado ndị Rangers gbakọtara n'ọgbọ egwuregwu ịhụ ma ndị ha na-akwado a ga-emenye ha obi aṅụrị, mana ha emeghị ihe ndị ha tụwara anya.

Ebe foto si, Rangers FC
Onye nchịkọta ndị Kwara United bụ Bala Abubakar, na ndị egwuregwu ya mere ka agụrụ imeri asọmpi a ọ gụrụ ha, mana otu abụghị n'ezi.
Ka agbachara egwuregwu a, Abubakar kwuru "anyị mere ihe anyị kpara gbasara egwuregwu a o wee gaara anyị ọfụma. Eche m na ihe a gbatara ziri ezi n'etiti otu abụọ a, anyị ga-aga n'ihu gbaa mbọ ịhụ na anyị kpọpụtara onwe anyị n'ime ebe ọnọdụ ọpụpụ a (relegation zone) anyị hụrụ onwe anyị."

Ebe foto si, Rangers FC
Onye nchịkọta ndị Rangers bụ Gbenga Ogunbote kwuru "Ihe a bụ ezigbote ndọghachi azụ nye anyị maka na onweghị ihe anyị ji ohere ndị anyị nwetara n'ọkara nke mbụ mee.
Mmehie anyị mere n'ọkara ahụ mere anyị arụ n'ọkara nke abụọ.
N'ezie, anyị ga-agbalị n'egwuregwu ndị ọzọ iji nweghachịte pọịntị ndị anyị tufuru. Anyị na-arịọ ndị na-akwado anyị ka ha nwee nghọta maka pọịntị abụọ a anyị na-enwetaghị"









