Chelsea vs Leicester City: Leicester City anapụla Chelsea iko FA ma bunye ha iko anya mmiri

Ebe foto si, Getty Images
A gbawala m aka bụzi ekpere ndị Chelsea na-ekpe ugbua dịka Leicester ji otu ọkpụ gbajie ha aka ma naara ha iko FA.
Nke a tụrụ Chelsea na ndị nkwado ha n'anya maka na ebumnobi ha bụ imeri asọmpi a.
Leicester nyere goolu ha ji merie na nkeji 63' site n'aka Youri Tielemans.
Chelsea gbara mbọ ịsa goolu ahụ mana obi gbawara ha mgbe ogbu pịpịrọ kagburu goolu sị na ọ bụ 'offside'.
Nke a mere anya mmiri jiri jupụta otu egwuregwu Chelsea na ndị nkwado ha n'anya dịka e gbuchiri bọọlụ na nkeji 90'.
Ụmụafọ Naịjirịa abụọ na-agbara Leicester bọọlụ bụ Kelechi Iheanacho na Wilfred Ndidi gosipụtara obi ụtọ ha na mmeri a.
A na-atụbu anya na Chelsea nwereike ịmabute iko abụọ gụnyere FA na Champions League mana mmeri a akachapụla nke ahụ.
Ugbua ekpere ndị Chelsea ga-abụzi "Agbawala m aka iko n'afọ a" dịka ha ga-ezute Manchester City n'asọmpi ikpeazụ nke Champions League.










